Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya Kwagidere M Ịnagide Ule Dị Iche Iche

Olileanya Kwagidere M Ịnagide Ule Dị Iche Iche

Olileanya Kwagidere M Ịnagide Ule Dị Iche Iche

DỊ KA MICHIKO OGAWA SI KỌỌ

N’April 29, 1969, ndị uwe ojii kpọrọ m oku. Di m, bụ́ Seikichi, enwewo mmerụ ahụ n’ihe ọghọm ụgbọala ma nọrọ n’ụlọ ọgwụ. Ahapụụrụ m otu enyi m nwanyị ụmụ m ndị nwoke abụọ wee gbara gawa n’ebe ahụ. Kemgbe ahụ Seikichi enwewo ahụ mkpọnwụ, ọ matabeghịkwa onwe ya. Ka m kọọrọ gị banyere ezinụlọ anyị na otú anyị siworo nagide ihe ndị merenụ.

A MỤRỤ m na February 1940 na Sanda, nke dịdewere Kobe, Japan. Mụ na Seikichi amawo onwe anyị kemgbe anyị gakọrọ ụlọ akwụkwọ ọta akara. Anyị lụrụ na February 16, 1964. Di m adịghị ekwu ọtụtụ okwu, ma o nwere mmasị n’ebe ụmuaka nọ. Ka oge na-aga, anyị mụrụ ụmụ nwoke abụọ, bụ́ Ryusuke na Kohei.

Seikichi na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-ewu ihe owuwu na Tokyo, ya mere mgbe anyị lụsịrị anyị biri n’otu n’ime obodo nta ndị dị ya nso. N’October 1976, otu nwa agbọghọ nke kọwara onwe ya dị ka onye nkụzi Bible bịara leta m. “Ee e i meela. Enwere m Bible nke m,” ka m sịrị.

“M̀ pụrụ ịhụ Bible ahụ?” ka ọ jụrụ.

Ewepụtara m Bible ahụ site n’elu shelf anyị—ọ bụ Seikichi nwe ya—gosi ya. O gosiri m aha ahụ bụ́ Jehova n’ime ya. Amabughị m na nke a bụ aha Chineke. Mgbe ọ hụrụ ụmụ m abụọ, nwanyị ahụ gụụrụ m site na Bible, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) Anọwo m na-eche n’ezie otú m pụrụ isi zụlite ụmụ m nke ọma. Ya mere ozugbo ahụ achọrọ m ịmụ Bible.

Akpọbatara m nwanyị ahụ n’ime ụlọ, anyị wee malite ikwurịta okwu site n’akwụkwọ nta bụ́ “Le! Anameme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhu.” Echere m, sị, ‘Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na anyị pụrụ inwe ndụ obi ụtọ dị ka ezinụlọ!’ Mgbe Seikichi lọtara, asịrị m ya: “Achọrọ m ịmụ Bible.”

“Nke m, ịgụ oké akwụkwọ adịghị gị mkpa,” ka ọ sịrị m. “Aga m enyere gị aka n’ihe ọ bụla ị chọrọ ịmara.” Otú o sina dị, amalitere m iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible kwa izu, malitekwa ije nzukọ ha n’oge na-adịghị anya.

Mmalite nke Ule Anyị Di Iche Iche

Mgbe m rutere n’ụlọ ọgwụ n’abalị April 1969 ahụ m kpọturu uche na ya n’elu, akụjara m mgbe m nụrụ na enyi Seikichi, bụ́ di nwanyị ahụ m hapụụrụ ụmụ m, nọkwa n’ime tagzi ahụ mgbe ihe ọghọm ahụ mere. Enyi di m nwụrụ ka otu izu gasịrị.

