Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ịkwụsị Nsogbu Ahụ

Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ịkwụsị Nsogbu Ahụ

Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ịkwụsị Nsogbu Ahụ

Ọ BỤRỤ na ihe na-eme ugbu a akwụsịghị, n’oge na-adịghị anya ezinụlọ ndị na-enweghị nna ga-abụ ihe onye ọ bụla na-anakwere. Otu akụkọ sitere n’aka Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ Ike na Ijere Ọha Ozi nke United States na-ekwu, sị: “Ụmụaka nanị nne zụrụ na-enwekarị akara mmụta dị ala, na-akpa àgwà ọjọọ karị, na-akakwa enwe nsogbu ahụ ike ma na-aka arịa ọrịa uche na-adịghị ala ala. . . . Ịzụlite nwa n’ezinụlọ nwere nanị nne na-akpata ihe ize ndụ ka ukwuu nke ịnọ n’afọ iri na ụma mụọ nwa, ịkwụsị ịga kọleeji, [na] ịga mkpọrọ.”

Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ndị ndụmọdụ ezinụlọ, ndị ọkà nkụzi, na ọbụna ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji na-achọ nnọọ ụzọ isi kwụsị omume a na-emebi ihe. E nwewo nnọkọ nkwurịta okwu ndị buru ibu maka ndị ikom iji welite ùgwù dị n’ịbụ nna na iji wusie ibu ọrụ ndị ikom nwere n’ezinụlọ ike. Akwụkwọ ndị na-ekwu banyere ịbụ nna ejupụtawo n’ahịa. Ọbụna e mewo mgbalị ịmanye ndị nna iburu ibu ọrụ ha. Na United States, ndị ọkàikpe enyewo “ndị nna na-adịghị enye ụmụ ha nkwado” ntaramahụhụ, e kwutọwo ha n’ihe omume TV, ọbụna bụrụkwa ndị ọha na eze wedara n’ala. Otú ọ dị, mgbalị ndị dị otú ahụ arụpụtaghị ezigbo ihe.

Ihe Ngwọta Ndị E Nwetara Ọkụ Ọkụ

Ihe ngwọta ndị e nwetara ọkụ ọkụ pụkwara ịrụpụta ihe a na-ejighị n’aka. Dị ka ihe atụ, nwanyị a gbara alụkwaghịm pụrụ ịlụgharị di ngwa ngwa, na-eburu n’uche inwetara ụmụ ya nna ọhụrụ. Ma, ọ bụ ezie na ịlụgharị di pụrụ inwe abamuru nke ya, a pụrụ inwe nsogbu na ya. Mgbe ụfọdụ ụmụaka adịghị eji ike anabata onye ọhụrụ dị ka nna ha. Mgbe ụfọdụ ha adịghị anabata ya ma ọlị. Otu nnyocha gosiri na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị inyom ha na nne ma ọ bụ nna nkuchi biri hapụrụ ụlọ tupu ha ruo afọ 19. . . , ma e jiri ya tụnyere 50% nke ndị inyom si n’ezinụlọ nne na nna mụrụ ha so mejupụta.” Ọbụna n’ezinụlọ nkuchi na-aga nke ọma, mgbe ụfọdụ ọtụtụ afọ na-agafe tupu ụmụaka ahụ anabata nna nkuchi ha. *

N’otu aka ahụ, ọ dịghị ihe ngwọta ndị e nwetara ọkụ ọkụ ga-akwụsị nsogbu ntụrụ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma. Dị ka ihe atụ, nsikwopụ afọ ime megidere iwu Chineke, ọ na-achọkwa ka nwa agbọghọ bịanyụọ ọmịiko o nwere n’ahụ nwa na-amalite ndụ n’afọ ya. (Ọpụpụ 20:13; 21:22, 23; Abụ Ọma 139:14-16; tụlee 1 Jọn 3:17.) Olee otú nke ahụ ga-esi ghara inwe mmetụta ọjọọ? Ọtụtụ ndị na-ele ịkpọpụ nwa maka nkuchi anya dị ka ihe ngwọta na-egosi ọmịiko karị, ma ọ pụkwara inwe mmetụta ọjọọ—ma n’ahụ nne ma n’ahụ nwa.

Ee e, ihe ngwọta ndị e nwetara ọkụ ọkụ agaghị agwọta nsogbu nke ezinụlọ ndị na-enweghị nna. A ga-akwụsị ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ugbu a nanị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ dị njikere ime mgbanwe ndị dị ukwuu n’otú ha si eche echiche, n’àgwà ha, n’omume ha. A chọrọ ihe karịrị okwu ire ụtọ na nkà nchepụta na-ewu ewu ma ọ bụrụ na a ga-akpali ndị mmadụ ime oké mgbanwe dị otú ahụ. ‘Ihe ahụ karịrịnụ’ dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. E kwuwerị, ọ bụ Chineke n’onwe ya guzobere ndokwa ezinụlọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ọ maara ihe dị ụmụaka mkpa karịa onye ọ bụla ọzọ.

Ụkpụrụ Bible Na-enyere Ezinụlọ Aka Ịnagide Ihe

Ma Bible ọ̀ pụrụ inyere ụmụaka nna ha gbahapụrụ aka n’ezie? Ihe ó mebichabeghị? Ee e, o mebichabeghị. Ná mmalite isiokwu a, anyị hotara otu akụkọ sitere n’aka gọọmenti United States bụ́ nke depụtara ọtụtụ n’ime ihe ize ndụ ụmụaka ndị a na-eche ihu. Ọ bụ ezie na ọ bụ okwu ịdọ aka ná ntị, akụkọ ahụ kwubiri, sị: “N’agbanyeghị ihe àmà nke ihe ize ndụ ka ukwuu e nwere, nnyocha ahụ na-egosikwa na ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka nọ n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-etolite nke ọma.” Ee, a pụrụ ịkwụsị ihe ndị na-esi n’enweghị nna apụta ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ belata ha. Nke a ga-adị otú ahụ karịsịa ma ọ bụrụ na e tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ịzụ ụmụaka.

Nke a na-achọ ịrụsi ọrụ ike n’aka nne nanị ya na-azụ ụmụ—ihe pụrụ iyi ihe a na-apụghị ime eme na mbụ. Ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ a, ị pụrụ ịmụta ịdabere kpam kpam na Jehova Chineke. (Ilu 3:1, 2) Ndị inyom ụfọdụ bụ́ ndị Kraịst n’oge Bible chere ọnọdụ ndị jọrọ njọ ihu, dị ka ịbụ nwanyị di ya nwụrụ. Banyere ndị dị otú ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Nwanyị nke bụ́ onye di ya nwụrụ n’ezie, nke a hapụkwara nanị ya, ọ tụkwasịwo obi ya na Chineke, na-anọgidekwa n’arịrịọ ya na ekpere ya abalị na ehihie.” (1 Timoti 5:5) Cheta na Jehova na-akpọ onwe ya “nna nke ụmụ mgbei.” (Abụ Ọma 68:5) Ị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-akwado nwanyị na-atụ egwu Chineke ná mbọ ọ na-agba ịzụlite ụmụ ya.

Mmadụ iduziri ụmụ ya ọmụmụ Bible ebe obibi mgbe nile bụ ụzọ dị mkpa isi nyere ha aka itolite ma bụrụ ndị okenye nwere echiche ziri ezi, ndị tozuru okè. (Deuterọnọmi 6:6-9) N’etiti Ndịàmà Jehova ọtụtụ ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ na-eji akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị e dere maka ndị na-eto eto, dị ka Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè eduziri ụmụ ha ihe. * Ihe ọmụma dị n’ime ya na-enyere ndị na-eto eto aka ịzụlite ụkpụrụ omume ọma ndị pụrụ inyere ha aka izere ihie ụzọ nke ndị mụrụ ha. Ka ụmụaka na-amata Jehova Chineke, ha pụrụ ịmalite ịghọta na ha nwere Nna nke eluigwe na-echebara ha echiche n’ụzọ miri emi. (Abụ Ọma 27:10) Nke a pụrụ ime ka ha nagide mmetụta nke ịbụ ndị a gbahapụrụ. Otu nwa agbọghọ onye Britain bụ́ onye hụrụ mgbasa nke nne na nna ya na-echeta, sị: “N’oge nile ahụ, mama m kụnyere n’ime m ịdị mkpa nke ekpere na ịdabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ. Nke ahụ nyeere anyị aka ịnagide ọnọdụ ahụ.”

