Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peji nke 27. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee mbipụta bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. Olee ebe Ala Nkwa ahụ jedebere n’ebe ugwu, bụkwa ebe kasị elu na gburugburu Palestine? (Joshua 12:1)

2. Àgwà dị aṅaa Jehova nwere na nke a chọrọ ka ụmụ mmadụ nwee bụ nke na-adịghị egosi adịghị ike? (Abụ Ọma 18:35)

3. Ndị agha Asiria ole ka mmụọ ozi Jehova tigburu n’otu abalị? (2 Ndị Eze 19:35)

4. Ònye ji mmanụ otite dị oké ọnụ ahịa tee ụkwụ Jisọs ma jiri agịrị isi ya hichaa ụkwụ Ya? (Jọn 12:3)

5. Gịnị bụ aha ndị inyom Hibru na-ele ime bụ́ ndị hapụrụ iwu Fero nyere ka e gbuo ụmụ ọhụrụ bụ́ nwoke ma bụrụzie ndị Jehova gọziri ha na ezinụlọ ha? (Ọpụpụ 1:15-21)

6. Olee eze Juda, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ o mere ihe ọjọọ n’ime afọ 41 nke ọchịchị ya, e lere anya dị ka otu n’ime ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi? (1 Ndị Eze 15:14, 18)

7. N’amụma mweghachi, olee anụmanụ e kwuru na ọ “ga-ata ahịhịa dị ka ehi”? (Aịsaịa 65:25)

8. N’ihi gịnị ka ndị ikom nile nke Sọdọm, site n’ụmụaka ruo ná ndị agadi, ji gbaa ụlọ Lọt gburugburu? (Jenesis 19:4, 5)

9. N’ịza ekpere Samuel, gịnị ka Jehova ji mee ka ndị Filistia banye n’ọgba aghara, nke mere e ji merie ha? (1 Samuel 7:9, 10)

10. Gịnị ka Mosis gwara Fero mere ọ ga-eji zipụ ụmụ Israel? (Ọpụpụ 5:1)

11. Olee osisi na-amị mkpụrụ nke a na-ejikarị alaka ya eme ihe dị ka ihe nnọchianya nke udo? (Lee Aịsaịa 17:6.)

12. N’ime akwụkwọ Bible ise Jọn dere, olee nke o buru ụzọ dee?

13. Ònye ka Ilu kwuru na ọ bụ “okpueze di ya”? (Ilu 12:4)

14. Olee onye na-ekweghị ka Eze Devid kwụghachi ya ụgwọ n’ihi na ọ gbara afọ 80, n’agbanyeghị na o ruuru ya? (2 Samuel 19:31-36)

15. Ụzọ ole, nke bụ́ ihe atụ, n’ime ndị mmụọ ozi ka e kwuru na Setan duhiere? (Mkpughe 12:4)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ugwu Heamọn

2. Umeala n’obi

3. 185,000

4. Meri, nwanne Mata na Lazarọs

5. Shifra na Pua

6. Esa

7. Ọdụm

8. Ha chọrọ idina ndị mmụọ ozi bịara na nke ya n’ike

9. Égbè eluigwe

10. Ka ha wee meere Jehova ememe n’ọzara

11. Osisi olive

12. Mkpughe

13. “Nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma”

14. Bazilaị, bụ́ onye Gilead si Rogelim

15. Otu ụzọ n’ụzọ atọ