Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ili Ozu Pụrụ Iche

Ebe Ili Ozu Pụrụ Iche

Ebe Ili Ozu Pụrụ Iche

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’ECUADOR

N’OBODO Ibarra, dị n’ebe ugwu isi obodo Ecuador, bụ́ Quito, e nwere otu ebe ili ozu pụrụ iche—el cementerio de los pobres (Ebe Ili Ozu nke Ndị Ogbenye). Gịnị mere ya ọpụrụiche? Ihe osise ndị e sere ná mgbidi dị n’ihu ya bụ ihe osise ndị e mere ka ha buo ibu, bụ́ ndị e nwetara kpọmkwem n’akwụkwọ ndị Watch Tower Society bipụtara! * Ihe osisi dị n’etiti na-egosi Jọn onyeozi, nke e nwetara na peji nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! N’elu Jọn, e dere n’asụsụ Spanish, okwu bụ́: “Alaeze Chineke pụtara ezi omume na udo na ọṅụ. Ndị Rom 14:17.” N’aka ekpe e dere okwu ndị ahụ dị na Matiu 11:28: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị nọ na-adọlị ma bụrụ ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ,” bụ́ nke e nwetara na New World Translation. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mgbidi nke ebe ili ozu a na-arụ ọrụ iduzi ndị mmadụ gaa n’Okwu Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Iji mezuo ihe ndị iwu chọrọ, a ghaghị inweta ikike tupu a na-ebipụtaghachi isiokwu dị iche iche ma ọ bụ ihe osise sitere n’akwụkwọ Watch Tower bipụtara, e kwesịkwara ikwu na e nwetara ha n’aka Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania.