Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe E Zoro nke Ọma

Ihe E Zoro nke Ọma

Ihe E Zoro nke Ọma

“Ọ dịghị onye ga-anọ n’ohu ma ọ bụ ghara inwere onwe ya: a ga-amachibido ịgba ohu na ahịa ohu n’ụdị ha nile.”Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ.

MGBE ọzọ i tinyere shuga na kọfị gị, chee banyere Prevot, bụ́ onye Haiti e kwere nkwa inye ezigbo ọrụ ná mba ọzọ dị na Caribbean. Kama nke ahụ, e rere ya dollar asatọ.

Prevot nọ n’otu ọnọdụ ahụ ọtụtụ puku ndị ohu si ná mba ha nọ, bụ́ ndị a na-amanye igbu okpete ruo ọnwa isii ma ọ bụ asaa n’akwụghị ha ezigbo ụgwọ, ma ọ bụ n’akwụghị ha akwụ. A na-edebe ndị a e ji eji n’ebe kpara akpa ma ruo unyi. Mgbe a narasịịrị ha ihe onwunwe ha, a na-enye ha mma oge. Iji nweta ihe oriri, ha aghaghị ịrụ ọrụ. Ọ bụrụ na ha anwaa ịgbapụ, a pụrụ iti ha ihe.

Tụlee Lin-Lin, bụ́ nwa agbọghọ si n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia. Ọ dị afọ 13 mgbe nne ya nwụrụ. Ụlọ ọrụ na-achọta ọrụ zụụrụ ya n’aka papa ya n’ọnụ ego nke $480, kwe Lin-Lin nkwa inye ya ezigbo ọrụ. A kpọrọ ego a kwụrụ n’isi ya “ego sitere n’ihe a ga na-akwụ ya”—ụzọ doro anya e si jichie ya kpam kpam n’aka onye nwezi ya. Kama ịbụ onye e nyere ọrụ dị mma, a kpọgara Lin-Lin n’ụlọ ndị akwụna, bụ́ ebe ndị ahịa na-akwụ onye nwe ya $4 kwa awa n’isi ya. Ọ fọrọ nke nta ka Lin-Lin bụrụ ohu, n’ihi na ọ pụghị ịpụ ruo mgbe ọ kwụrụ ụgwọ o ji. Nke a gụnyere ego ọ na-efu onye nwe ụlọ ndị akwụna ahụ ilekọta ya nakwa ọmụrụ nwa na mmefu. Ọ bụrụ na Lin-Lin ajụ ime ihe onye were ya n’ọrụ chọrọ ka o mee, a pụrụ iti ya ihe ma ọ bụ taa ya ahụhụ. Nke ka njọ, ọ bụrụ na ọ nwaa ịgbapụ, a pụrụ igbu ya.

Ọ̀ Bụ Nnwere Onwe Maka Mmadụ Nile?

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eche na ịgba ohu adịkwaghị. N’ezie, mgbe e nwesịrị ọtụtụ nkwekọrịta, nkwupụta, na iwu, e kwupụtawo mmachibido iwu a machibidoro ya n’ihe ka ọtụtụ ná mba. A na-ekwupụta n’ụzọ siri ike asị a kpọrọ ịgba ohu n’ebe nile. Iwu mba dị iche iche machibidoro ịgba ohu, e chekwakwara iwu a machibidoro ya n’akwụkwọ iwu mba nile—karịsịa Akụkụ Iwu nke 4 nke Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadu nke 1948, bụ́ nke a kpọtụrụ uche n’elu.

Ma, ịgba ohu ka dị ma na-aga n’ihu—ọ bụ ezie na nye ụfọdụ ọ bụ ihe e zoro nke ọma. Site na Phnom Penh ruo Paris, site na Mumbai ruo Brasília, a na-amanye ọtụtụ nde mmadụ ibe anyị—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka—ibi ndụ na ịrụ ọrụ dị ka ndị ohu ma ọ bụ n’ọnọdụ ndị yiri nke ohu. Òtù Na-emegide Ịgba Ohu nke Mba Nile dị na London, bụ́ nke kasị ochie n’imegide ọrụ mmanye, na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’agbụ dị ọtụtụ narị nde. N’ezie, a pụrụ inwe ndị ohu n’ụwa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ!

