Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Enyi M Ji Mejọọ M?

N’ihi Gịnị Ka Enyi M Ji Mejọọ M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka Enyi M Ji Mejọọ M?

“Ọ dị ndị enyi m nwere . . . Ha maliteziri ime otu nwa agbọghọ ọzọ enyi, ọ bụrụkwa na m ejekwuru ha, ha na-akwụsị ikwu okwu. . . . Ha malitere ịgụpụ m n’ihe nile. Ọ na-ewute m n’ezie.”—Karen. *

Ọ PỤRỤ ime n’etiti ndị bụ nnọọ ezigbo enyi. Otu ụbọchị ha abụọ na-akpachi nnọọ anya; n’echi ya ha adịghịzidị eghe onwe ha ọnụ. “Enyi kwesịrị ịbụ onye ị pụrụ ịdabere na ya ma tụkwasị obi, onye ị pụrụ ichigharịkwuru n’ọnọdụ ọ bụla,” ka Nora dị afọ 17 na-ekwu. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ezigbo enyi gị pụrụ ịmalite ịkpa àgwà dị ka onye iro gị kasị njọ.

Ọbụbụenyi Nọ ná Nsogbu

Gịnị na-emebi ọbụbụenyi dị mma? Nye Sandra, nsogbu malitere mgbe enyi ya bụ́ Megan naara ya otu n’ime uwe elu ahụ ya kasị amasị ya. “Mgbe o weghachiri ya,” ka Sandra na-ekwu, “o ruwo unyi, o nwekwara ebe ọ dọkatụrụ adọka n’aka ya. O kwutedịghị ihe banyere ya, dị ka a ga-asị na mụ agaghị achọpụta.” Olee mmetụta Sandra nwere banyere omume enweghị nchebara echiche nke Megan? “Ọ gbara m ara,” ka ọ na-ekwu. “Ọ dị m ka ọ bụ na o nweghị nkwanye ùgwù maka ihe m . . . ma ọ bụ mmetụta m.”

A pụkwara imejọ gị ma ọ bụrụ na ezigbo enyi gị emee ma ọ bụ kwuo ihe mechuru gị ihu. Nke a mere Cindy mgbe ọ gwara ìgwè ụmụ akwụkwọ ibe ya na ya agụbeghị akwụkwọ ya ga-ede akụkọ banyere ya. Na mberede, enyi ya bụ́ Kate malitere ịbara ya mba. “O menyere m ihere n’ihu ìgwè ndị enyi anyị,” ka Cindy na-echeta. “Ewesara m ya oké iwe. N’ezie, ihe gbanwere mgbe nke ahụ gasịrị.”

Mgbe ụfọdụ a na-enwe nkewa mgbe otu enyi malitere ịnọnyere ndị enyi ọhụrụ. “Enwere m ezigbo enyi ghọrọ onye òtù nke otu ìgwè,” ka Bonnie dị afọ 13 na-ekwu. “Ọ malitere ileghara m anya.” Ma ọ bụkwanụ ọ pụrụ ịbụ na ị malitere ịchọpụta ebumnobi na-ezighị ezi ná mkpakọrịta nke otu enyi gị. “Mụ na Bobby bụ nnọọ ezigbo enyi,” ka Joe, dị afọ 13 na-ekwu. “Echere m na o nwere mmasị n’ebe m nọ n’ihi ụdị mmadụ m bụ, ma achọpụtara m na o nwere mmasị n’ebe m nọ n’ihi na papa m na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-akpọsa ngwá ahịa nakwa na ọ pụrụ inweta ezigbo tiketi maka egwuregwu na ihe nkiri mgbe ọ bụla.” Olee mmetụta Joe nwere ugbu a? “M gaghị atụkwasị Bobby obi ọzọ ma ọlị!” ka ọ na-ekwu.

N’ọnọdụ ụfọdụ enyi gị pụrụ ikpughere ndị ọzọ ihe ọmụma ị chọrọ ka a ghara ikpughe. Dị ka ihe atụ, Allison gwara enyi ya bụ́ Sara banyere nsogbu onwe onye nke otu onye ọrụ ha nwere. N’echi ya Sara welitere okwu ahụ kpọmkwem n’ihu onye ọrụ ahụ. “Echetụbeghị m n’echiche na ọ ga-abụ onye ekwurekwu otú a!” ka Allison na-ekwu. “O wutere m nke ukwuu.” Rachel, dị afọ 16 nwekwara ahụmahụ yiri nke ahụ mgbe otu ezigbo enyi ya kpughere ihe ha abụọ kparịtara na nzuzo. “O mechuru m ihu ma mebie ntụkwasị obi m nwere n’ebe ọ nọ,” ka Rachel na-ekwu. “Echere m n’obi m sị, ‘Olee nnọọ otú m pụrụ isi kọọrọ ya ihe nzuzo ọzọ?’”

