Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Ziri Ezi Ife Jisọs Ofufe?

Ò Ziri Ezi Ife Jisọs Ofufe?

Echiche nke Bible

Ò Ziri Ezi Ife Jisọs Ofufe?

KEMGBE ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm efewo Jisọs Kraịst ofufe dị ka a ga-asị na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Otú ọ dị, Jisọs n’onwe ya dọọrọ uche na ofufe gaa nanị n’ebe Jehova Chineke nọ. Dị ka ihe atụ, mgbe a gwara ya ka o meere Ekwensu omume ofufe, Jisọs kwuru, sị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:10) Mgbe e mesịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu Onye bụ Nna unu, Ya bụ Onye nke eluigwe.”—Matiu 23:9.

Jisọs kọwaara nwanyị Sameria ụdị ofufe ndị mmadụ na-aghaghị ife Chineke. Ofufe ha aghaghị ịdabere na mmụọ na n’eziokwu. N’ezie, “ndị dị otú ahụ ka Nna [ahụ] na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.” (Jọn 4:23, 24) Ee, ọ bụ nanị Chineke ka e kwesịrị ife ofufe. Ife onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ga-abụ ikpere arụsị, bụ́ nke a katọrọ ma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma na nke Grik.—Ọpụpụ 20:4, 5; Ndị Galetia 5:19, 20.

Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka, sị, ‘ma, ọ̀ bụ na Bible adịghị egosi na anyị aghaghịkwa ife Jisọs? Ọ̀ bụ na Pọl ekwughị ná Ndị Hibru 1:6, sị: “Ka ndị mmụọ ozi nile nke Chineke fee [Jisọs]”?’ (King James Version) Olee otú anyị pụrụ isi ghọta akụkụ akwụkwọ nsọ a na-eburu ihe Bible na-ekwu banyere ikpere arụsị n’uche?

Ofufe E Dekọrọ na Bible

Nke mbụ, anyị aghaghị ịghọta ihe Pọl bu n’uche n’ebe a mgbe o kwuru banyere ofufe. O ji okwu Grik bụ́ pro·sky·neʹo mee ihe. Unger’s Bible Dictionary na-ekwu na okwu a pụtara n’ụzọ nkịtị ‘isusu aka mmadụ ọnụ iji gosi nsọpụrụ ma ọ bụ nkwanye ùgwù.’ An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere, na-ekwu na okwu a “na-egosi inye nsọpụrụ, ma è nyere ya mmadụ . . . ma ọ bụ Chineke.” N’oge Bible pro·sky·neʹo na-agụnyekarị n’ụzọ nkịtị ihulata isi n’ihu onye ọkwá ya dị elu.

Tụlee ilu Jisọs tụrụ banyere otu ohu na-enweghị ike ịkwụghachi nna ya ukwu ego buru ibu. Ụdị okwu Grik a dị n’ilu a, n’ịsụgharikwa ya King James Version na-ekwu, “ya mere ohu ahụ dara n’ala, kpọọkwa isiala [ụdị nke pro·sky·neʹo] nye ya [eze ahụ], sị, Onyenwe m, nweere m ndidi, m ga-akwụchakwa gị ihe nile.” (Matiu 18:26, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Nwoke a ò mere omume ikpere arụsị? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ na-egosipụta ụdị nsọpụrụ na ùgwù dịịrị eze, nna ya ukwu na onye ka ya ukwuu.

A na-ahụkarị ụdị ihulata isi, ma ọ bụ ùgwù dị otú ahụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge Bible. Jekọb kpọrọ isiala ugboro asaa mgbe o zutere nwanne ya nwoke, bụ́ Isọ. (Jenesis 33:3) Ụmụnne Josef kpọọrọ ya isiala, ma ọ bụ hulatara ya isi n’ihi ọkwá o nwere n’ọchịchị Ijipt. (Jenesis 42:6) N’ihi ihe a nile, anyị pụrụ ịghọtakwu nke ọma ihe mere mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando hụrụ nwata ahụ bụ́ Jisọs, bụ́ onye ha matara dị ka “Onye a mụrụ ịbụ Eze Ndị Juu.” Dị ka e si dee ya na King James Version, ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị na ha “dara n’ala, kpọọkwa isiala [ pro·sky·neʹo] nye ya.”—Matiu 2:2, 11.

Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, okwu ahụ bụ́ pro·sky·neʹo, nke a sụgharịrị “ife ofufe” ná nsụgharị ụfọdụ nke Bible, abụghị nanị maka ụdị ofufe dịịrị Jehova Chineke. Ọ pụru izo aka ná nkwanye ùgwù na nsọpụru e nyere onye ọzọ. Ná mgbalị ime ka a ghara inwe nghọtahie ọ bụla, ụfọdụ nsụgharị Bible sụgharịrị okwu ahụ bụ́ pro·sky·neʹo dị ná Ndị Hibru 1:6 dị ka “ịkwanyere ya ùgwù” (New Jerusalem Bible), “ịsọpụrụ ya” (The Complete Bible in Modern English), “ịkpọ isiala n’ihu ya” (Twentieth Century New Testament), ma ọ bụ “ihulatara ya isi” (New World Translation).

Jisọs Ruru Ka E Hulatara Ya Isi

Jisọs ò ruru ka e hulatara ya isi dị otú ahụ? Eenụ! N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, Pọl onyeozi kọwara na dị ka “onye nketa nke ihe nile,” Jisọs ‘anọdụwo n’aka nri nke Ịdị ukwuu ahụ dị n’elu.’ (Ndị Hibru 1:2–4) Ya mere, “n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala, ka ire nile ọ bụla wee kwupụtakwa na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.”—Ndị Filipaị 2:10, 11.

N’ụzọ pụtara ìhè, n’oge na-adịghị anya Kraịst ga-eji ọkwá a dị elu na ike na-enweghị atụ ya na ya na-agakọ gbanwee ụwa a ịbụ paradaịs zuru ụwa ọnụ. Ná ntụziaka Chineke nakwa n’ihi àjà mgbapụta Jisọs, ọ ga-ekpochapụ mwute, ihe mgbu, na iru újú nile n’ụwa maka abamuru nke ndị na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi ezi omume ya. Ya mere, ọ̀ bụ na o rughị eru anyị ịsọpụrụ ya, kwanyere ya ùgwù, rubekwara ya isi?—Abụ Ọma 2:12; Aịsaịa 9:6; Luk 23:43; Mkpughe 21:3, 4.

“Chineke nke Na-achọ Ka E Fee Nanị Ya”

Otú ọ dị, Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na ofufe anyị—n’echiche nke nsọpụrụ ofufe—aghaghị ịbụ nanị nye Chineke. Mosis kọwara ya dị ka “Chineke nke na-achọ ka e fee nanị Ya.” Bible na-adụkwa anyị ọdụ ‘ịkpọ isiala nye Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri na isi iyi nile nke mmiri nile.’—Deuterọnọmi 4:24, NW; Mkpughe 14:7.

N’ezie Jisọs, bụ́ onye nsọpụrụ na nkwanye ùgwù ruuru, na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’ezi ofufe. (2 Ndị Kọrint 1:20, 21; 1 Timoti 2:5) Ọ bụ nanị ya bụ ụzọ anyị pụrụ isi gakwuru Jehova Chineke. (Jọn 14:6) N’ihi ya, ezi ndị Kraịst ga-eme nke ọma ife nanị Jehova Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.