“O Kwesịrị Ịbụ n’Ebe Chineke Nọ Ka M Tụkwasịrị Obi”
“O Kwesịrị Ịbụ n’Ebe Chineke Nọ Ka M Tụkwasịrị Obi”
A hapụrụ akwụkwọ ozi na-esonụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị na Edmonton, Alberta, Canada.
“Ezi Onye Ozi:
“Ana m ede akwụkwọ ozi a iji kelee onye ahụ pụrụ ịbụ na ọ maghị ama rụọ ọrụ dị ịtụnaya ná ndụ m.
“Izu ole na ole gara aga, mụ na di m nọ na-arụ ụka kpụ ọkụ n’ọnụ. M ka kwusịrị okwu ndị bụ́, ‘Ihe a esiwo ike nke na amaghị m n’ezie ma m pụrụ ịnagide ya.’ Ozugbo ahụ a kụrụ mgbịrịmgba ọnụ ụzọ. Ugbu a otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ n’ọnụ ụzọ m, enwekwaghị m ohere izo.
“Mgbe m mepere ụzọ, enwere m uche mgbasasị dị ukwuu n’ezie nke na apụghị m ịnụ ihe ọ na-ekwu. Echetara m okwu ndị bụ́ ‘ụmụaka’ na ‘ezinụlọ.’ Nwoke ahụ wepụtara otu akwụkwọ a na-akpọ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Mgbe m hụrụ isiokwu ya, amalitere m nnọọ ibe ákwá, apụghịkwa m ịkwụsị. O lelitere anya elu, ma rịọ m mgbaghara maka inye m nsogbu, o nyere m akwụkwọ ahụ, ma pụọ.
“Gịnị bụ ihe ịtụnanya ahụ? Ọ bụ ncheta e chetaara m na mgbe m na-amaghị ihe m ga-eme, na mụ ekwesịghị inye onwe m nsogbu n’ihi na Chineke maara. O kwesịrị ịbụ n’ebe Chineke nọ ka m tụkwasịrị obi. Ọbụna O zitere onye ozi. I meela.”
Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ pụrụ ịbara onye òtù ezinụlọ ọ bụla uru. Isiokwu ya ndị na-akụzi ihe gụnyere “Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi,” “Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Gị,” na “Ị Pụrụ Imeri Nsogbu Ndị Na-ebibi Ezinụlọ.”
Iji nweta akwụkwọ nke gị, biko dejupụta ma zite mpempe akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e depụtara na ya ma ọ bụkwanụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 nke magazin a. Ị ga-enweta aro ndị a kapịrị ọnụ pụrụ inyere gị aka idozi nsogbu dị iche iche ma mee ka ndụ ezinụlọ gị bụrụ nke obi ụtọ nke Onye Okike chọrọ ka ọ bụrụ.
□ Ziterenụ m otu akwụkwọ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Kwuo asụsụ nke ọ bụ.
□ Biko Kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.