Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị E Mere Ka Ha Chọọ Ịdị Ndụ

Ndị E Mere Ka Ha Chọọ Ịdị Ndụ

Ndị E Mere Ka Ha Chọọ Ịdị Ndụ

MARY nwere ịda mbà n’obi na ụfọdụ nsogbu ahụ ike ndị ọzọ. Otú ọ dị, o kewapụghị onwe ya n’ezinụlọ ya, o jighịkwa mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọnọdụ Mary na-egosi nke ọma na ọ dịghị mkpa na a ga-ahụ ihe mgbaàmà nile tupu mmadụ achọọ igbu onwe ya n’ezie.

Ruo oge ụfọdụ, o yiri ka Mary ọ ga-abụ onye ọzọ ga-egosipụta ihe ịga nke ọma nke ndị meworo okenye na-enwe n’igbu onwe ha. Ruo ọtụtụ ụbọchị, ọ nọgidere n’amaghị onwe ya, n’azaghị òkù, n’ebe a na-enye ya nlekọta dị ukwuu n’ụlọ ọgwụ dị n’ógbè ha, ọ̀tụ̀tụ̀ iku ume ya ana-agbago na-agbada. Di ya ọ na-ewute, bụ́ John, nọ n’akụkụ ya. Ndị dọkịta mere ka John na ezinụlọ ha mata na Mary pụrụ ịnwụ nakwa na ha pụrụ ịtụ anya na ụbụrụ ya ga-emebi kpam kpam ma ọ bụrụgodị na ọ nwụghị.

Otu onye agbata obi ha, bụ́ Sally, nke bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-eleta Mary kwa ụbọchị. “Agbara m ezinụlọ ahụ ume ka ha ghara ịda mbà,” ka Sally na-ekwu. “Mama m, bụ́ onye na-arịa ọrịa shuga, amataghị onwe ya ruo izu ụfọdụ n’afọ ole na ole gara aga. Ndị dọkịta gwara ezinụlọ anyị na ọ dịghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịnwụ, ma ọ nwụghị. M na-ejide Mary n’aka ma kwunyere ya okwu, dị ka m meere mama m, o yiri m ka m na-anụ ka ọ na-azaghachi n’olu dị ala.” Ka ọ na-erule ụbọchị nke atọ, ọ na-azaghachi otú a pụrụ ịnụ ya, Mary yikwara ka ọ na-amatawanye mmadụ, ọ bụ ezie na ọ pụghị ikwu okwu.

‘M Gaara Egbochi Ya?’

“John nwere obi amamikpe siri ike,” ka Sally na-ekwu. “O doro ya anya na o si ya n’aka.” Nke a bụ mmetụta a na-enwekarị mgbe onye a hụrụ n’anya gburu onwe ya ma ọ bụ chọrọ igbu onwe ya. “M chetaara ya na a na-agwọ Mary n’ihi ịda mbà n’obi. Ọ na-arịa ọrịa nke mere na ọ pụghị izere ịda mbà n’obi dịkwa ka John na-apụghị izere ịda ọrịa.”

Ndị ndị ha hụrụ n’anya na-egbu onwe ha na-ajụkarị onwe ha ajụjụ bụ́, Gịnị ka m gaara eme iji gbochie ya? Ime ihe ozugbo banyere mgbaàmà ya na ihe ndị pụrụ ịkpata ya pụrụ igbochi mmadụ ịchọ igbu onwe ya. Ma ọ bụrụ na o gbochighị ya, cheta na ọ bụghị gị ga-aza ajụjụ banyere omume na-ebibi onwe onye nke onye ọzọ. (Ndị Galetia 6:5) Ọ dị mkpa ka e cheta nke a karịsịa mgbe onye òtù ezinụlọ, nke chọrọ igbu onwe ya na-akpachara anya achọ ime ka ndị ọzọ nwee obi amamikpe. Dr. Hendin, bụ́ onye e hotara ná mmalite, na-ekwu, sị: “E kwesịrị iburu n’uche na ndị na-achọ igbu onwe ha n’ezie na-abụkarị ndị na-achọ iji mmetụta nke ndị ọzọ mee ihe, ọ bụ ezie na ha agaghịdị anọ ya ịhụ ma mgbalị ha ọ gara nke ọma ma ọ bụ na ọ gaghị.”

