Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgba Ohu nke Oge A—Nkwụsị Ya Dị Nso!

Ịgba Ohu nke Oge A—Nkwụsị Ya Dị Nso!

Ịgba Ohu nke Oge A—Nkwụsị Ya Dị Nso!

“Nnwere onwe otu onye bụ akụkụ dị mkpa nke nnwere onwe mmadụ nile. Ị pụghị itinye otu n’ihe ize ndụ n’etinyeghị nke ọzọ n’ihe ize ndụ n’otu oge ahụ.”Victor Schoelcher, Onye France Bụ́ Odeakụkọ Na Onye Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị, 1848.

“GỊNỊ bụ àgwà ọjọọ a mmadụ nwere bụ́ nke dugaworo ya mgbe nile n’ilelị, ịchị na iweda mmadụ ibe ya n’ala?” ka ndị nchịkọta akụkọ nke The UNESCO Courier na-ajụ. “Oleekwa otú o si bụrụ na e nyebeghị ntaramahụhụ maka mpụ dị otú ahụ a na-eme megide ihe a kpọrọ mmadụ ọbụna kemgbe okwu banyere Ihe Ndị Ruuru Mmadụ malitere?”

Azịza ya nwere ọtụtụ akụkụ. Ọ bụ anyaukwu na-akpali iji ụmụaka akpa ego nakwa ihe ndabara nke ịnọ n’ụgwọ. A na-ekwu na ọ bụ ịda ogbenye na agụghị akwụkwọ na-akpata irenye ụmụ agbọghọ n’ịgba akwụna nakwa n’alụmdi na nwunye ịgba ohu. Ụkpụrụ okpukpe na echiche ọdịnala na-eso akpata ịbụ ohu arụsị. N’ihe banyekwara ndị ikom na-aga Bangkok ma ọ bụ Manila iji nweta ụmụ okoro ma ọ bụ ụmụ agbọghọ na-enwebeghị ihe ha ma, bụ́ ndị na-ebughị ọrịa AIDS, ebumnobi ha kpọmkwem bụ mmekọahụ megidere okike na nke rụrụ arụ. Ihe ndị a nile bụ akụkụ nke ụwa ebe ndị mmadụ bụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, . . . ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa,” dị ka Pọl onyeozi, bụ́ onye na-amụ iwu na narị afọ mbụ si kwuo. (2 Timoti 3:1-5) Ọ bụ akụkụ nke ụwa ebe ‘a na-apụghị ime ihe nke gbagọrọ agbagọ ka ọ dịzie: ọzọ, ebe a na-apụghị ịgụta ihe nkọnahụ,’ ma e kwuo ya dị ka onye amamihe aha ya bụ Solomọn si kwuo ya.—Eklisiastis 1:15.

Mgbanwe nke Uche

Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị ihe pụrụ ịkwụsị ma ọ bụ ihe a ga-eme iji kwụsị ịgba ohu Kpam kpam—n’ụdị nke dịwara kemgbe ụwa ma ọ bụ n’ụdị ya nke oge a? Ọ dịghị ma ọlị!

Ọfịs UN nke Kọmishọna Ukwu Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ (OHCHR) na-ekwu na ịgba ohu bụ “ọnọdụ nke uche,” na-ekwukwa sị: “Ọbụna mgbe e kpochapụrụ ya, ịgba ohu na-ahapụ ihe a ga-eji na-echeta ya. Ọ pụrụ ịnọgide dị ka ọnọdụ nke uche—nke ndị o metụtara na ụmụ ha na nke ndị ketara ihe ndị a gbaara ohu—ogologo oge mgbe a machibidosịrị ya iwu.”

N’ihi ya otu ụzọ isi kpochapụ ịgba ohu ga-abụ ime ka e nwee mgbanwe nke echiche—mgbanwe nke obi—n’ụwa nile. Nke ahụ na-agụnyekwa mgbanwe nke mmụta—ịkụziri ndị mmadụ ịhụrịta ibe ha n’anya na ịsọpụrụ ha. Ọ pụtara inyere ndị mmadụ aka iwepụ anyaukwu n’obi ha kpam kpam ma na-agbaso ụkpụrụ omume ndị dị elu. Ònye pụrụ inye mmụta dị otú ahụ? Ndị OHCHR na-ekwu na “onye ọ bụla aghaghị ịtụnye ụtụ n’ime ka e nwee usoro ihe ụwa nke na-adịkwaghị anabata nrigbu obi ọjọọ.”

Tụlee ọrụ nkụzi nke ìgwè ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Jehova nọworo na-arụ n’ụwa nile. Ihe omume a enwewo ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ndị nwere obi eziokwu ịghara ịnabata ma ọ bụ ịnakwere nrigbu obi ọjọọ. Site na ya, a kụziworo ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ihe karịrị ala 230 iji nkwanye ùgwù na-emeso mmadụ ibe ha ihe. N’ihi gịnị ka ihe omume a ji enwe ihe ịga nke ọma?