Ọbụbụenyi pụrụ ịbụ isi iyi nke nkwado mmetụta uche, karịsịa mgbe e nwekọrọ mmetụta nke nlekọta, ntụkwasị obi, na nkwanye ùgwù. Ma, ọbụna ọbụbụenyi ndị chiri anya pụrụ inwe oge nsogbu. Bible kwuru hoo haa, sị: “E nwere ndị enyi na-achọkarị itipịasị ibe ha iberibe iberibe.” (Ilu 18:24, NW) N’agbanyeghị ihe kpatara ya, ọ pụrụ ịgbawa obi mgbe i nwere mmetụta na enyi gị emebiwo ntụkwasị obi i nwere n’ebe ọ nọ. N’ihi gịnị ka nke a ji eme?

Ihe Mere Ọbụbụenyi Ji Ada

Ọ dịghị mmekọrịta ụmụ mmadụ ọ bụla—ma ọ bụ nke ndị ntorobịa ma ọ bụ nke ndị meworo okenye—na-enweghị nsogbu. E kwuwerị, ọ bụ nnọọ dị ka onye Kraịst na-eso ụzọ bụ́ Jemes dere: “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè, bụrụkwa onye pụrụ ịkwa ahụ ya dum nga.” (Jemes 3:2; 1 Jọn 1:8) Ebe ọ bụ na mmadụ nile na-emehie ihe, ọ bụ ihe a na-aghaghị ịtụ anya ya na otu ụbọchị enyi gị ga-eme ma ọ bụ kwuo ihe ga-ewute gị. Ị pụrụ ọbụna icheta otu oge mgbe i mekwara ihe wutere onye ahụ. (Eklisiastis 7:22) “Anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, mgbe ụfọdụ anyị na-eme ihe na-ewute ibe anyị,” ka Lisa dị afọ 20 na-ekwu.

E wezụga ezughị okè mmadụ, e nwere ihe ndị ọzọ pụrụ ịkpata ya. Cheta na ka ị na-eto ma na-etozu okè, ihe ndị na-amasị gị—tinyere ndị nke ndị enyi gị—yiri ka ha ga na-agbanwe. N’ihi ya, mmadụ abụọ na-emekọtabu nnọọ ihe ọnụ pụrụ ịchọpụta na ihe na-amasị ha na echiche ha ji nnọọ nwayọọ nwayọọ na-adịwanye iche. Otu onye nọ n’afọ iri na ụma kwara arịrị banyere ezigbo enyi ya, sị: “Anyị adịghị akpọ onwe anyị na telifon ọtụtụ mgbe, ma mgbe anyị kwurịtara okwu, ọ na-esikwa ike anyị ekwekọrịta n’ihe ọ bụla.”

N’ezie, ọ bụ otu ihe itolite na-enwe echiche dịgasị iche. Ma n’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ji emejọ enyi ha? Ọtụtụ mgbe ọ bụ ekworo na-akpata ya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na enyi gị malitere iwesa gị iwe n’ihi nkà gị na ihe ndị ị rụzuru. (Tụlee Jenesis 37:4; 1 Samuel 18:7-9.) Dị ka Bible na-ekwu, “ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ.” (Ilu 14:30) Ọ na-akpata anyaụfụ na nkewa. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na enyi gị emejọọ gị?

Imezi Ihe

“Nke mbụ,” ka Rachel na-ekwu, “m ga-eji nlezianya nyochaa onye ahụ ma gbalịa ịchọpụta ma ọ kpachaara anya mee ihe o mere.” Mgbe e kwuru ma ọ bụ mee ihe i chere na ọ bụ mkparị nye gị, emeghachila omume na-adabere ná mmetụta uche i nwere mgbe ahụ. Kama nke ahụ, nwee ndidi ma chebara okwu ahụ echiche. (Ilu 14:29) Gị imeghachi omume n’iwe n’ihe ahụ i chere na ọ bụ mkparị ọ̀ ga-eme ka ọnọdụ ahụ ka mma n’ezie? Mgbe ị tụlesịrị okwu ahụ, ị pụrụ ịhọrọ ịgbaso ndụmọdụ nke Abụ Ọma 4:4: “Maanụ jijiji, emehiekwala: sinụ otú a n’obi unu n’elu ihe ndina unu, wee dere duu.” Mgbe ahụ ị pụrụ ịhọrọ ikwe ka ‘ịhụnanya kpuchie ọtụtụ mmehie.’—1 Pita 4:8.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na i chee na ị pụghị iwepụ omume mkpasu iwe ahụ n’obi gị? N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịkasị mma ijekwuru onye ahụ. “Nanị unu abụọ nọkọta ọnụ, meekwanụ ka ihe merenụ doo anya,” ka Frank dị afọ 13 na-ekwu. “Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, ị ga-ebu iwe n’obi.” Susan, dị afọ 16, nwekwara mmetụta yiri nke ahụ. “Ihe kasị mma ime,” ka ọ na-ekwu, “bụ ịgwa ha na ị tụkwasịrị ha obi ma na ha mechuru gị ihu.” Jacqueline họkwaara ime ihe banyere okwu ahụ n’onwe ya. “Ana m agbalị ikwu banyere ya hoo haa,” ka ọ na-ekwu. “Dị ka ọ na-adịkarị, onye ahụ ga-agwa gị eziokwu, unu pụkwara idozi nsogbu ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ.”

