Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Igbu Onwe Onye—Nsogbu Zuru Ebe Nile nke Na-apụtachaghị Ìhè

Igbu Onwe Onye—Nsogbu Zuru Ebe Nile nke Na-apụtachaghị Ìhè

Igbu Onwe Onye—Nsogbu Zuru Ebe Nile nke Na-apụtachaghị Ìhè

JOHN NA MARY * nọ ná ngwụsị afọ ndị 50 ha ma biri n’obere ụlọ dị n’ime ime obodo United States. John ji nwayọọ nwayọọ na-anwụ n’ihi ọrịa emphysema na ọrịa obi ọ na-arịa. Mary apụghị iche n’echiche otú ndụ ya ga-adị ma John nwụọ, ọ pụghịkwa ịnagide ihe mgbu nke ịnọ na-ele ya ka o ji nwayọọ nwayọọ na-anwụ, na-eku ume otu otu. Mary nwere nsogbu ahụ ike nke ya, o nwewokwa ịda mbà n’obi ruo ọtụtụ afọ. N’oge na-adịbeghị anya, John anọwo na-enwe nchegbu n’ihi na Mary na-ekwu banyere igbu onwe ya. Ọ na-enwekwu mkpaghasị uche n’ihi ịda mbà n’obi na ọgwụ nile ọ na-aṅụ. Ọ na-ekwu na ya agaghị anagide echiche nke ịnọ nanị ya.

Ụlọ ahụ jupụtara n’ọgwụ—ọgwụ obi, ọgwụ ndị na-egbochi ịda mbà n’obi, na ọgwụ ndị na-akụjụ ahụ. N’otu isi ụtụtụ, Mary banyere na kichin ma malite nnọọ ịṅụ ọgwụ. Ọ kwụsịghị ruo mgbe John hụrụ ya ma napụ ya ọgwụ ndị ahụ. John kpọrọ ndị ọrụ nnapụta ka Mary tụbọrọ. O kelere Chineke na ọ hụrụ ya n’oge.

Ihe Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Na-ekpughe

E dewo ọtụtụ ihe n’afọ ndị a banyere ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-eto eto na-egbu onwe ha—nke ahụ kwesịkwara ekwesị, n’ihi na olee ọdachi karịrị nnwụchu ọnwụ nke onye na-eto eto ndụ juru ahụ, nke nwekwara olileanya? Ma ihe a na-adịghị ekwute okwu ya n’isi akụkọ ndị ahụ bụ eziokwu ahụ bụ́ na ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha n’ọtụtụ mba na-arị elu n’agbanweghị agbanwe n’etiti ndị toworo eto. Nke a bụ eziokwu n’agbanyeghị ma ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha n’otu mba ọ̀ dị elu ma ọ dị ala, dị ka igbe dị na peji bu ụzọ na-egosi. Ileba anya ná ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị ahụ na-ekpughekwa na nsogbu a nke na-apụtachaghị ìhè zuru ebe nile.

Na 1996 Ụlọ Ọrụ Maka Nchịkwa Ọrịa nke United States kọrọ na ọnụ ọgụgụ ndị America dị site n’afọ 65 gawa bụ́ ndị na-egbu onwe ha, ejiriwo pasent 36 rịa nnọọ elu kemgbe 1980. Ihe kpatatụrụ ịrị elu a bụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị America meworo okenye—ma ọ bụchaghị ya. Na 1996 ọnụ ọgụgụ bụ́ ezie nke ndị gafeworo afọ 65 gburu onwe ha, jikwara pasent 9 rịa elu na nke mbụ ya n’ime afọ 40. N’ihe banyere ndị nwụrụ n’ihi mmerụ ahụ, ọ bụ nanị ịda ada na mkpọka nke ụgbọala gburu ndị America meworo okenye karịa ndị gburu onwe ha. N’ezie, ọbụna ọnụ ọgụgụ ndị a na-emenye egwu pụrụ ịdị nnọọ ala. “A na-eche na a dịghị enwetazutụ ọnụ ọgụgụ ndị gburu onwe ha n’ihe ndekọ ndị e nwetara site ná ndejupụta nke ihe kpatara ọnwụ ha,” ka akwụkwọ bụ́ A Handbook for the Study of Suicide na-ekwu. Akwụkwọ ahụ na-ekwukwa na ụfọdụ ndị na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ha n’ezie ji okpukpu abụọ karịa ọnụ ọgụgụ ahụ e nyere.

