Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Okwukwe—Gịnị Ka Ọ Bụ?

Ezi Okwukwe—Gịnị Ka Ọ Bụ?

Echiche nke Bible

Ezi Okwukwe—Gịnị Ka Ọ Bụ?

“A SỊ NA OKWUKWE ADỊGHỊ Ọ BỤ IHE A NA-APỤGHỊ IME, BỤ́ IME IHE GA-ATỌ CHINEKE EZI ỤTỌ: N’IHI NA ONYE NA-ABỊAKWUTE CHINEKE AGHAGHỊ IKWE NA Ọ DỊ, NA Ọ NA-EGOSIKWA ONWE YA ONYE NA-ENYEGHACHI NDỊ NA-ACHỌ YA ỤGWỌ ỌRỤ.”—NDỊ HIBRU 11:6.

GỊNỊ bụ okwukwe? Ụfọdụ ndị na-akọwa okwukwe dị ka nkweta okpukpe e nwere na Chineke dị n’enweghị ezi ihe àmà na-egosi na ọ dị. Onye America na-ede akụkọ bụ́ H. L. Mencken kọwara okwukwe dị ka “nkwenkwe ezi uche na-adịghị na ya n’ihe na-eyighị ka ọ ga-ekwe omume.” Nke a ọ̀ bụ ezi okwukwe dị ka a kọwara ya na Bible? Ọ dị mkpa ịghọta n’ụzọ doro anya ihe okwukwe bụ n’ihi na, dị ka e hotara n’elu, “a sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ.”

Bible na-ekwu, sị: “Okwukwe bụ ijide n’aka ihe ndị anyị tụrụ anya ha.” (Ndị Hibru 11:1, The New Testament in the Language of Today) N’ihi ya, okwukwe na-adabere n’ezi ihe ọmụma, eziokwu ndị a pụrụ ịdabere na ha wee mee mkpebi ndị ziri ezi. Ọ chọrọ ọ bụghị nanị ikwere kamakwa inwe ihe mere a ga-eji kwere.

Iji maa atụ: ikekwe i nwere enyi nke ị pụrụ ikwu banyere ya, sị: “Atụkwasịrị m nwoke ahụ obi. Apụrụ m ịtụkwasị ya obi ime ihe o kwuru. Amaara m na ọ bụrụ na m enwee nsogbu, ọ ga-enyere m aka.” O yighị ka ị ga-ekwu nke ahụ banyere onye ị matara nanị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, ka ị̀ ga-ekwu ya? Ọ ghaghị ịbụ onye gosipụtaworo ọtụtụ ugboro na a pụrụ ịtụkwasị ya obi. Ọ ghaghị ịbụ otu ihe ahụ n’ebe okwukwe okpukpe dị, bụ́ nke kwesịrị ịkpali olileanya na nkwenyesi ike dabeere n’ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ, nke a pụrụ ịdabere na ya.

Okwukwe Ka Ọ̀ Bụ Ikwere Ihe n’Ajụghị Ase?

Ihe dị ukwuu n’ihe a na-ewere na ọ bụ okwukwe taa bụ n’ezie ikwere ihe n’ajụghị ase—ikwere ihe ozugbo n’enweghị ezi ihe ndabere ma ọ bụ ezi ihe mere a ga-eji kwere. Ikwere ihe n’ajụghị ase na-adaberekarị ná mmetụta uche na nkwenkwe ụgha ndị na-agbanwe agbanwe. Nke a abụghị ezi okwukwe n’ihi na o nweghị ezi ihe ndabere mere a ga-eji nwee ya.

Ikwere ihe n’ajụghị ase pụrụ ime ka mmadụ jiri ọkụ ọkụ mee mkpebi ndị ọ pụrụ ịbụ na ha ekwekọghị n’eziokwu Bible. N’ihi ya, Bible na-adọ aka ná ntị megide okwukwe na-enweghị ihe ndabere: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) Pọl onyeozi dere, sị: “Na-anwanụ ihe nile; jidesienụ ihe ọma ike.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Bible akwadoghị ikwere ihe n’ajụghị ase. Ọ kwadoro okwukwe dabeere n’ihe àmà.