N’ezie, i kwesịrị ilezi anya ka ị ghara iji ọnụma jekwuru enyi gị. Bible na-ekwu sị: “Onye ọnụma na-akpali iseokwu: ma onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka ịlụ ọgụ dị jụụ.” (Ilu 15:18) Ya mere, chere ruo mgbe iwe gị dajụrụ tupu ị chọwa idozi ọnọdụ ahụ. “Ọ ga-agba gị ara na mbụ,” ka Lisa na-ekweta, “ma i kwesịrị ichere ruo mgbe obi gị dajụrụ. Chere ruo mgbe iwe gị na-adịghị ọkụ megide onye ahụ. Mgbe ahụ ị pụrụ ijekwuru onye ahụ, unu anọdụkwa ala kwurịta banyere okwu ahụ n’udo.”

Okwu bụ́ isi bụ “n’udo.” Cheta, nzube gị abụghị ịgwakasị enyi gị okwu ahụ. Ọ bụ iji obiọma dozie okwu ahụ, ọ bụrụkwa na ọ pụrụ ikwe mee, ịmaliteghachi ọbụbụenyi ahụ. (Abụ Ọma 34:14) Ya mere kwuo okwu site n’obi. “Ị pụrụ ịsị, ‘Abụ m enyi gị, gị onwe gị bụkwa enyi m; ma ọ dị m nnọọ mkpa ịmara ihe merenụ,’” ka Lisa na-atụ aro ya. “Ọ dị gị mkpa ịmara ihe kpatara omume ahụ. Ozugbo ị matara ya, ọ gaghịzi esi ike idozi nsogbu ahụ.”

Ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi n’ezie ịnwa imegwara, ikekwe site n’ịgba asịrị banyere onye ahụ ma gbalịa ime ka ndị ọzọ dunyere gị úkwù. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi degaara ndị Rom akwụkwọ, sị: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17) N’ezie, n’agbanyeghị ókè ihe ahụ wuteruru gị, imegwara ga-eme ka ihe ka njọ. “Ịbọ ọbọ ekwesịghị ekwesị,” ka Nora na-ekwu, “n’ihi na unu agaghị abụkwa enyi ọzọ.” N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ gbakwụnyere na ime ihe i nwere ike ime iji dozie mmekọrịta ahụ “na-eme ka i nwee mmetụta nke ịbụ ezigbo mmadụ.”

Ma gịnị ma ọ bụrụ na enyi gị anabataghị mgbalị ị na-eme ka unu kpezie? N’ọnọdụ dị otú ahụ, cheta na ọbụbụenyi na-adị n’ụdị dịgasị iche. “Ọ bụghị enyi nile ga-abụ ezigbo enyi,” ka Judith McCleese bụ́ onye ndụmọdụ ezinụlọ na-ekwu. “Ghọta na ị pụrụ inwe ụdị enyi dịgasị iche.” Ma, ị pụrụ inweta nkasi obi n’eziokwu ahụ bụ́ na i mewo òkè gị iweghachi udo. Pọl onyeozi dere, sị: “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu ha, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Rom 12:18.

Nsogbu ga-adị ọbụna n’etiti ndị bụ ezigbo enyi. Ọ bụrụ na ị pụrụ ịnagide nsogbu ahụ n’ekweghị ka o mebie otú i si ele ndị ọzọ anya ma ọ bụkwanụ ùgwù onwe onye gị, ị gaje ịghọ onye toworo eto nke tozuru okè. N’agbanyeghị na ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị “na-achọkarị itipịasị ibe ha iberibe iberibe,” Bible na-emesi anyị obi ike na “e nwere enyi na-arapara n’ahụ karị nwanne.”—Ilu 18:24, NW.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ị pụrụ ịmaliteghachi ọbụbụenyi site n’ikwurịta ihe merenụ