N’abalị ahụ, ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ gwara m ka m kpọtụrụ onye ọ bụla m chere kwesịrị ịhụ Seikichi, ebe ọ bụ na a tụghị anya na ọ ga-adị ndụ. Okpokoro isi ya nwere ebe ọ gbawara n’ala ala ya, nweekwa mmerụ ahụ n’uru ahụ ya. N’echi ya, ndị ikwu anyị si n’ógbè Kobe gbatazuo n’ụlọ ọgwụ ahụ.

N’egbughị oge a mara ọkwa site n’ígwè okwu ụlọ ọgwụ ahụ sị: “Ndị ikwu Seikichi Ogawa nile, biko gaanụ leta ya ozugbo.” Anyi ji ọsọ gaa ná ngalaba a na-enye nlekọta kpụ ọkụ n’ọnụ wee sị ya nọdụ nke ọma, onye kwuchaa ibe ya ekwuo. Otú ọ dị, ọnọdụ ya nke dị oké njọ dịruru otu ọnwa zuru ezu. Nnyocha ikpeazụ e mere gosiri na ọnọdụ a ga-adịte aka.

Ya mere, e ji ụgboala e ji ebu ndị ahụ na-adịghị buru Seikichi site na Tokyo gaa Kobe, ihe dị ka kilomita 650. Anọ m hụ mgbe ọ gawara, m wee soro ụgbọ okporo ígwè na-agba ngwa ngwa, lawa, na-ekpe ekpere ka ọ ghara ịnwụ. Mgbe e mesịrị n’uhuruchi, mgbe m hụrụ na ọ dị ndụ n’ụlọ ọgwụ dị na Kobe, obi jupụtara m n’aṅurị. N’olu dị ala, asịrị m ya, ‘Nke m, ị ka di ndụ!’

Ibinyere Ndị Mụrụ M

Akpọọrọ m ụmụ m laghachị n’ụlọ ndị mụrụ m na Sanda, ebe ụmụaka ahụ malitere ịga ụlọ akwụkwọ ọta akara. Azụtara m tiketi oge ya na-agafe agafe maka ụgbọ okporo ígwè wee gaa Kobe, nke dị ihe dị ka kilomita 40 site n’ebe anyị bi, mụ na nne di m gakwara n’ụlọ ọgwụ kwa ụbọchị onye gapụ ibe ya agaa ruo otu afọ. M ga na-eche, sị ‘Seikichi ọ̀ ga-amata onwe ya taa? Gịnị bụ ihe mbụ ọ ga-agwa m? Gịnị ka m ga-aza ya?’ M ga na-echekwa, karịsịa mgbe m hụrụ ezinụlọ nwere obi ụtọ, sị, ‘A si nnọọ na ahụ dị Seikichi, mgbe ahụ ụmụ anyị gaara enwe oge obi ụtọ.’ Anya mmiri na-eruju m anya.

N’oge gboo ahụ, mgbe m gụtara n’ime akwụkwọ akụkọ na e nwewo onye matara onwe ya mgbe ọtụtụ ọnwa nke amaghị onwe ya gasịrị, m na-eche na Seikichi pụrụ iteta. N’ihi ya agwara m nwanne di m n’otu oge, sị: “Achọrọ m ịkpọga ya n’ụlọ ọgwụ dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Honshu.” Ma ọ gwara m na o nweghị ngwọta, o nyekwara m ndụmọdụ ka m jiri ego ọ bụla anyị nwere mee ihe maka ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ anyị.

Otu onye Kraịst bụ́ okenye n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere na Kobe bi nso n’ụlọ ọgwụ ahụ, m na-akwụsịkwa n’ụlọ ya tupu m gawa ileta Seikichi. Nwunye ya na-eduziri m ọmụmụ Bible otu ugbo n’izu. Ụmụ ha abụọ na-abịakwa n’ọnụ ụlọ anyị n’ụlọ ọgwụ iweta kaseti a na-ege ege nke nzukọ ọgbakọ ha. Ezinụlọ a gbara m ume ma nye m nkasi obi dị ukwuu.

Olileanya Kwagidere M

Otu ụbọchị, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova letara anyị n’ụlọ ọgwụ ma gụọrọ m Ndị Rom 8:18-25. Ná nkenke, ọ sịrị: “N’ihi na ana m agụ na ahụhụ nile nke oge dị ugbu a ekwesịghị ka e kwute ha ma e lee ebube ahụ anya, bụ́ nke a gaje ikpughe n’ebe anyi nọ. . . . N’ihi anyị matara na ihe e kere eke nile na-asụkọ udè, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a. . . . Ihe mmadụ na-ahụ anya, gịnị mere o ji na-ele anya ya? Ma ọ bụrụ na anyị na-ele anya ihe anyị na-ahụghị anya, anyị ji ntachị obi na-echesi ya ike.”

Ikwurịta olileanya ndị Kraịst anyị chetaara m na ahụhụ ndị dị ugbu a dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere oṅụ nke Jisọs na-ekwe nkwa ya —ndụ n’ime Paradaịs elu ala na-abianụ. (Luk 23:43) Nkwurịta okwu ahụ nyeere m aka iji olileanya nagide ọnọdụ ndị dị ugbu a na ilekwasị anya ná ngọzi ndị e ji n’aka nke ụwa ọhụrụ ahụ ga-eweta n’ọdịnihu.—2 Ndị Kọrint 4:17, 18; Mkpughe 21:3, 4.

Na June 1970, e bufere Seikichi n’ụlọ ọgwụ dị na Sanda, bụ́ ebe mụ na ndị mụrụ m bi. Na January afọ na-eso ya, mgbe m natara akwụkwọ onye ọkàiwu anyị tinyere nke kwuru na di m apụghị ime ihe ọ bụla n’ihi ihe ọghọm ahụ, o wutere m nke ukwuu nke na m bere ákwá. Nne di m gwara m ọtụtụ mgbe, sị: “Michiko, ahụhụ ị na-atara nwa m nwoke na-ewute m.” Ọ na-asịkwa: “Ọ dị m ka ya bụrụ na m pụrụ iji onwe m gbanwere Seikichi.” Anyị na-akwakọkwa ákwá ọnụ.

Nna m ga-agba m ume ịchọta ọrụ oge nile, ma ekpebisiri m ike ilekọta Seikichi. N’agbanyeghị na ọ machaghị onwe ya, okpomọkụ na-eme ya, oyi na-atụkwa ya, otú e si elekọta ya na-emetụtakwa ya. Nna m chọrọ ka m lụgharịa di, ma m chọpụtara na ime otú ahụ ekwesighị ekwesị, ebe ọ bụ na di m ka nọ ndụ. (Ndị Rom 7:2) Mgbe nke a gasịrị, mgbe ọ bụla nna m ṅụrụ mmanya ọ ga-asị: “Mgbe m ga-anwụ m ga-akpọrọ Seikichi.”

Ọ bụụrụ m ihe oké ọṅụ mgbe e hiwere otu ọgbakọ na Sanda na 1971. Mgbe ahụ, na July 28, 1973, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri. Nke a bụ mgbe e nwere mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova n’Osaka Expo Grounds.

Ka e mesịrị na 1973, nwa m nwoke bụ́ Kohei butere ọrịa akụrụ ọzịza nke dị oké njọ ma nọọ ọnwa ise n’ụlọ ọgwụ. Nna m nọkwa n’ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa ụkwara nta. Ya mere na January 1, 1974, eletara m nna m, di m na nwa m nwoke n’ụlọ ọgwụ atọ dị iche iche. N’ụbọchị Sunday mgbe mụ na nwa m nke okenye bụ́ Ryusuke, na-aga eleta Kohei, mụ na ha na-amụ akwụkwọ bụ́ Ige Onye-Ozizi Ukwu Ahu Nti. Mgbe nke ahụ gasịrị, mụ na Ryusuke ga-eje nzukọ na Kobe ma laghachi n’ụlọ n’obi aṅụrị.