Ime Ka Nkekọ Nna na Nwa Dịgide

Bible na-eme ka o doo anya na nwatakịrị aghaghị ịsọpụrụ ma nne ya ma nna ya. (Ọpụpụ 20:12) Ịgba alụkwaghịm adịghị atọsa nkekọ nna na nwa. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na di nwanyị lụburu ebikwaghị n’ụlọ ya, ụmụ ha ka pụkwara irite uru site n’isoro di ya ahụ na-enwe mmekọrịta dị mma. * Nke bụ nsogbu bụ na nne ahụ pụrụ ịdị na-ewesa ya iwe ma na-enwe mwute maka mkpakọrịta ya na ụmụ ya. Olee otú onye bụ́ nne pụrụ isi nagide mmetụta ndị a?

Bible na-enye ezi ndụmọdụ mgbe ọ na-adụ ọdụ, sị: “Lezie anya ka ọnụma ghara ịrafu gị [ime ihe] n’obi ilu . . . Lezie anya, echela ajọ ihe ihu.” (Job 36:18-21) N’eziokwu, ọ naghị adị mfe ikwu okwu ọma banyere onye mejọrọ ma ọ bụ gbahapụ gị. Ma jụọ onwe gị, sị: ‘Nwa agbọghọ ọ̀ ga-amụta ịtụkwasị nwoke obi ma a na-agwa ya mgbe nile ókè nna ya jọruru ná njọ? Nwa okoro ọ̀ pụrụ ịzụlite àgwà nwoke dị mma ma ọ bụrụ na a na-enye ya ahụhụ site n’ịgwa ya, “Ị dị nnọọ ka nna gị”? Ụmụaka hà pụrụ inwe echiche ziri ezi banyere ịbụisi ma ọ bụrụ na a na-akụziri ha ilelị nna ha ma ọ bụ na-agwa ha ka ha ghara ịhụdị ya anya?’ N’ụzọ doro anya, ịkpaghasị mmekọrịta ụmụ gị na nna ha na-emebi ihe.

Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịmata na Bible akatọghị iwe ziri ezi. “Unu emehiela” ka Bible na-ekwu, “mgbe unu na-ewe iwe.” (Ndị Efesọs 4:26) Ihe dị njọ abụghị iwe iwe kama ọ bụ ịbụ onye “iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwulu,” na-achịkwa. (Ndị Kọlọsi 3:8) N’ihi ya, zere ịnọ n’ihu ụmụ gị ‘na-ekwulu nna’ ha. Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ikwupụta iwe gị, gbasoo aro Bible tụrụ ka ị kọọrọ onye ọzọ na-abụghị ụmụ gị “nchegbu” gị—ikekwe enyi ị tụkwasịrị obi. (Ilu 12:25) Gbalịa ịnọgide na-akpa àgwà ziri ezi ma zere ịdị na-echegbu onwe gị banyere ihe gara aga. (Eklisiastis 7:10) Ime otú ahụ pụrụ nnọọ inye aka mee ka iwe gị dajụlata.

N’ikpeazụ cheta na Bible nyere nwatakịrị iwu ka ọ kwanyere nna ya ùgwù—ọbụna ma ọ bụrụ na nna ya na-eme omume na-adịchaghị mma. (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ya mere gbalịa inyere ụmụ gị aka ile adịghị ike nke nna ha anya n’ụzọ ziri ezi. Otu nwa agbọghọ tolitere n’ezinụlọ gbasara agbasa na-ekwu, sị: “Site n’ile nna m anya n’ụzọ ziri ezi—dị ka mmadụ na-ezughị okè nke pụrụ imehie emehie—mụ na ya emesịwo kpezie.” Site n’ịgba ụmụ gị ume ka ha na-akwanyere nna ha ùgwù, ị na-enyere ha aka inwe echiche ziri ezi banyere ịbụisi gị dị ka nne!

Ọ dịkwa mkpa ka ị ghara ịkpata mgbagwoju anya n’ọdịiche dị n’etiti ọrụ gị na nke ụmụ gị. Ha ka nọ n’okpuru ‘iwu nne ha.’ (Ilu 1:8) Ọrụ pụrụ ịnyịgbu ụmuaka ndị nwoke ma ọ bụrụ na a na-atụ anya ka ha bụrụ ‘nwoke nwe ụlọ.’ N’otu aka ahụ, ụmụaka ndị nwanyị pụrụ ịbụ ndị e boro ibu dị arọ n’ihi ịbụ ndị nne ha na-akọrọ ihe nzuzo. E kwesịrị imesi ụmụaka obi ike na gị bụ́ nne ha ga-elekọta ha—ọ bụghị ha ilekọta gị. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 12:14.) Mmesi obi ike dị otú ahụ pụrụ ime ka ha nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe, ọ bụ ezie na ọnọdụ ezinụlọ ha adịghị otú o kwesịrị.

Ndị E Ji Mere Nna

Gịnị ma ọ bụrụ na nna ahụ abụghị akụkụ nke ezinụlọ? Ndị ọkachamara na-ekwu na ụmụaka pụrụ irite uru site n’inwe nwoke ha na ya na-akpakọrịta. Ọ bụ ezie na mmasị nwanne papa nke nwoke ma ọ bụ onye agbata obi na-egosi n’ebe nwatakịrị nọ pụrụ ịbatụ uru, ọ ga-erite uru karịsịa ná mkpakọrịta dị mma nke dị n’ọgbakọ ndị Kraịst. Jisọs kwere nkwa na ọgbakọ ga-adị ka ezinụlọ na-enye nkwado.—Mak 10:29, 30.

N’oge Bible, nwa okoro bụ́ Timoti tolitere ịbụ onye Chineke pụrụ iche, n’enwetaghị nkwado nke nna kwere ekwe. Bible kasị too nne na nne ya ochie na-ahụ n’anya maka nke a. (Ọrụ 16:1; 2 Timoti 1:1-5) Otú ọ dị, o ritekwara uru ná mkpakọrịta ya na otu nwoke bụ́ onye Kraịst—Pọl onyeozi. Pọl kpọrọ Timoti “nwa m n’ime Onyenwe anyị, bụrụkwa onye m hụrụ n’anya, onye kwesịrị ntụkwasị obi.” (1 Ndị Kọrint 4:17) N’otu aka ahụ taa, a na-agba Ndịàmà Jehova ume ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible na-enye ha “ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ.” (Jemes 1:27) A na-agba ha ume ‘ịnapụta nwa mgbei’ site n’iji obi eziokwu nwee mmasị ziri ezi n’ebe ndị dị otú ahụ nọ. (Job 29:12) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Annette na-echeta mmasị kwesịrị ekwesị nke otu onye Kraịst bụ́ okenye nwere n’ebe ọ nọ mgbe ọ dị obere, na-ekwu, sị: “Ọ bụ nanị ya bụ ezi onye m jitụrụla mere nna.”

Ịkwụsị Nsogbu Ahụ

Ụkpụrụ ndị a pụrụ inyere ụmụaka na-enweghị nna aka inwe ihe ịga nke ọma. N’agbanyeghị na oge nwata ha adịchaghị mma, ha pụrụ ịghọ ndị toworo eto nwere echiche ziri ezi, bara uru nakwa ndị nne na nna na-ahụ n’anya, na-ekwesị ntụkwasị obi, ma na-elekọta ibu ọrụ ha. Ka o sina dị, mgbochi ọrịa ka nnọọ ọgwụgwọ ọ bụla mma. Meekwa elu mee ala, a pụrụ ịgwọta nsogbu nke ezinụlọ ndị na-enweghị nna nanị mgbe ndị ikom na ndị inyom weere ya dị ka ibu ọrụ ha itinye ihe Bible kwuru n’ọrụ ná ndụ ha—dị ka ihe atụ, site n’ịrapagidesi ike n’iwu Bible megide inwe mmekọahụ tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye na site n’ịgbaso ụkpụrụ ndị Bible setịpụụrụ ndị bụ́ di na nwunye.—1 Ndị Kọrint 6:9; Ndị Efesọs 5:21-33.

N’ụbọchị ndị a, ọtụtụ ụmụaka nwere nna n’ụlọ ma ka bụrụ ndị a pụrụ ịkpọ ndị na-enweghị nna. Otu ọkachamara n’ihe banyere ezinụlọ na-ekwu, sị: “Nsogbu kasị ukwuu na-eche . . . ụmụaka ihu taa bụ nne na nna ha ewepụtaghị oge soro ha nọrọ ma lebara ha anya.” Okwu Chineke na-ekwu banyere nke a hoo haa. Ọ na-enye ndị bụ́ nna iwu banyere ụmụ ha, sị: “Na-enye ha ntụziaka, na-agbazikwa ha olu, bụ́ ụzọ e si azụlite mmadụ dị ka onye Kraịst.” (Ndị Efesọs 6:4, New English Bible; Ilu 24:27) Mgbe ndị bụ́ nna gbasoro ndụmọdụ Bible, ụmụaka adịghị atụ egwu ịbụ ndị a ga-agbahapụ.

Otú ọ dị, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikweta na ọtụtụ ndị mmadụ ga-echigharịkwuru Bible? Ọ dịghị ma ọlị. (Matiu 7:14) Ma Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka inweta ọṅụ ná ndụ ezinụlọ ha site n’usoro ọmụmụ Bible ebe obibi. * Otú ọ dị, Bible na-adọ aka ná ntị na ndị di na nwunye nile ga-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ ha” n’ihi ezughị okè. (1 Ndị Kọrint 7:28) Ma ndị na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù n’ezie na-achọ ụzọ isi dozie nsogbu ha, ọ bụghị ịgba alụkwaghịm ozugbo a hụrụ nsogbu. N’eziokwu, e nwere oge mgbe ọ pụrụ ikwesị ekwesị ka onye Kraịst chọọ nkewa ma ọ bụ ọbụna ịgba alụkwaghịm. (Matiu 5:32) Otú ọ dị, n’ịbụ onye maara mmetụta nke a pụrụ inwe n’ahụ ụmụ ya ga-akpali onye Kraịst ịchọ ụzọ isi chebe alụmdi na nwunye ahụ ma ọ bụrụ nnọọ na ọ ga-ekwe mee.

Ime ihe Bible kwuru ga-eme ihe karịrị ichebe ezinụlọ gị ugbu a. Ọ pụrụ ime ka o kwe unu nile mee ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi! Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ịgụ na itinye ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke n’ọrụ bụ otu n’ime ụzọ ndị ị ga-esi hụ na ezinụlọ gị dịgidere n’otu ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 E bipụtara ihe ọmụma ga-enyere ndị nne na nna nkuchi aka ná mbipụta nke March 1, 1999, nke magazin a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Ụlọ Nche.

^ par. 11 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 13 Nke a emetụtaghị mgbe nwatakịrị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye nna ya ga-etiru ahụ ma ọ bụ metọọ n’ụzọ mmekọahụ.

^ par. 24 Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ (nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara) nwere ọtụtụ ndụmọdụ dabeere na Bible pụrụ inyere ezinụlọ aka. Ị pụrụ inweta ya site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova n’ógbè gị.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible, nne nke nanị ya na-azụ ụmụ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị ikom bụ́ ndị Kraịst pụrụ ‘ịnapụta nwa mgbei’ ọtụtụ mgbe site n’igosi ya ezi mmasị sitere n’obi eziokwu