Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Ga-enwekwu Nnwere Onwe Ime Ihe Kwekọrọ n’Akọ na Uche Mmadụ na Mexico?

À Ga-enwekwu Nnwere Onwe Ime Ihe Kwekọrọ n’Akọ na Uche Mmadụ na Mexico?

À Ga-enwekwu Nnwere Onwe Ime Ihe Kwekọrọ n’Akọ na Uche Mmadụ na Mexico?

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA MEXICO

IWU kwadoro nnwere onwe okpukpe na Mexico. Ka o sina dị, iwu ahụ nwekwara ihe mgbochi ụfọdụ ná nnwere onwe ife ofufe. Dị ka ihe atụ, a makebeghị ihe banyere echiche nke ịjụ ije agha n’ihi akọ na uche ná mba a. Ọ bụ ya mere Ngalaba Na-enyocha Iwu, nke National Autonomous University of Mexico (UNAM) ji kpebie inwe nnọkọ nke mba nile nke a kpọrọ “Ịjụ Ihe n’Ihi Akọ na Uche na Mexico na n’Ụwa.” Ngalaba Na-enyocha Iwu nke UNAM nọ n’okpuru gọọmenti, ma nzube ya bụ inyocha iwu ndị e guzobeworo na otú e si eji ha eme ihe. A kpọrọ Ndịàmà Jehova nọ na Mexico òkù izite onye nnọchianya ka o kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Ndịàmà Jehova na Ịjụ Ihe n’Ihi Akọ na Uche.”

Ndị Prọfesọ Ekwuo Uche Ha

Okwu bụ́ “Ịjụ Ihe n’Ihi Akọ na Uche n’Iwu Ụwa Dum,” bụ́ nke Dr. Javier Martínez Torrón, bụ́ profesọ na Mahadum Nkà Mmụta Iwu nke Granada dị na Spain, kwuru, mere ka ọ pụta ìhè na nnwere onwe ime ihe kwekọrọ n’akọ na uche mmadụ na ikike mmadụ nwere ịjụ iji iwu ụfọdụ mee ihe ma ọ bụ ịjụ ihe ụfọdụ a chọrọ ya n’aka n’ihi akọ na uche ya abụrụworị ihe a nabatara n’ụwa nile. O zoro aka n’ọnọdụ Ndịàmà Jehova bi na Spain na ikpe Kokkinakis na Gris. *

Dr. José Luis Soberanes Fernández, bụ́ onye profesọ ná Ngalaba Na-enyocha Iwu nke UNAM, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ahụmahụ Ndị Mexico n’Isiokwu Ahụ.” “Anyị aghaghị ime ka ọ pụta ìhè na Iwu Mexico Banyere Òtù Okpukpe na Ofufe Ihu Ọha fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ machibidoro ịjụ ihe n’ihi akọ na uche iwu,” ka o kwuru, na-ezo aka n’Akụkụ Mbụ nke Iwu ahụ, nke na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla nkweta okpukpe si agụpụ onye ọ bụla n’irube isi n’iwu na-achị mba a. Ọ dịghị onye ọ bụla ga-enwe ike iji n’ihi ihe banyere okpukpe zere ibu ọrụ na ọrụ ndị iwu tụpụtara.” Ná mmechi, Dr. Soberanes kwuru, sị: “Anyị kwenyere na ọ dị oké mkpa imepụta iwu n’okwu banyere ịjụ ihe n’ihi akọ na uche na Mexico.”

O zoro aka n’eziokwu ahụ bụ́ na kwa afọ ọtụtụ narị ụmụaka bụ́ Ndịàmà nọ na Mexico na-eche nsogbu dị iche iche metụtara agụmakwụkwọ ha ihu n’ihi ọjụjụ dabeere na Bible nke ha na-ajụ ikele ọkọlọtọ. A dịghị ekwe ụfọdụ ụmụaka bụ́ Ndịàmà ọbụnadị idebanye aha ha n’ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, site n’arịrịọ ndị a rịọrọ site n’aka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, e nyeghachila ọtụtụ n’ime ha ikike ruuru ha ịgụ akwụkwọ. Ụfọdụ ndị isi na-ahụ maka agụmakwụkwọ emewo ihe iji gbochie ịchụpụ ụmụaka n’ụlọ akwụkwọ, ma ụfọdụ ndị nkuzi na-eleghara mgbalị ndị dị otú ahụ anya. Ndị ọchịchị agbachiwo nguzo nke Ndịàmà nkịtị, ma e nwebeghị otu ụkpụrụ nke ụlọ akwụkwọ ndị dị na Mexico pụrụ ịgbaso.