Anọwo m mgbe nile na-enwe ekele maka ndị nyere aka lekọta Seikichi. Ekpebisiri m ike iso ha kerịta ihe ọmụma Bible. Mgbe ọkụ gbagburu nwanne nwanyị nke otu onye so na-elekọta ya, ọ ṅara ntị mgbe m gosiri ya olileanya dị ebube nke mbilite n’ọnwụ ahụ e kwere nkwa ya n’ime Bible. (Job 14:13-15; Jọn 5:28, 29) A maliteere ya ọmụmụ Bible n’ụlọ ọgwụ, o mesịkwara mee baptism n’otu mgbakọ e nwere na 1978.

Ụmụ M, Isi Iyi nke Ọṅụ

Ịzụlite ụmụ m n’enweghị enyemaka nke di m abụwo ihe ịma aka, ma lee ihe na-akwụghachị ụgwọ ọrụ ọ bụworo! Akụziiri m ha àgwà ziri ezi na ichebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche. Mgbe Ryusuke dị nanị afọ atọ, ọ na-arịọ mgbaghara mgbe o mejọrọ, na-asị: “Mama, o wutere m.” Kohei dịtụ isi ike, ọ na-ewe iwe mgbe ụfọdụ ma m chọọ ịgbazi ya. Otu mgbe ọ tụrụ onwe ya n’ala na-ebe ákwá n’ihu otu ụlọ ahia mgbe ọ dị ihe ọ chọrọ. Ma m ga-eso ya kwurịta ya, na-egosi mmetụta ịhụnanya na ndidi. Ka oge na-aga ọ ghọrọ ezigbo nwa na-erube isi. Nke a nyere aka ime ka m kweta na Bible bụ Okwu Chineke n’ezie.—2 Timoti 3:15-17.

Mgbe Ryusuke banyere ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ kọwaara ndị nkụzi ihe mere na ọ pụghị ikere òkè n’ọzụzụ egwuregwu ọgụ aka na ụkwụ. (Aịsaịa 2:4) Otu ụbọchị, o si ụlọ akwụkwọ lọta ma nwee ọṅụ dị ukwuu n’ihi na ná nzukọ ya na ọtụtụ ndị nkuzi nwere, o nwere ike ịza ajụjụ ha dị iche iche.

Inwe mkpakọrịta na-ewuli elu n’ọgbakọ nyeere ụmụ m aka nke ukwuu. Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-akpọ ha òkù mgbe mgbe maka nri abalị ma na-akpọ ha n’ọmụmu Bible ezinụlọ ha nakwa n’ihe omume ntụrụndụ ha. E nwekwara ohere maka mkpakọrịta obi ụtọ, gụnyere ikere òkè n’egwuregwu dị iche iche. Ryusuke gosiri nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site na baptism ime mmiri na 1979, e mekwara Kohei baptism n’afọ sọchiri ya.

Ozi Oge Nile Anyị

Otu mgbe n’oge nleta onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, agwara m ya na achọrọ m ịbụ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. N’ihi na ọnọdụ m n’oge ahụ gaara eme ka mụ iwere nzọụkwụ ahụ yie ihe nzuzu, o ji obiọma chetara m mkpa ọ dị ịzụlite ụmụ m ka ha kwụsie ike n’eziokwu Bible. “Ihe dị mkpa,” ka ọ sịrị, “bụ inwe mmụọ ịsụ ụzọ.” Ya mere, arụrụ m ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, na-esoro ụmụ m na-ekere òkè n’ọrụ a n’oge ezumike ụlọ akwụkwọ ha. Ọrụ a nyeere m aka nke ukwuu ịnọgide na-enwe ọṅụ na udo nke uche ka m na-elekọta Seikichi.

