Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

April 19, 2000—Ụbọchị A Ga-echeta

April 19, 2000—Ụbọchị A Ga-echeta

April 19, 2000—Ụbọchị A Ga-echeta

N’UHURUCHI ahụ tupu ọ nwụọ, Jisọs guzobere ememe ncheta ọnwụ ya. Ọ bụ ntakịrị oriri. N’oge ahụ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.

N’afọ a, ememe mgbaafọ nke ihe omume a dabara na Wednesday April 19, mgbe anyanwụ dasịrị.

N’ihi ya, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga-ezukọ n’abalị a pụrụ iche ime Ememe Ncheta a n’ụzọ Jisọs si chọọ ka e mee ya. E ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù isonyere ha dị ka onye nkiri. Biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu maka kpọmkwem oge na ebe a ga-anọ nwee nzukọ ahụ.