Nnọkọ ahụ tụlekwara ịjụ ihe n’ihi akọ na uche bụ́ ndị okpukpe ndị ọzọ welitere, dị ka ịbụ ndị a na-amanye ịrụ ọrụ n’ụbọchị ndị ha weere dị ka ndị dị nsọ, ịbụ ndị a chọrọ ka ha na-eji ejiji n’ụzọ na-emegide nkwenkwe okpukpe ha mgbe ha nọ n’ọrụ, nakwa ihe ndị ọzọ. A tụlekwara ịjụ ije ozi agha na ọgwụgwọ ụfọdụ.

Ndịàmà Jehova na Siza

Otu onye so na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico nyere nchịkọta nke nkwenkwe ha ndị bụ́ isi. Ọ kọwara nrapara ha na-arapara n’ụkpụrụ Bible dị ka nke ahụ e kwupụtara na Luk 20:25, bụ́ nke na-agwa ndị Kraịst ka ha ‘nyeghachi Siza ihe nke Siza.’ O zokwara aka ná Ndị Rom 13:1, bụ́ nke kwuru na ndị Kraịst aghaghị ịkwanyere ndị na-achị isi ùgwù. O mesiri ya ike na Ndịàmà Jehova bụ ụmụ amaala isi zuru okè, ndị na-erube isi n’iwu, bụ́ ndị na-agbalị ịtụ ụtụ isi ha, ndị na-adịghị akpata ọgba aghara, ndị na-edebe ebe obibi ha ọcha, na ndị na-eziga ụmụ ha ụlọ akwụkwọ.

Ọ kọwapụtaziri ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ọjụjụ Ndịàmà na-ajụ ikele ọkọlọtọ, bụ́ nke a pụrụ ịchọta n’Iwu Iri ahụ, nke dị n’Ọpụpụ 20:3-5: “Gị enwela Chi ọzọ tinyere m. Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị ná mmiri n’okpuru ụwa: Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe.”

Ndịàmà Jehova na-efe nanị Chineke ofufe, ọ dịghịkwa mgbe ha na-efe ihe oyiyi. Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe ha ga-eme omume enweghị nkwanye ùgwù megide ihe nnọchianya mba ma ọ bụkwanụ kwuo okwu n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù megide ya.

Iji mesie echiche Ndịàmà Jehova n’okwu a ike, e gosiri ihe nkiri vidio bụ́ Purple Triangles. Vidio a na-egosi nguzo siri ike Ndịàmà Jehova weere na Nazi Germany (1933-1945). Ọ na-egosi akụkọ banyere ezinụlọ Kusserow, bụ́ ezinụlọ guzosiri ike na nkwenkwe ha n’oge ọchịchị Nazi. *

A kọwaziri ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ọjụjụ Ndịàmà Jehova na-ajụ ịnara mmịnye ọbara. (Jenesis 9:3, 4; Ọrụ 15:28, 29) A kọwara ndokwa e nwere maka Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ n’ụwa nile. Tụkwasị na nke ahụ, e mere ka ihe ndị ndị dokịta kwenyerenụ rụzuworo n’ịwa Ndịàmà Jehova ahụ na-ejighị ọbara, pụta ìhè.

Kwa ụbọchị, ihe dị ka 100 mmadụ jere nnọkọ ndị ahụ, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ọkàiwu. Ndị nnọchianya nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Metụtara Okpukpe na Mexico jekwara. Ndị nile jerenụ nụrụ echiche ndị ọkachamara banyere ịkwanyere ịjụ ihe n’ihi akọ na uche ùgwù. Echiche a bụ ihe ọhụrụ nye ndị omeiwu nọ na Mexico, n’agbanyeghị na ọ bụ ihe a nakweere ebe nile n’ọtụtụ mba ndị nwere ọchịchị onye kwuo uche ya, dị ka na France, Portugal, Spain, na United States nakwa ná mba ụfọdụ ebe e nweburu ọchịchị Kọmunist, dị ka Czechia na Slovakia.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee isiokwu ndị bụ́ “Ụlọikpe Dị Elu nke Europe Akwado Ikike Ime Nkwusa na Gris” na “Ichebe Ozi Ọma ahụ n’Ụzọ Iwu,” ná mbipụta Ụlọ Nche nke September 1, 1993, nakwa December 1, 1998.

^ par. 13 Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1986, “Ịhụnanya Ezinụlọ M Hụrụ Chineke n’Agbanyeghị Ịga Mkpọrọ na Ọnwụ.” Leekwa mbipụta nke January 15, 1994, peji nke 5.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ndịàmà Jehova nọ na Mexico ji nnwere onwe ha nwere ime nkwusa kpọrọ ihe