Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya E Ji n’Aka

Olileanya E Ji n’Aka

Olileanya E Ji n’Aka

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, a mara Jisọs, bụ́ onye a na-akpọkarị nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ, ikpe ọnwụ n’ụzọ na-ezighị ezi. Ka ọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ, otu onye mmebi iwu nọ n’elu osisi n’akụkụ ya kwuru n’ụzọ ịkwa emo, sị: “Gị onwe gị àbụghị Kraịst ahụ? Zọpụta Onwe gị na anyị.”

Mgbe ahụ, onye mmebi iwu ọzọ bụ́ onye a chọkwara igbu baara nwoke ahụ mba, sị: “Gị onwe gị àdịghị atụ egwu ọbụna Chineke, ebe ị nọ n’ọmụma ikpe ahụ? N’eziokwu a makwara anyị ikpe ziri ezi; n’ihi na anyị na-anata ihe kwesịrị ihe anyị mere: ma ọ dịghị ihe ọ bụla Onye a mehiere.” Mgbe ahụ o chigharịkwuuru Jisọs ma rịọ ya, sị: “Cheta m mgbe ọ bụla Ị ga-abịa n’alaeze Gị.”

Jisọs zaghachiri, sị: ‘N’ezie asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.’—Luk 23:39-43.

Jisọs nwere olileanya dị ebube e debere ya n’ihu. Pọl onyeozi kwuru mmetụta olileanya a nwere n’ahụ Jisọs, sị: “Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-elelị ihere anya.”—Ndị Hibru 12:2.

Ihe so ‘n’ọṅụ’ ahụ e debere n’ihu Jisọs bụ isoro Nna ya biri ọzọ n’eluigwe na imesị bụrụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke. Ọzọkwa, ọ ga-enwekwa ọṅụ nke ịnabata ụmụazụ ya n’eluigwe, bụ́ ndị ọ nwapụtara ma tụkwasị obi, ndị ga-esoro ya chịa dị ka ndị eze n’elu ụwa. (Jọn 14:2, 3; Ndị Filipaị 2:7-11; Mkpughe 20:5, 6) Mgbe ahụ, gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwere onye mmebi iwu ahụ nwere nchegharị nkwa na ọ ga-anọ na Paradaịs?

Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Onye Mmebi Iwu Ahụ?

Nwoke ahụ erughị eru isoro Jisọs chịa n’eluigwe. O soghị ná ndị ahụ Jisọs gwara, sị: “Unu onwe unu bụ ndị soworo m n’ọnwụnwa m nile; Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m.” (Luk 22:28, 29) Ma, Jisọs kwere nkwa na ya na onye mmebi iwu ahụ ga-anọ na Paradaịs. Olee otú a ga-esi mezuo nkwa ahụ?

Jehova Chineke debere nwoke na nwanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, na Paradaịs, bụ́ ubi ihe ụtọ a kpọrọ Iden. (Jenesis 2:8, 15) Ọ bụ n’ụwa ka Iden dị, Chineke zubekwara ka ụwa dum ghọọ Paradaịs. Otú ọ dị, Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, a chụpụkwara ha n’ebe obibi ha mara mma. (Jenesis 3:23, 24) Ma Jisọs kpughere na a ga-eweghachi Paradaịs nakwa na ọ ga-ezu ụwa nile.

Mgbe Pita onyeozi jụrụ Jisọs ihe ga-abụ ụgwọ ọrụ ya na ndị ozi ibe ya maka iso ya, Jisọs kwere nkwa, sị: “Unu onwe unu ndị soro m, n’ịmụ ọzọ ahụ, mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya, unu onwe unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Matiu 19:27, 28, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ụzọ dị ịrịba ama, n’ihe ndekọ Luk nke mkparịta ụka a, kama ikwu “n’ịmụ ọzọ ahụ,” e hotara Jisọs dị ka onye na-ekwu, sị “n’oge nke na-abịa.”—Luk 18:28-30.

N’ihi ya, mgbe Jisọs Kraịst nọdụrụ n’ocheeze ya dị ebube n’eluigwe, ya na ndị ga-eso ya chịa, ọ ga-eguzobe usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume. (2 Timoti 2:11, 12; Mkpughe 5:10; 14:1, 3) Site n’ọchịchị eluigwe nke Kraịst, a ga-emezu nzube mbụ nke Chineke maka ụwa dum ịghọ Paradaịs!

N’oge ọchịchị Alaeze a, Jisọs ga-emezu nkwa o kwere omempụ ahụ nwụrụ n’akụkụ ya. Ọ ga-akpọlite ya, nwoke ahụ ga-abụkwa onye Jisọs ga-achị n’elu ụwa. A ga-enyezi onye mmebi iwu ahụ ohere ime ihe Chineke na-achọ ma dịrị ndụ ebighị ebi n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ. N’ezie anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’atụmanya dabeere na Bible nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs n’elu ala!

Ndụ Pụrụ Inwe Nzube

Cheedị banyere nzube nke olileanya dị ebube dị otú ahụ pụrụ ime ka ndụ anyị nwee. Ọ pụrụ inye aka chebe uche anyị pụọ n’ihe ndị na-esi n’echiche na-ezighị ezi apụta. Pọl onyeozi jiri olileanya ahụ tụnyere ihe agha ime mmụọ dị mkpa. O kwuru na anyị aghaghị ikpukwasị “ile anya nzọpụta” dị ka “okpu agha.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:8; Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.

Olileanya ahụ na-akwagide mmadụ. Na Paradaịs ahụ na-abịanụ, anya mmiri ọṅụ nke ga-agbanụ ka “Chineke Onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie” na-akpọghachi ndị a hụrụ n’anya ná ndụ, ga-anọchi anya owu ọmụma. (2 Ndị Kọrint 1:9) Mgbe ahụ a ga-echezọ nkụda mmụọ nke adịghị ike anụ ahụ, ihe mgbu, na ịnọrọ otu ebe na-akpata, n’ihi na “onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele.” “Anụ ahụ [mmadụ] ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata,” ‘ọ ga-alaghachirukwa ụbọchị okorobịa ya.’—Aịsaịa 35:6; Job 33:25.

N’oge ahụ, mgbe “onye obibi ya na-agaghị asị, Ana m arịa ọrịa,” obi nkoropụ nke ọrịa na-ekweghị ala ala na-akpata ga-abụ ihe a na-agaghị echeta. (Aịsaịa 33:24) A ga-eme ka ịtọgbọrọ chakoo nke oké ịda mbà n’obi na-akpata ghọọ “ọṅụ ebighị ebi.” (Aịsaịa 35:10) Enweghị olileanya n’ihi ọrịa ga-egbu mmadụ, tinyere ọnwụ n’onwe ya, bụ́ onye iro ochie nke ihe a kpọrọ mmadụ, agakwaghị adị.—1 Ndị Kọrint 15:26.

[Foto ndị dị na peeji nke 23, 24]

Buru nnọọ olileanya dị ebube nke ụwa ọhụrụ Chineke n’uche