N’eziokwu, ịgà, ụtarị, na igbu ná ntụ a maara nke ọma abụghị ihe ndị a na-ejikarị eme ihe n’ịgba ohu nke oge a. Ọrụ mmanye, alụmdi na nwunye mmadụ na-enwereghị onwe ya, ịnọ n’ụgwọ, iji ụmụaka akpa ego, nakwa ọtụtụ mgbe ịgba akwụna bụ nanị ụfọdụ n’ime ụdị ịgba ohu ndị a maara nke ọma n’oge a. Ndị ohu pụrụ ịbụ ndị iko nwanyị, ndị na-eji ịnyịnya eme asọmpi, ndị na-egbu okpete, ndị na-akpa kapet, ma ọ bụ ndị na-arụ ụzọ. N’eziokwu, a dịghị anọ n’ihu ọha egbu ọnụ ọgụgụ dị ukwuu ná ntụ, ma ha akaghị ndị buru ha ụzọ mma n’ezie. N’ọnọdụ ụfọdụ ndụ ha na-adị njọ ọbụna karị.

Ole ndị na-aghọ ndị ohu? Olee otú ha si aghọ ndị ohu? Gịnị ka a na-eme iji nyere ha aka? À ga-ekpochapụ ịgba ohu kpam kpam n’isi nso?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

GỊNỊ BỤ ỊGBA OHU NKE OGE A?

Nke a bụ ajụjụ na-esiri ọbụna Mba Ndị Dị n’Otu ike ịza mgbe ọtụtụ afọ nke ime mgbalị gasịrị. Otu nkọwa e nyere ịgba ohu bụ nke e chepụtara ná Nkwekọrịta Ịgba Ohu nke 1926, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ịgba ohu bụ ọnọdụ nke onye e nwe enwe na-enwereghị onwe ya iji nke ọ bụla ma ọ bụ ihe nile o nwere na-eme ihe.” Ma, a pụrụ inye ya nkọwa ọ bụla. Dị ka odeakụkọ bụ́ Barbara Crossette si kwuo, “ohu bụ aha e ji mara ndị ọrụ a na-akwụ obere ụgwọ n’ụlọ ọrụ ndị na-adụ uwe na uwe e ji eme egwuregwu ná mba ọzọ nakwa n’ụlọ ọrụ ndị na-akwụ ndị ọrụ ha obere ụgwọ n’obodo ukwu ndị dị n’America. E ji ya eme ihe iji katọọ ịgba mgbere mmekọahụ na ọrụ ụlọ mkpọrọ.”

Mike Dottridge, bụ́ onyeisi nke Òtù Na-emegide Ịgba Ohu nke Mba Nile, kwere na “ebe ịgba ohu yiri ka ọ na-adị n’ụdị ọhụrụ—ma ọ bụ ebe e ji okwu ahụ akọwa ọnọdụ ndị ọzọ—ihe ize ndụ dịnụ bụ na a pụrụ ịkọwahie ma ọ bụ ọbụna ghara ịkọwapụtacha ihe ọ pụtara.” Ọ dị ya ka “ịgba ohu ọ bụ iji ma ọ bụ ịchịkwa ndụ onye ọzọ n’ụzọ ụfọdụ.” Ọ na-agụnye mmanye na igbochi ngagharị​—⁠eziokwu nke bụ́ na “mmadụ enwereghị onwe ya ịpụ, ịgbanwe onye ọ na-arụrụ ọrụ.”

A. M. Rosenthal, mgbe ọ na-ede ihe na The New York Times, kwuru, sị: “Ndị ohu na-ebi ndụ ndị ohu—ajọ ọrụ ike, ndina n’ike, agụụ, ịta ahụhụ, mweda n’ala kpam kpam.” O kwukwara, sị: “Dollar 50 na-azụta otu ohu, n’ihi ya [nye ndị nwe ha] afọ ole ha na-adịru ndụ tupu a tụbanye ozu ha n’ime osimiri adịghị nnọọ ihe o mere.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ricardo Funari