N’ikpeazụ, na September 1979, esonyere m ná ndị ọsụ ụzọ oge nile. Na May 1984, ihe dị ka otu afọ ọ gasịrị kọleeji, Ryusuke debanyekwara aha ya dị ka onye ọsụ ụzọ. Kohei sonyeere ya n’ọrụ ịsụ ụzọ na September 1984. N’ụzọ dị otú a, anyị atọ anụwo ụtọ nke ụdị ozi oge nile a. Ka m na-eleghachi anya azụ n’afọ 20 nke ịsụ ụzọ, bụ́ oge m nweworo ihe ùgwù nke inyere ọtụtụ mmadụ aka ijere Jehova ozi, m na-eche na ọrụ a enyewo aka ịkwagide m n’ule m dị iche iche.

Ryusuke nyere onwe ya n’afọ ofufo maka ọrụ ihe owuwu n’otu ụlọ nke Ndịàmà Jehova ga-eji eme ihe nke dịdebere Ụlọ Mgbakọ Kansai. Mgbe e mesịrị o jere ozi ruo afọ asaa dị ka onye nlekọta nke Ụlọ Mgbakọ Hyogo. Ugbu a, dị ka onye Kraist bụ́ okenye n’ọgbakọ dị nso na Kobe, ọ na-elekọta m. Kemgbe 1985, Kohei anọwo na-eje ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Ebina.

Ọtụtụ Ngọzi Kwagidere M

Ruo ọtụtụ afọ ana m eje n’ụlọ ọgwụ ọtụtụ ugboro kwa izu ịga leta Seikichi na ịsa ya ahụ. Ana m enye ya nlekọta tụkwasị na nke onye na-elekọta ya oge nile na-enye ya. Na September 1996, mgbe ọ nọsịrị afọ 27 n’ụlọ ọgwụ dị iche iche, Seikichi lọtara ibi n’ụlọ anyị, site n’enyemaka nke onye na-elekọta ya. Ọ na-enwe ike iri nri dị mmiri mmiri site n’oghere e tinyere n’imi ya. Ọ bụ ezie na anya ya ka mechiri emechi, ọ na-emeghachitụ omume mgbe anyị gwara ya okwu. Ọ na-ewute m ịhụ Seikichi n’ọnọdụ a, ma olileanya dị ebube maka ọdịnihu na-akwagide m.

Kpọkwem tupu Seikichi alọta, enyere m otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ya ebe obibi, n’ihi ya kwa n’otu afọ, anyị mmadụ ise bikọtara ọnụ ná ntakịrị ụlọ anyị. Echetụghị m n’echiche na mụ na Seikichi ga-enwe ike ibikwa ọzọ, ana m ekele Jehova maka nke a. Ruo ọtụtụ afọ enwere m ọchịchọ siri ike ka Seikichi mepee anya ya, ma ugbu a nanị ihe m na-achọ bụ ka uche Jehova mee.

Apụrụ m ikwu n’eziokwu, sị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) N’agbanyeghị na ndụ obi ụtọ nke mụ na Seikichi mgbe ahụ siri ya ike adịteghị aka, e jiwo ụmụ abụọ ndị ‘chetaworo onye kere anyị’ gọzie m. Enwere m ekele dị ukwuu maka nke a!—Eklisiastis 12:1.

Ka ọ dịgodị, ọ ga-amasị m ma ịnọgide na-asụ ụzọ—si otú a na-enyere ndị ọzọ aka ịchọta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—ma ilekọta Seikichi n’ịhụnanya n’otu oge ahụ. (1 Timoti 6:19) Ahụmahụ m akụziworo m ịbụ eziokwu nke okwu onye ọbụ abụ ahụ: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na di m na Ryusuke

[Foto dị na peeji nke 25]

Seikichi na ụmụ anyị ndị nwoke abụọ, ọnwa isii tupu ihe ọghọm ahụ emee

[Foto dị na peeji nke 27]

E ji ụmụ nwoke abụọ gọzie anyị, Ryusuke na Kohei (n’elu), bụ́ ndị ‘chetaworo onye kere anyị’