Dr. Hendin gara n’ihu ịkọwa sị: “N’ihe banyere ndị meworo okenye chọrọ igbu onwe ha, ha na-enwekarị ụmụaka toworo eto nakwa ụmụnne ma ọ bụ ndị òtù ọlụlụ bụ́ ndị onye ahụ na-achọ iji mmetụta ha mee ihe, ịchịkwa ha, ma ọ bụ ịmanye ha ka ha na-echebekwu ha. Ihe ndị onye ahụ chọrọ na-abụkarị ihe na-agaghị ekwe omume, ọtụtụ mgbe onye ahụ na-esikarị ọnwụ ka e mee ha, mgbalị siri ike igbu onwe onye na-esochikarị mgbalị na-erijughị afọ ime otú ahụ.”

Ndị òtù ezinụlọ nọ n’ọnọdụ ndị a pụrụ iche na ha nọ n’oké nrụgide n’ezie, bụ́ nke ha na-agaghị anagideli. Ma, ya adịla mgbe ị ga-echezọ na Jehova Chineke na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na nke a pụrụ ịgụnye ndị anyị hụrụ n’anya nwụworo anwụ bụ́ ndị gburu onwe ha n’ihi ịda mbà n’obi, isi mgbaka, ma ọ bụ obi nkoropụ.—Lee “Echiche nke Bible: Ndị gburu Onwe Ha—Hà Ga-ebilite n’Ọnwụ?” dị na Teta! (Bekee) nke September 8, 1990, peji nke 22-23.

Ọ bụ ezie na igbu onwe onye enweghị ike ịbụ ihe ziri ezi, ọ bụ ihe na-akasị obi icheta na olileanya ndị anyị hụrụ n’anya dị n’ebe Chineke nọ bụ́ onye na-aghọta nke ọma na adịghị ike na ezughị okè pụrụ ime ka mmadụ mee oké ihe ọjọọ dị otú ahụ. Bible na-ekwu banyere Jehova, sị; “Dị ka ịdị elu nke eluigwe si dị n’elu ụwa, otú a ka ebere Ya dị ike n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya. Dị ka Ihu anyanwụ si dị anya n’Ọdịda anyanwụ, otú a ka O meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.”—Abụ Ọma 103:11-14.

Ihe Na-enye Obi Ụtọ Si na Ya Pụta

Mary na ọnwụ gbara mgba ruo ụbọchị abụọ, ma ọ nwụghị. Uche ya jiri nke nta nke nta dajụọ, John kpọlakwara ya, kpọba ya n’ụlọ a kpọchigidechara ọgwụ nile n’ihe. Ndị ọrụ ebere na-ahụ maka ọrịa uche na-eletazi Mary mgbe nile, ọ na-ekwukwa na ya apụghị ịkọwa ma ọ bụ ọbụna cheta ajọ ọnọdụ ahụ gaara nnọọ egbu ya.

Ugbu a Sally, bụ́ onye agbata obi John na Mary, na-eduziri ha ọmụmụ Bible kwa izu. Ha amụtawo site na Bible na n’oge na-adịghị nnọọ anya Chineke ga-agwọta nsogbu ndị ahụ yiri ihe a na-agaghị agwọtali agwọta, karịsịa n’anya ndị meworo okenye. “Otú ọ dị, ọmụmụ Bible abụghị ihe na-agwọta nsogbu nile n’onwe ya,” ka Sally na-akọwa. “Ị ghaghị ịnwapụtara ya onwe gị site n’Akwụkwọ Nsọ na nkwa ndị a bụ ezie, mgbe ahụ ị ghaghị itinye ihe ndị ị na-amụta n’ọrụ. Ma echere m na John na Mary na-enwe ezi olileanya maka ọdịnihu.”

Ọ bụrụ na i nweghị olileanya ma bụrụ onye ọ ga-amasị inwe ezi olileanya, gịnị ma ị kpọtụrụ Ndịàmà Jehova? Ka ha gosi gị, dị ka ha gosiri John na Mary, na ọ dịghị nsogbu Chineke na-apụghị ma ọ bụ nke ọ na-agaghị agwọtali n’ọdịnihu dị nso. N’agbanyeghị otú ihe pụrụ iyi ka ọ jọruru ná njọ ugbu a, e nwere ihe ga-agwọta ya. Biko soro anyị tụlee olileanya e ji n’aka bụ́ nke meworo ka ọtụtụ ndị maliteghachị ịchọ ịdị ndụ.

