Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?

Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?

Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?

Ọ BỤRỤ na i nyochaa ụkpụrụ omume n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ị ga-ahụ omume ọhụrụ pụtara ìhè. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ na-emewanye ihe ndị megidere ụkpụrụ omume. Gịnị ka nke a pụtara n’ezie?

Ọ̀ pụtara, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu, na ọganihu nile anyị nwere na ihe nile a kpọrọ mmadụ na-eche mbibi ihu, na oge a ga-ekpochapụ ha na-eru nso? Ka mgbanwe ndị dị otú ahụ hà bụ nanị akụkụ nke mgbanwe kwesịrị ekwesị a na-enwekarị n’akụkọ ihe mere eme?

Nke ahụ bụ ihe ọtụtụ ndị mmadụ na-eche. Ha na-ele ndakpọ omume nke oge anyị anya dị ka nanị omume ọhụrụ, otu n’ime ọtụtụ ndị biliteworo ma kwụsị n’akụkọ ihe mere eme nile. Atụmanya ha nile bụ na ọnọdụ ahụ ga-emesị gbanwee nakwa na a ga-enweghachi ụkpụrụ omume ndị dị elu. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị?

“Mgbe Ikpeazụ”

Ka anyị tụlee ihe ndị bụ́ eziokwu site n’iji otu akwụkwọ mee ihe bụ́ nke a nakwewooro ruo ọtụtụ narị afọ dị ka o kwusịa o bie n’okwu metụtara omume—Okwu Chineke, bụ́ Bible. Iji ụwa nke taa tụnyere nkọwa amụma nke Bible na-enye banyere oge kasị nwee mmetụta n’akụkọ ihere mere eme mmadụ na-enye ihe ọmụma. Ugbu a bụ oge ọ kpọrọ “mgbe ikpeazụ” ma ọ bụ “ọgwụgwụ oge.” (2 Timoti 3:1; Matiu 24:3) Dị ka okwu ndị a na-egosi, oge a ga-aka ọgwụgwụ nke otu ọgbọ na mmalite nke ọgbọ ọhụrụ akara kpọmkwem.

Okwu Chineke buru amụma na “oge dị oké egwu” ga-aka mgbe ikpeazụ akara. Iji nyere ndị anya na-eru ala aka ịmata mgbe ikpeazụ ahụ, Bible nyere ọtụtụ ihe ọmụma na-enye nkọwa doro anya ma a chịkọta ha, ma ọ bụ ihe ịrịba ama nke ọtụtụ ihe mejupụtara, banyere oge a pụrụ iche.

Àgwà Ọjọọ nke Ụmụ Mmadụ

Rịba otu n’ime akụkụ nke ihe ịrịba ama a bụ́ nke pụtaworo ìhè taa, ama: ‘Mmadụ ga-abụ ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya.’ (2 Timoti 3:2, 5) Ọ dịghị oge ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke e ji ịgbasochi echiche ụwa anya n’ụzọ siri ike otú ahụ mara. A jụwo Chineke n’ọtụtụ ebe dị ka o kwusịa o bie, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ekweghịkwa na ọ bụ nanị Bible bụ isi iyi nke eziokwu. Otú ọ dị, okpukpe dị iche iche ka dị, ma ọtụtụ adịghị enwekebe mmetụta n’ahụ ndị mmadụ. Ha bụ nanị ihe mkpuchi.

Bible kwuru banyere akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama ahụ, sị: “Mmadụ ga-abụ . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa,” nakwa na “n’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.” (2 Timoti 3:2, 3; Matiu 24:12) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “dị ka anụ ọhịa” pụtara, gụnyere ihe ndị ọzọ, “enweghị ọmịiko na obi ebere mmadụ.” Taa obere ụmụaka na-egosiwanye na ha “dị ka anụ ọhịa,” ha na-emekwa mpụ ime ihe ike n’ụzọ na-arị elu.

Ọzọkwa, ọganihu dị ngwa e nwere na nkà na ụzụ na n’akụ̀ na ụba, na anyaukwu ihe ndị a kpatara, emewo ka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-ebuwanye ibu, leghara ụkpụrụ ochie anya. N’echebaraghị ndị ọzọ echiche, ha na-eji ụzọ ọ bụla ha nwere ike iji mee ihe, ọbụna ụzọ emeghị ihe n’eziokwu, enweta ihe ruo n’ókè ha nwere ike iji mejuo ọchịchọ ọdịmma onwe ha nanị. Oké mmụba e nwere n’ịgba chaa chaa bụ ihe ọzọ na-egosi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ọnụ ọgụgụ mpụ e mere n’iri afọ ole na ole gara aga bụ ihe àmà siri ike nakwa nke doro anya e nwere n’ihe banyere nke a.

Akụkụ nke kasị zuo ebe nile n’oge anyị bụ nke a: “Mmadụ ga-abụ . . . ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:2, 4) Otu ihe atụ nke a bụ na ndị mmadụ chọrọ ihe ụtọ anụ ahụ, ma ha achọghị ibu ọrụ nke isoro otu onye òtù ọlụlụ biri n’oge ndụ ha nile. Ihe si na ya apụta abụwo oké ndakpọ mmekọrịta ezinụlọ, ụmụaka na-enweghị obi ụtọ, na-adịghịkwa eso ezinụlọ ha enwe mmekọrịta chiri anya, ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, na ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ.

Akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama ahụ bụ na “mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya.” (2 Timoti 3:2) Dị ka magazin Germany bụ́ Die Zeit si kwuo, “mkpali bụ́ isi nke usoro [akụ̀ na ụba nke taa] bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị.” Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, nchụso nke ego bụ ihe kasị mkpa ná ndụ ọtụtụ ndị mmadụ. Ná nchụso a e ji ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-eme, a na-eleghara ụkpụrụ ndị ọzọ anya.

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

E wezụga ịkọwa ndakpọ nke ụkpụrụ omume mmadụ, Bible bukwara amụma na oké ọgba aghara nke ga-emetụta ezinụlọ mmadụ ga-aka mgbe ikpeazụ akara. Dị ka ihe atụ, o kwuru na “mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ala ọma jijiji ga-adịkwa, oké ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.”—Luk 21:10, 11.

E wezụga narị afọ nke 20, ọ dịbeghị oge ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme mgbe ọtụtụ ọdachi ndị mere ka ụwa maa jijiji metụtara ọtụtụ ndị mmadụ n’ime ntakịrị oge otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị nnọọ 100 nde mmadụ nwụrụ n’agha n’oge ahụ, bụ́ ọnụ ọgụgụ karịrị ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’agha n’ọtụtụ narị afọ bu ya ụzọ ma a gụkọta ha ọtụtụ okpukpu. Narị afọ nke 20 nwere agha abụọ dị nnọọ iche na nke ọ bụla ọzọ nke na a kpọrọ ha agha ụwa. A lụtụbeghị agha zuru ụwa ọnụ dị ka ndị a mbụ.

Ike Mkpali Ọjọọ

Bible na-ekwukwa banyere ịdị adị nke ajọ mmụọ e kere eke, siri ike, “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan,” bụ́ onye nzube ya bụ ịdọpụ ndị mmadụ ime ihe dị ka ezi ụkpụrụ si dị ma mee ka ha bụrụ ndị na-eme omume rụrụ arụ. O kwuru na ọ rịdatawo n’ụwa na mgbe ikpeazụ, “na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:9, 12.

A kọwara Ekwensu na Bible dị ka ‘onyeisi nke ike nke mbara eluigwe, bụ́ mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a.’ (Ndị Efesọs 2:2) Nke a na-egosi na Ekwensu na-emetụta ọtụtụ mmadụ n’ụzọ siri ike, ọtụtụ mgbe ha adịghị amata, dị nnọọ ka anyị na-apụghị mgbe ụfọdụ ịmata na e nwere ihe mmetọ a na-adịghị ahụ anya n’ikuku.

