Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘O Nyeere M Aka Inyocha Ndụ M’

‘O Nyeere M Aka Inyocha Ndụ M’

‘O Nyeere M Aka Inyocha Ndụ M’

NKE ahụ bụ ihe otu nwata nwanyị dị afọ 18 aha ya bụ Maria, nke sitere n’obodo Cherepovets, kwuru banyere akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. O degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị nso na St. Petersburg, Russia, dị ihe dị ka kilomita 400 site na Cherepovets, ihe na-esonụ.

“Akwụkwọ a enyeworo m aka inyocha onwe m, ihe mgbaru ọsọ m, na ndị nọ m gburugburu. Achọtara m azịza nye ajụjụ ndị kasị echegbu m. Ka m nọ na-agụ akwụkwọ ahụ, anya mmiri nke obi ụtọ rudara m n’ihu.”

Maria kwukwara, sị: “O yiri ka e wepụrụ ihe kpuchiri m anya, anya m wee saghee n’ihi obi ụtọ. Nke a bụ akwụkwọ kasị mma m gụtụrụla ná ndụ m nile. Ọ dịghị ọzọ a ga-eji tụnyere ya, ebe ọ bụ na ọ dabeere na Bible, ndụmọdụ sikwa n’aka Jehova Chineke bụ nke kasị mma.”

Ọ bụrụ na ị ga-achọkwa irite uru site n’ihe ọmụma dị n’Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, ị pụrụ inweta otu site n’idejupụta mpempe akwụkwọ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na magazin a ma ziga ya n’adres e gosiri ná mpempe akwụkwọ ahụ ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 nke magazin a.

□ Biko ziterenụ m akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. Kwuo asụsụ nke ọ bụ.

□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.