N’ihi na ọ dabeere na Bible, bụ́ akwụkwọ e dere site n’ike Onye Okike mmadụ. Ọ bụ akwụkwọ nke na-akwalite ùgwù mmadụ. Ndị e ji Bible zie ihe n’ọrụ nkụzi nke Ndịàmà Jehova na-amụta na Onye Okike anyị, bụ́ Jehova, bụ Chineke nke ùgwù n’onwe ya. (1 Ihe E Mere 16:27) Ọ na-enye ihe nile o kere eke ùgwù. Nke a na-agụnye ma ndị ikom ma ndị inyom, si n’agbụrụ nile, ebe dị iche iche, na ọnọdụ akụ̀ na ụba dị iche iche.—Lee igbe bụ́ “Nnwere Onwe na Ùgwù Mmadụ—Site n’Ole Ebe?”

Ịha Nhata na Nkwanye Ùgwù

Bible na-ezi na Chineke ‘sitere n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile.’ (Ọrụ 17:26) N’ihi ya, ọ dịghị onye pụrụ ikwu na ya karịrị mmadụ ibe ya ọ bụla ma ọ bụ nwee ikike imegbu ma ọ bụ irigbu ndị ọzọ. Ndị dị njikere ịmụta ihe aghọtawala eziokwu ahụ bụ́ na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ha na-aghọta na ịhụnanya Chineke gbasara agbasa, ebe ọ bụ na ihe ùgwù nke isoro ya nwee mmekọrịta chiri anya dịịrị mmadụ nile. N’eziokwu, “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Jọn 3:16.

Mmụta a dabeere na Bible na-enwe mmetụta dị ukwuu n’àgwà ndị mmadụ. Site na ya a pụrụ ime ka obi na uche ndị mmadụ “dị ọhụrụ kpam kpam.” (Ndị Efesọs 4:22-24, Today’s English Version) Ọ na-akpali ha iji nkwanye ùgwù na nsọpụrụ na-emeso mmadụ ibe ha ihe. Ha ekpebisiwo ike ‘ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ’ (Ndị Galetia 6:10) Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ezi onye Kraịst ma na-etinye aka n’iji obi ọjọọ erigbu ma na-emegbu mmadụ ibe ya ọ bụla. Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ ịbụ ìgwè ndị Kraịst dị ka ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, nke ‘onye Juu ma ọ bụ onye Grik na-adịghị, ohu ma ọ bụ onye nwe onwe ya na-adịghị, nwoke na nwanyị na-adịghị: n’ihi na ha nile bụ otu onye n’ime Kraịst Jisọs.’—Ndị Galetia 3:28.

Mgbanwe Ọchịchị

Otú ọ dị, iji kwụsị ụdị ịgba ohu nile kpam kpam, a chọrọ oké mgbanwe n’ọha mmadụ. Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ na-ekwu na iji kwụsị irigbu mmadụ, “ịgbanwe ọnọdụ nke na-anabata ma na-anakwere” omume ndị dị otú ahụ dị mkpa. Ihe omume mba nile, imekọ ihe ọnụ nke mba nile, na mkpebisi ike nke mba nile so n’aro ndị ọzọ òtù ahụ tụrụ.

N’ụzọ ezi uche dị n’ime ya, nke a ga-achọ ikike pụrụ ịchị akụkụ buru ibu nke mbara ụwa anyị, ikike pụrụ ịhụ na mmadụ nile nweere onwe ha. Boutros Boutros-Ghali, onye bụbu odeakwụkwọ ukwu nke òtù UN, kwuru na e kwesịrị ịgwọta nsogbu ndị bụ́ isi na-emetụta mbara ụwa anyị “n’ụwa nile.” Ma ọ bụghị mmadụ nile ji nnọọ n’aka na e nwere mgbe nke a pụrụ ime eme. Ahụmahụ e nwere n’oge gara aga na-egosi na ọtụtụ ndị na-achị achị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị ma na-eche nanị banyere onwe ha gabiga ókè n’ihe banyere mmasị ha nwere na nzube ha nke na ọ ga-esi ike ime ka mba nile mekọọ ihe ọnụ.

Otú ọ dị, Bible—otu akwụkwọ ahụ kụziwooro ọtụtụ nde mmadụ ịkwanyere mmadụ ibe ha ùgwù—na-egosi na Chineke na-ezube iguzobe ọchịchị ụwa dị otú ahụ. Na Bible ị ga-ahụ ọtụtụ nkwa maka ụwa ọhụrụ nke ezi omume. (Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13) Ọ bụ nzube Chineke iwepụ onye ọ bụla na-ahụghị Chineke na onye agbata obi ya n’anya n’ụwa. Chineke ekpughewo nzube ya iguzobere ihe a kpọrọ mmadụ ọchịchị zuru ụwa ọnụ ịchị ụwa n’ezi omume. Jisọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka ọchịchị ahụ n’ihe a na-akpọkarị Ekpere Onyenwe Anyị, ma ọ bụ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.—Matiu 6:9, 10.

Irigbu mmadụ na ụdị nile nke ịgba ohu agakwaghị adị n’okpuru ọchịchị a n’ihi na Kraịst bụ́ Eze ga-achị “n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume.” (Aịsaịa 9:7) Ndị a na-emegbu emegbu ga-enwere onwe ha n’okpuru ọchịchị ezi omume ya, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha”—Abụ Ọma 72:12-14.

Ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ịhụ nkwụsị nke ịgba ohu—ụdị nile nke ịgba ohu—anyị na-akpọ gị òkù ka ị mụkwuo ihe banyere nzube Chineke iguzobe ọchịchị ụwa nke a na-eme ka mmadụ nwere onwe ya. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ime nke a.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

NNWERE ONWE NA ÙGWÙ MMADỤ—SITE N’OLE EBE?

Anyị nile bu ọchịchọ maka nkwanye ùgwù na nnwere onwe pụta ụwa. Kofi Annan, bụ́ odeakwụkwọ ukwu òtù UN, kwupụtara echiche ọtụtụ ndị nwere mgbe ọ jụrụ, sị: “Ònye pụrụ ikwu na ọ bụghị eziokwu na anyị nile na-achọ ndụ nke egwu, ịta mmadụ ahụhụ na ịkpa ókè na-adịghị na ya? . . . Olee mgbe ị nụtụrụla ka nanị onye nweere onwe ya na-ekwu ka nnwere onwe kwụsị? Olee ebe ị nụtụrụla ka ohu na-arụ ụka ka ịgba ohu na-aga n’ihu?”

Echiche ndị dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. N’ịkatọ echiche ahụ bụ́ na a mụrụ ụfọdụ ịbụ ndị ohu, onye Rom bụ́ ọkà ihe ọmụma na narị afọ mbụ bụ́ Seneca, dere n’akwụkwọ ozi ya bụ́ Letters to Lucilius, sị: “Biko chee echiche na ọ bụ otu mkpụrụ mụrụ gị na nwoke ahụ ị na-akpọ ohu gị, gị na ya nwere otu igwe ojii ọma ahụ dị n’elu, ọ na-eku ume otú ahụ ị na-eku, na-adị ndụ otú ahụ ị na-adị, na-anwụ otú ahụ ị na-anwụ!”

Imam ʽAlī, bụ́ onye a na-asọpụrụ nke ukwuu dị ka onye nke anọ nọchiri Muhammad, kwuru na mmadụ nile “ha nhata n’okike.” Saʽdī, bụ́ onye Peasia dere uri na narị afọ nke 13, kwupụtara, sị: “Ụmụ Adam bụ otu, e jikwa otu ihe kpụọ ha mgbe a na-eke ha. Mgbe ndị mmadụ mere otu n’ime ha ihe na-egbu mgbu, ahụ adịghị eru ndị ọzọ n’ime ha ala.”

Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme, nke Chineke mere ka e dekọọ na Bible na-emesi ùgwù mmadụ nile ike. Dị ka ihe atụ, Jenesis 1:​27 na-akọwa okike nke mmadụ, na-ekwu, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.” Onye Okike anyị bụ Chineke nke nnwere onwe. “Ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha,” ka Pọl onyeozi kwuru. (2 Ndị Kọrint 3:17) N’ike mmadụ n’onyinyo na n’ọdịdị ya, Jehova nyere mmadụ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịba uru, ùgwù onwe onye. Site n’ịtọhapụ ihe ndị o kere pụọ “n’ịbụ ohu mmebi,” ọ ga-ahụkwa na ndị mmadụ ga-enweta nnwere onwe na ùgwù dị otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠Ndị Rom 8:⁠21.

[Foto dị na peeji nke 9]

Onye ọ bụla kwesịrị inwe ùgwù na nnwere onwe

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

MMỤTA BIBLE NA-EMESI ỊKWANYERE MMADỤ ÙGWÙ IKE MA NA-ENYE OLILEANYA MAKA ỤWA ỌHỤRỤ NKE NA-ABỊA N’ỌDỊNIHU

Otu ọmụmụ Bible ezinụlọ na Benin

Ịma mma nke nsọdata nke Osimiri Nile na-acha Anụnụ Anụnụ n’Etiopia na-enye ihe atụ nke paradaịs e weghachiri eweghachi