Dị ka ihe atụ, a na-ahụ ike mkpali Setan n’ọtụtụ usoro mgbasa ozi nke oge a: vidio, ihe nkiri sịnịma, telivishọn, Internet, mkpọsa ngwá ahịa, akwụkwọ, magazin, na akwụkwọ akụkọ. Akụkụ buru ibu na ha, karịsịa nke ahụ na-elekwasị ndị ntorobịa na-amaghị ihe na-aganụ anya, jupụtara n’imebiga ihe ókè na omume ndị na-asọ oyi, dị ka ịkpa ókè agbụrụ, anwansi, omume rụrụ arụ, na iji obi ọjọọ na-eme ihe ike.

Nkwekọ dị n’etiti nkọwa Bible nyere banyere mgbe ikpeazụ na ọnọdụ dị kpọmkwem n’ụwa nke oge anyị emetụwo ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu n’ahụ. N’eziokwu, ọ dị ụfọdụ ihe ndị dị n’akụkọ ihe mere eme tupu narị afọ nke 20, yitụrụ n’ụzọ ụfọdụ ka hà kwekọrọ ná nkọwa Bible nyere. Ma ọ bụ nanị na narị afọ nke 20, na ugbu a narị afọ nke 21, ka a pụrụ ịhụ akụkụ nile nke ihe ịrịba ama ahụ.

Ọgbọ Ọhụrụ Na-abịanụ

Ma ndị kwere na a ga-ebibi ihe a kpọrọ mmadụ ma ndị na-ekwu na ihe nile ga-adịgide otú ha dịbu, adịghị nke kwutere ya. Kama nke ahụ, Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na a ga-eji ihe dị ọhụrụ dochie ụwa ọha mmadụ nke na-achị isi n’ụwa ugbu a.

Mgbe Jisọs kwusịrị ọtụtụ akụkụ nke ihe ịrịba ama nke mgbe ikpeazụ, o kwuru, sị: “Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) Alaeze eluigwe nke Chineke bụ isiokwu bụ́ isi nke ozi ọma Jisọs. (Matiu 6:9, 10) Chineke họpụtakwara ya ịbụ Eze nke Alaeze a, nke bụ́ ọchịchị ga-achị ụwa nile n’oge na-adịghị anya.—Luk 8:1; Mkpughe 11:15; 20:1-6.

Ná ngwụsị mgbe ikpeazụ, Alaeze eluigwe nke Chineke nke dị n’aka Kraịst gaje ịkpochapụ ndị nile bụ ndị iro ya—Ekwensu na ndị na-akwado ya—ma jiri ụwa ọhụrụ nke ezi omume dochie anya ọha mmadụ nke taa omume ọma kọrọ. (Daniel 2:44) N’ụwa ọhụrụ a, ndị obi ha ziri ezi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke e mere ka ọ ghọọ paradaịs.—Luk 23:43; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.

Ndị kpọrọ ndakpọ omume nke taa asị ma ghọta na akụkụ ndị mejupụtara ihe ịrịba ama nke mgbe ikpeazụ na-emezu n’ihe ndị na-eme ugbu a pụrụ ịtụ anya ọdịnihu magburu onwe ya. N’ihi nke a anyị na-ekele Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ onye na-eche banyere anyị bụ́ ụmụ mmadụ na onye nwere nzube dị ebube maka ihe o kere eke, bụ́ ụwa.—Abụ Ọma 37:10, 11, 29; 1 Pita 5:6, 7.

Ndịàmà Jehova na-akpọ gị òkù ịmụtakwu banyere Onye Okike anyị na-ahụ n’anya na atụmanya nke ịdị ndụ n’ụwa nke dị ọcha n’ụzọ omume, bụ́ nke o kwere ndị nile na-achọ eziokwu ná nkwa. Dị ka Bible kwuru, “ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị obi ha ziri ezi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs