Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ihe E Ji Mara Oge A

Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ihe E Ji Mara Oge A

Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ihe E Ji Mara Oge A

OLEE ihe ị ga-asị na ọ bụ nsogbu kasị dị ịrịba ama ọha mmadụ nwere n’oge a? Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 80 nke ndị a jụrụ ajụjụ n’otu njụta echiche pụrụ iche nke United States, kweere na ọ bụ “enweghị nna n’ụlọ.” Dị ka njụta echiche ahụ na-egosi, ihe karịrị nde ụmụaka 27 na United States na nna mụrụ ha ebighị, ọnụ ọgụgụ ahụ na-arịkwa elu n’ike n’ike. Otu akụkọ nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu nyere, na-ekwu na ihe dị ka pasent 50 nke ụmụ ndị ọcha a mụrụ na United States kemgbe afọ 1980 “ga-anọtụ n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna n’oge ha bụ nwata. N’ihe banyere ụmụ ndị isi ojii, ọnụ ọgụgụ ahụ bụ ihe dị ka 80%.” N’ihi ya, akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today kpọrọ United States “mba kasị nwee ezinụlọ ndị na-enweghị nna n’ụwa.”

Ka o sina dị, otu isiokwu dị na The Atlantic Monthly na-ekwu, sị: “Ọ bụghị nanị n’America ka e nwere mmụba nke mkpaghasị ezinụlọ. A na-ahụ ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba nile mepere emepe, gụnyere Japan.” Ọ bụkwa ezie na ọ na-esi ike inweta ngụkọ ọnụ ọgụgụ, ọtụtụ mba na-emepe emepe yiri ka hà na-eche nsogbu yiri nke ahụ ihu. Dị ka magazin bụ́ World Watch si kwuo, “ndị ikom [nọ ná mba ndị dara ogbenye] na-agbahapụkarị nwunye na ụmụ ha n’ihi nsogbu akụ̀ na ụba na-arị elu.” N’ezie, nnyocha e mere n’otu mba Caribbean kpughere na ọ bụ nanị pasent 22 nke ndị nna nwere ụmụaka dị afọ 8 so ụmụ ha biri n’ezie.

A na-ahụkarị ụmụaka na-enweghị nna ọbụna n’oge Bible. (Deuterọnọmi 27:19; Abụ Ọma 94:6) Otú ọ dị, laa azụ n’oge ahụ, ihe bụ́ isi na-eme ụmụaka ji aghọ ndị na-enweghị nna bụ ọnwụ nna. “Taa,” ka David Blankenhorn na-ede akwụkwọ na-ekwu, “ihe bụ́ isi na-akpata enweghị nna bụ mgbahapụ nke nna.” N’ezie, dị ka anyị ga-ahụ, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụaka na-enweghị nna na-agba akaebe na ọtụtụ ndị taa bụ ndị “ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ.” Dị ka Bible si kwuo, nke a bụ kpọmkwem ihe ọzọ na-egosi na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ.”—2 Timoti 3:1-3.

Otú ọ dị, nye ụmụaka na-eto eto, enwekwaghị nna na-abụrụ ha ọdachi. Ọ na-akpata ihe mgbu na mkpaghasị uche nke pụrụ inwe mmetụta na-adịte aka. N’ihi ya, n’usoro isiokwu a, anyị ga-atụle nsogbu a, ọ bụghị iji mee ka obi fuo ndị na-agụ ya, kama ọ bụ iji nye ihe ọmụma nke pụrụ inyere ezinụlọ aka ịkwụsị omume a na-ebibi ihe.