E Kwetaziela na E Nwere Okpukpe Ekweghị Ọzọ Dịrị
E Kwetaziela na E Nwere Okpukpe Ekweghị Ọzọ Dịrị
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN
ISI akụkọ dị na Catholic Herald Britain nke December 11, 1998 na-asị, “Ndị Bishọp Akwaa Ụta n’Ihi ‘Oké Mpụ’ nke Eze Nwanyị Mary.” Ndị bishọp Roman Katọlik nke England na Wales kwetara na “e mewo oké ihe ọjọọ n’aha okpukpe Katọlik, dị ka ihe atụ megide ndị Protestant n’oge Ndozigharị ahụ e nwere na Great Britain.” Ònye bụ Eze Nwanyị Mary? Olee ihe ọjọọ ndị o mere kpatara e ji mee nkweta dị otú ahụ? Gịnị mekwara ndị bishọp nke England na Wales ji họrọ oge a iji mee nkwupụta ha?
A mụrụ Mary Tudor na 1516 n’England nke ndị Roman Katọlik mejupụtara. Nanị nwa fọdụrụ ndụ Catherine nke Aragon, bụ́ nwunye mbụ nke Eze Henry nke Asatọ nwere, nne Mary zụlitere ya dị ka ezigbo onye Katọlik. Nna ya chọrọ nwa nwoke ga-anọchi ya, ma Catherine amụtaghị nwa nwoke. Ebe popu jụrụ ịkagbu alụmdi na nwunye ya na Catherine, Henry mere ihe n’onwe ya, si otú a na-emeghe ụzọ maka Ndozigharị Okpukpe Protestant n’England. Na 1533 ọ lụrụ Anne Boleyn, ọnwa anọ tupu Achịbishọp nke Canterbury, bụ́ Thomas Cranmer, akagbuo alụmdi na nwunye mbụ nke Henry.
N’afọ na-esonụ Henry ahụ jụrụ irube isi kwụsịrị nkekọ nile nke
ya na Rom, e mekwara ya onyeisi nke Chọọchị England. Mary, bụ́ onye a na-ele anya ugbu a dị ka nwa na-enwekwaghị ọnọdụ n’ezinụlọ ahụ, ahụghịzi nne ya anya ọzọ, ebe a manyere Catherine ibi ndụ ya fọrọnụ n’ebe ndị mmadụ na-agaghị ahụ ya anya.Okpukpe Ekweghị Ọzọ Dịrị nke Protestant
N’afọ 13 sochirinụ, e gburu ụfọdụ ndị jụrụ ịnabata Henry dị ka onyeisi chọọchị ma ọ bụ ndị ka nakweere ikike nke popu. Henry nwụrụ na 1547, Edward dị afọ itoolu nọchiri ya, bụ́ nanị nwa nwoke ezigbo nwunye ya nke atọ n’etiti nwanyị isii ya mụụrụ ya. Edward na ndị ndụmọdụ ya nwara ime England mba okpukpe Protestant. A kpagburu ndị Roman Katọlik n’ihi ikpe okpukpe ha, a napụkwara chọọchị dị iche iche ihe onyinyo na ọlta ha.
N’oge na-adịghị anya, e wepụrụ mgbochi e gbochiri ibipụta na ịgụ Bible na Bekee, okwuchukwu a na-ekwu na chọọchị nke gụnyere ịgụ Bible ga-abụ na Bekee kama ịbụ na Latin. Ma na 1553, ụkwara nta gburu Edward mgbe ọ dị nanị afọ 15. E lere Mary anya ịbụ onye ruru eru ịnọchi n’ocheeze, ọ ghọkwara eze nwanyị nke England.
Okpukpe Ekweghị Ọzọ Dịrị nke Katọlik
Na mbụ, ndị mmadụ nabatara Mary dị afọ 37, ma n’oge na-adịghị anya e nwekwaghị mmasị n’ebe ọ nọ. Okpukpe Protestant amarawo ndị ọ na-achị ahụ, Mary kpebizikwara ime ka mba ahụ ghọghachi nke okpukpe Roman Katọlik. Na nwa oge, a kagburu iwu okpukpe nile nke Edward. Mary rịọrọ mgbaghara popu maka mba ahụ. Ọzọkwa, England ghọrọ mba nke okpukpe Roman Katọlik.
N’aka nke ya, isoro Rom dịghachi n’otu kpaliri mkpagbu ọhụrụ megide ndị Protestant. E ji ha tụnyere etuto dị oké njọ nke a na-aghaghị iwepụ tupu o tokasịa n’ahụ dum. A kpọrọ ọtụtụ ndị jụrụ ịnakwere nkụzi nke Chọọchị Roman Katọlik ọkụ ná ndụ n’elu osisi.
Ntaramahụhụ nke Ndị Jụrụ Okwukwe
Onye mbụ nwụrụ n’oge Mary na-achị bụ John Rogers. O mere nchịkọta nke ihe a maara dị ka Bible nke Matthew, bụ́ nke e si na ya nweta King James Version. Mgbe o kwusịrị okwuchukwu nke na-emegide Roman Katọlik, na-adọ aka ná ntị megide “okpukpe Roman Katọlik dị njọ, ikpere arụsị, na nkwenkwe ụgha,” a tụrụ ya mkpọrọ otu afọ, na February 1555 a kpọrọ ya ọkụ ná ndụ n’ihi ịjụ okwukwe.
A kpọkwara John Hooper, bụ́ bishọp nke Gloucester na Worcester, onye jụrụ okwukwe. O kwupụtara na o ziri ezi n’iwu ka ndị ụkọchukwu lụọ nwanyị nakwa na a ga-anabata ịgba alụkwaghịm n’ihi ịkwa iko. O kwukwara na Kraịst adịghị abịa n’anụ ahụ n’oge Mas. A kpọrọ Hooper ọkụ ná ndụ, ọnwụ ya na-akpata ihe mgbu dịruru minit 45. Mgbe o ruru ka a kpọọ onye ụkọchukwu Protestant dị afọ 70 bụ́ Hugh Latimer ọkụ, o ji okwu a gbaa Nicholas Ridley, bụ́ onye so ya eme Ndozigharị na onye a ga-agbakọ ya na ya ọkụ, ume: “Esogbula onwe gị, Maazi Ridley, mee ka nwoke. Site n’ebere Chineke, taa n’England anyị ga-amụnye ọkụ m ji n’aka na a gaghị emenyụli emenyụ.”
A makwara Thomas Cranmer, bụ́ Achịbishọp Protestant mbụ nke Canterbury n’oge Henry na Edward na-achị, ikpe ọnwụ dị ka onye jụrụ okwukwe. Ọ bụ ezie na o kwuru na ya ekwekwaghị na nkwenkwe ya dị ka onye Protestant, n’ikpeazụ o chegharịrị n’ihu ọha, kwupụta na popu bụ onye iro Kraịst, ma tinye aka nri ya ka ọkụ buru ụzọ gbaa ya, ebe ọ bụ ya ka o ji bịanye n’akwụkwọ o ji jụ nkwenkwe ya.
Ọ bụ ezie na ma ọ dịkarịa ala ndị Protestant 800 a maara aha ha gbalagara obodo ọzọ maka nchebe, n’afọ atọ na ọnwa itoolu sochirinụ ruo mgbe Mary nwụrụ, ọ dịkarịa ala a kpọrọ mmadụ 277 ọkụ n’elu osisi n’England. Ọtụtụ ndị a kpọrọ ọkụ bụ
ndị nkịtị na-amakwaghị nnọọ ihe ha ga-ekwere. Ụmụaka etolitewo na-anụ ka a na-akatọ popu ma bụrụzie ndị a na-ata ahụhụ n’ihi ikwugide ya. Ndị ọzọ amụtawo ịgụ Bible n’onwe ha ma nwee echiche okpukpe nke ha.Ọnwụ na-akpata ihe mgbu nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka bụ́ ndị a na-akpọ ọkụ n’elu osisi wụrụ ọtụtụ mmadụ ibobo n’ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Carolly Erickson na-akọwa, sị: “Ọtụtụ mgbe nkụ a ga-esonye n’ọkụ ahụ adịghị akpọ akpọ, ma ọ bụ akịrịka ndị a ga-eji emenwu ọkụ adị mmiri mmiri inwuru ọkụ ngwa ngwa. Akpa nsí égbè a na-ekedo n’ahụ ndị ahụ a na-agba ọkụ iji gbaa ha ọkụ ngwa ngwa adịghị ekwe ere ọkụ, mgbe ahụzi ọkụ na-erejipụ akụkụ ahụ ha n’egbughị ha egbu.” A dịghị ekechi ha ọnụ, ya mekwara “a na-anụkarị iti mkpu na ekpere ha nke ọma ruo mgbe ha nwụrụ.”
Ọtụtụ ndị mmadụ malitere inwe obi abụọ banyere okpukpe ga-agbarịrị mmadụ ọkụ n’osisi iji mee ka a nakwere ozizi ya. Obi ebere a na-emere ndị a dugara ndị na-agụ akụkọ n’egwú ịrọ̀ abụ banyere ndị Protestant e gburu n’ihi okwukwe ha. John Foxe malitere ịchịkọta akwụkwọ ya bụ́ Book of Martys, nke fọrọ nke nta ka o nwee otu ụdị mmetụta Bible nwere n’ahụ ndị Ndozigharị Protestant. Ọtụtụ ndị bụ́ ndị Roman Katọlik ná mmalite nke ọchịchị Mary ghọrọ ndị Protestant ná njedebe ya.