Gịnị ka a chọpụtara? United States, dịkwa ka ọ dị n’ọtụtụ mba ndị ọzọ, na-enwe nsogbu nke ndị meworo okenye igbu onwe ha, bụ́ nke na-apụtachaghị ìhè ma zuo ebe nile. Dr. Herbert Hendin, bụ́ ọkachamara n’okwu ahụ, na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị na ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha na United States nọgidere na-arị elu, nke pụtakarịsịrị ìhè n’etiti ndị meworo okenye, ọha na eze etinyebeghị anya n’okwu banyere ndị meworo okenye na-egbu onwe ha.” N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? Ọ na-atụ aro na ihe so kpata nsogbu ahụ bụ na, ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ nke ndị meworo okenye na-egbu onwe ha na-arị elu mgbe nile, “ọ kpalibeghị egwu mberede nke mmụba dị ukwuu nke ndị ntorobịa na-egbu onwe ha na-akpali.”

Ihe Ịga nke Ọma Dị Egwu

Ọ bụ ezie na ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị a na-awụ akpata oyi n’ahụ, ha bụ nanị ọnụ ọgụgụ nkịtị. Ha apụghị igosi owu ọmụma nke ịnọ n’enweghị onye òtù ọlụlụ a hụrụ n’anya, nkụda mmụọ nke ịdaberezi n’onye ọzọ, obi nkoropụ n’ihi ọrịa na-ekweghị ala ala, mmetụta nke ịtọgbọrọ chakoo n’ihi ịda mbà n’obi na-adịghị akwụsị akwụsị, enweghị olileanya n’ihi ọrịa ga-egbu onye ahụ. Eziokwu dị mwute bụ na ọ bụ ezie na ndị na-eto eto pụrụ ịchọ igbu onwe ha, dị ka ụzọ dị njọ nke isi mee ihe banyere nsogbu na-adịghị adịte aka, ndị meworo okenye na-enwekarị nsogbu ndị yiri ka ha ga-adịte aka, ndị a na-apụghịkwa ịgwọta agwọta. N’ihi ya, ha na-ejikarị mkpebi siri ike achọ igbu onwe ha karịa ndị na-eto eto ma na-eme ya n’ụzọ gara nnọọ nke ọma.

“Ọ bụghị nanị na igbu onwe onye kasị ukwuu n’etiti ndị meworo okenye n’ụzọ pụtara ìhè karị, kama igbu onwe onye na-egosipụta oké ọdịiche dị n’etiti ndị meworo okenye na ndị na-eto eto,” ka Dr. Hendin na-ekwu, n’akwụkwọ ya bụ́ Suicide in America. “N’ezie, nkezi nke ndị meworo okenye bụ́ ndị nwara igbu onwe ha na ndị gburu onwe ha na-agbanwe agbanwe n’ụzọ dị ịrịba ama. N’ihe banyere ndị mmadụ n’ozuzu ha, e mewo atụmatụ na nkezi ndị nwara igbu onwe ha na ndị gburu onwe ha n’ezie bụ 1 n’ime mmadụ 10; ndị na-eto eto (afọ 15-24), e mewo atụmatụ na ọ bụ 1 n’ime 100 mmadụ; ndị gafewokwara afọ 55, e mewo atụmatụ na ọ bụ 1 n’ime 1 mmadụ.”

Lee ndekọ ọnụ ọgụgụ na-akpali echiche nke ahụ bụ! Lee ihe na-akpata ịda mbà n’obi ọ bụ ime agadi, enwekwaghị ume, na inwe ihe mgbu na ịrịa ọrịa! Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji egbu onwe ha. Ma, e nwere ezigbo ihe mere a ga-eji were ndụ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa—ọbụna n’ọnọdụ ndị siri oké ike. Tụlee ihe mere Mary, bụ́ onye e kwuru banyere ya ná mmalite.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Chaatị dị na peeji nke 17]

Ndị Na-egbu Onwe Ha n’Ime 100,000 Mmadụ Ọ Bụla, Na-adabere n’Afọ Ndụ na Ịbụ Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị

Site n’Afọ 15 Ruo 24 Site n’Afọ 75 Gawa

Ndị Ikom/Ndị Inyom Mba Ndị Ikom/Ndị Inyom

8.0 / 2.5 Argentina 55.4 / 8.3

4.0 / 0.8 Gris 17.4 / 1.6

19.2 / 3.8 Hungary 168.9 / 60.0

10.1 / 4.4 Japan 51.8 / 37.0

7.6 / 2.0 Mexico 18.8 / 1.0

53.7 / 9.8 Russia 93.9 / 34.8

23.4 / 3.7 United States 50.7 / 5.6