Inwe ike ịghọta ihe dị iche n’etiti ezi okwukwe na ikwere ihe n’ajụghị ase dị oké mkpa. Mmadụ pụrụ iji okpukpe kpọrọ ihe ma ka bụrụ onye na-enweghị ezi okwukwe. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Ma ụfọdụ ndị nwere okwukwe dabeere na Bible, ọ na-emetụtakwa ndụ ha.

Ezi Okwukwe Na-ekekọta Mmadụ na Chineke

A pụrụ iji okwukwe tụnyere ị́gà nke nwere obi ike na ntụkwasị obi dị ka ihe ngakọta ha bụ́ nke na-ekekọta mmadụ na Chineke. Ma a na-azụlite ụdị okwukwe a azụlite; ọ bụghị ihe anyị bu pụta ụwa. Olee otú ị pụrụ isi nwee ezi okwukwe? Bible na-akọwa, sị: “Okwukwe si n’ọnụnụ pụta, ma ọnụnụ ahụ sitere n’okwu Kraịst.”—Ndị Rom 10:17.

Ya mere, ọ dị gị mkpa iwepụta oge iji mara Chineke na ihe ndị Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, kụziri. A dịghị enweta ihe ọmụma a n’etinyeghị mgbalị. (Ilu 2:1-9) Ị ghaghị ịdọgbusi onwe gị ike iji chọpụta ihe Bible na-ekwu iji mee ka i kwenyesie ike na a pụrụ ịdabere na ya.

Otú ọ dị, ezi okwukwe abụghị nanị inwe ihe ọmụma ma ọ bụ ikwe na ihe bụ eziokwu. Ọ gụnyekwara obi—isi iyi nke mkpali. Ndị Rom 10:10 na-ekwu, sị: “A na-eji obi kwere.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Gịnị ka nke a pụtara? Ka ị na-atụgharị uche n’ihe ndị metụtara Chineke, na-azụlite ekele maka ha, ị na-eme ka ozi Bible bamie n’obi gị. Okwukwe gị na-eto eto ma na-esiwanye ike ka a na-akpali gị ime ihe dabeere ná nkwa Chineke nakwa ka ị na-ahụ ihe àmà nke ngọzi ya.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:3.

Lee ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa okwukwe bụ! Anyị na-erite uru site n’inwe ike iche ọnọdụ ndị siri ike ihu na-enwe obi ike n’ebe Chineke nọ, na-atụkwasị obi n’ikike o nwere iduzi nzọụkwụ anyị na njikere ọ dị igbo mkpa anyị. Ọzọkwa, Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, kọwara otu abamuru na-adịte aka nke okwukwe, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ndụ ebighị ebi—lee onyinye magburu onwe ya ọ bụụrụ ndị nwere okwukwe!

Inwe okwukwe ná nkwa Chineke kwere ịkwụ ndị ohu ya ụgwọ ọrụ na-eme ka mmadụ na-ele ndụ anya n’ụzọ dị iche. Ndị Hibru 11:6 na-ekwu na ezi okwukwe gụnyere ikwe n’ikike Chineke nwere ịkwụ “ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” Mgbe ahụ, o doro anya na ezi okwukwe abụghị ikwere ihe n’ajụghị ase, ọ gụnyekwara ihe karịrị ikwere nanị na Chineke dị adị. Ọ gụnyere ikwere n’ikike Chineke nwere ịbụ onye na-akwụ ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ. Ị̀ chọrọ n’ezie ịmata Chineke? Ọ bụrụ na ị chọrọ, mgbe ahụ nweta ezi ihe ọmụma site n’Okwu ya, bụ́ Bible, okwukwe gị ga-ewetakwara gị ụgwọ ọrụ.—Ndị Kọlọsi 1:9, 10.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Ihe Osise nke Albrecht Dürer/Dover Publications, Inc.