Ihe Mary Hapụrụ
Mgbe ọ ghọsịrị eze nwanyị, Mary kwuru na ya ga-alụ nwa nwanne mama ya bụ́ Philip, onye ga-anọchi ocheeze Spain. Ọ bụ eze si ala ọzọ na onye kwenyesiri ike na Roman Katọlik, bụ́ ihe ọtụtụ ndị England na-achọghịdị ma ọlị. Ọgba aghara ndị Protestant haziri iji gbochie alụmdi na nwunye ahụ kụrụ afọ n’ala, e gbukwara 100 ndị nnupụisi. Philip na Mary lụrụ na July 25, 1554, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe e chiri Philip eze. Otú ọ dị, alụmdi na nwunye ha a na-amụtaghị nwa na ya wutere Mary, bụ́ onye chọrọ onye Roman Katọlik ga-anọchi ya.
Mary dara ọrịa, mgbe ọchịchị afọ ise ya dị mkpirikpi gasịrị, ọ nwụrụ n’oge ọ dị afọ 42. Obi gbawara ya tupu ọ nwụọ. Ike ya agwụwo di ya, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọ na-achị kpọkwara ya asị. Mgbe ọ nwụrụ, ọtụtụ ndị London mere oriri na ọṅụṅụ n’okporo ámá. Kama iwughachi Okpukpe Roman Katọlik, o jiriwo ịnụbiga ọkụ ókè ya mekwuo ka Okpukpe Protestant gaa n’ihu. A chịkọtara ihe ọ hapụrụ n’aha e jiri mara ya—Mary Na-akwafu Ọbara.
Akọ na Uche A Kpaliri n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
Gịnị mere Mary ji nye iwu ka a kpọọ ọtụtụ ndị mmadụ ọkụ? A kụziworo ya na ndị jụrụ okwukwe bụ ndị na-agba Chineke mgba okpuru, o chekwara na ọ bụ ọrụ ya iwepụ mmetụta ahụ tupu o zuo mba ahụ nile. O gere ntị n’akọ na uche ya ma leghara ihe ruuru ndị ọzọ anya bụ́ ndị akọ na uche ha dugara ime ihe ọzọ.
Otú ọ dị, ndị Protestant ekweghị ka okpukpe ndị ọzọ dịrị n’otu aka ahụ. N’oge ọchịchị Henry na Edward, a kpọkwara ndị mmadụ ọkụ n’ihi nkwenkwe okpukpe ha. Onye Protestant nke nọchiri Mary, bụ́ Elizabeth Mbụ, mere ka isoro Okpukpe Roman Katọlik bụrụ ịda iwu nke na-agụnye ịgba ọchịchị mgba okpuru, n’oge ọ na-achịkwa, e gburu ndị England bụ́ ndị Roman Katọlik karịrị 180. N’ime narị afọ sochirinụ, ọtụtụ narị ndị mmadụ nwụrụ n’ihi echiche okpukpe ha.
Gịnị Mere A Ga-eji Arịọ Mgbaghara Ugbu A?
December 10, 1998 bụ mgbaafọ 50 nke Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu. Akụkụ iwu nke 18 na-anakwere “nnwere onwe ruuru mmadụ nke echiche, akọ na uche na okpukpe,” gụnyere mmadụ inwere onwe ya ịgbanwe okpukpe ya na ịkụzi ya na ibi ndụ kwekọrọ na ya. Ndị bishọp Roman Katọlik nke England na Wales họọrọ mgbaafọ 50 dị ka “oge kwesịrị ekwesị ka ndị Katọlik nyochaa akọ na uche ha n’okwu ndị a” na ịnakwere “oké mpụ” ha mere, karịsịa n’oge Mary Tudor.
Ọ bụ ezie na a kwawo ụta ugbu a banyere omume okpukpe ekweghị ọzọ dịrị ndị e mere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 450 gara aga, ọ̀ dịwo ihe gbanwere n’ezie? A dịkwaghị akpọ ndị mmadụ ọkụ n’elu osisi, ma ọtụtụ ndị sị na ha bụ ndị Kraịst anọgidewo na-edina ndị mmadụ n’ike ma na-egbu ndị okpukpe ọzọ. Okpukpe ekweghị ọzọ dịrị dị otú ahụ adịghị amasị Chineke. N’ezie, Jisọs Kraịst, bụ́ onye na-egosipụta ụdị onye Chineke bụ kpọmkwem, kwupụtara, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:35.
[Foto dị na peeji nke 20]
Eze Nwanyị Mary
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ A Short History of the English People
[Foto dị na peeji nke 21]
A kpọrọ Latimer na Ridley ọkụ n’osisi
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Foxe’s Book of Martyrs
[Foto dị na peeji nke 21]
Cranmer hụrụ na aka nri ya buru ụzọ gbaa ọkụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ The History of England (Mpịakọta 1)
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]
N’akụkụ peji: 200 Decorative Title-Pages/Alexander Nesbitt/Dover Publications, Inc.