[Igbe dị na peeji nke 20]

Ihe Ndị Pụrụ Ịkpata Ya na Ihe Mgbaàmà Ya

“Ihe ndị pụrụ ime ka ndị meworo okenye gbuo onwe ha dị iche na nke ndị na-eto eto,” ka magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association na-ekwu. Ihe ndị ahụ pụrụ ịkpata ya na-agụnye “oké ịba ụba nke ịṅụbiga mmanya ókè na ịda mbà n’obi, iji ụzọ ndị jọgburu onwe ha egbu onwe onye, na ikewapụ onwe onye n’ebe ọha na eze nọ. Ọzọkwa, ndị meworo okenye . . . na-aka arịa ọrịa, na-enwekwa nsogbu mmetụta uche karị.” Akwụkwọ bụ́ Suicide, nke Stephen Flanders dere, na-edepụta ihe ndị na-esonụ pụrụ ịkpata ya, bụ́ ndị nke ọ bụla n’ime ha chọrọ nlebara anya.

Oké ịda mbà n’obi:

“Ndị nnyocha na-akọ na 50% ma ọ bụ karịa nke ndị na-egbu onwe ha enwetụwo oké ịda mbà n’obi.”

Enweghị olileanya:

Ná nnyocha ụfọdụ, ọbụna ndị na-eyighị ka hà dara mbà n’obi yikarịrị nnọọ ka ha ga-achọ igbu onwe ha ma ọ bụrụ na ha enweghị olileanya maka ọdịnihu.

Aṅụrụma na ịṅụ ọgwụ ọjọọ:

“A na-eme atụmatụ na n’agbata 7% na 21% [nke ndị aṅụrụma] na-egbu onwe ha, ma e jiri ya tụnyere ihe na-erughị 1% nke ndị mmadụ n’ozuzu ha.”

Ọnọdụ ezinụlọ:

“Nnyocha ndị e mere na-ekpughe na ndị òtù ezinụlọ nwere mwute n’ihi ọnwụ nke otu n’ime ha gburu onwe ya nọ n’ihe ize ndụ ka ukwuu nke igbu onwe ha.”

Ọrịa:

“Ịtụ egwu maka ahụ esighịzi ike, bụ́ nke pụrụ ime ka a kpọga mmadụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi, pụrụ izu ezu ime ka ndị meworo okenye chọọ igbu onwe ha.”

Mfu:

“Ihe ahụ furunụ pụrụ ibu ezigbo ihe, dị ka ọnwụ nke onye òtù ọlụlụ ma ọ bụ enyi, ọrụ, ma ọ bụ ahụ ike mmadụ. Ọ pụkwara ịbụ ihe na-adịghị oké mkpa. Ihe atụ nke ahụ gụnyere ùgwù onwe onye, ọkwá, ma ọ bụ mmetụta nke ịnọ ná nchebe.”

Tụkwasị n’ihe ndị a pụrụ ịkpata ya, akwụkwọ Flanders depụtara mgbaàmà ndị na-esonụ a na-ekwesịghị iwere dị ka obere ihe.

Mgbalị mmadụ meburu igbu onwe ya:

“Nke a bụ mgbaàmà bụ́ isi nke inwe ike igbu onwe onye.”

Ikwu okwu banyere igbu onwe onye:

“Okwu ndị dị ka ‘Ha agakwaghị enye onwe ha nsogbu banyere m’ ma ọ bụ ‘Ha ga-enwe obi ụtọ karị ma ọ bụrụ na anọghị m ya’ bụ mgbaàmà nke iyi egwu doro anya.”

Ndokwa ikpeazụ:

“Àgwà dị otú ahụ na-agụnye ike ékpé, inyefu ihe onwunwe na-amasị ya, na ime ndokwa otú a ga-esi lekọta anụ e ji mere enyi.”

Mgbanwe àgwà:

Mgbe nke a “na okwu banyere abaghị uru ma ọ bụ enweghị olileanya na-esokarị,” ọ pụrụ ịbụ “mgbaàmà nke oké ịda mbà n’obi nke ruru ịkpata àgwà ibibi onwe onye.”

[Foto dị na peeji nke 21]

Enyemaka na-adịkarị ndị dị ndụ mkpa iji nagide ọnwụ nke onye òtù ọlụlụ ha gburu onwe ya