Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngwá Ọrụ E Ji Akụzi Ihe Ndị Ruuru Mmadụ

Ngwá Ọrụ E Ji Akụzi Ihe Ndị Ruuru Mmadụ

Ngwá Ọrụ E Ji Akụzi Ihe Ndị Ruuru Mmadụ

ONYE nkụzi Rut Jiménez Gila, bụ́ nwa akwụkwọ dị afọ iri na asaa bi na Granada, Spain, gwara ya ka o dee edemede banyere ihe ndị ruuru mmadụ. Ka ọtụtụ izu gasịrị mgbe o desịrị edemede ahụ, òtù na-eme nnyocha na Europe bụ́ nke dị na Brussels, Belgium, gwara ya na a họpụtawo ya na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ si Spain, ịnọchite anya mba ya. Ka e mesịrị, o deere ndị na-ebi magazin Teta! akwụkwọ ozi na-esonụ.

“Ihe ọmụma kasị ọhụrụ banyere ihe ndị ruuru mmadụ dịịrị m mkpa, mbipụta ‘Teta!’ (Bekee) nke November 22, 1998, ‘Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-enweta Ihe Ndị Ruuru Ha?,’ mekwara ka m nweta kpọmkwem ihe m chọrọ. Iji gosipụta ụzọ e si na-eleghara ihe ndị ruuru mmadụ anya, ahọtakwara m ihe ọmụma site n’isiokwu ndị ọzọ dị na ‘Teta!’ banyere ọdịnihu ndị inyom na banyere Oké Mgbukpọ ahụ. [Lee mbipụta nke April 8, 1998, na nke August 8, 1998.] N’oge m na-eme nchọpụta, achọpụtara m na ‘Teta!’ nwere ihe ọmụma m na-apụghị ịchọta na magazin ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ. Foto ndị dị na ha masịkwara m, ụfọdụ n’ime ha sokwa n’akụkọ m.

“N’ihi edemede m, nke ruru inye m onyinye maka ya, anọrọ m otu izu na Finland, bụ́ ebe m nọ nwee ike ikwukwa okwu banyere ihe ndị ruuru mmadụ ma kọwaa uru ‘Teta!’ bara n’ime ka a mara isiokwu ndị dị mkpa dị ka nke a.

“Ana m ekele unu nke ukwuu maka ịbụ ndị na-ebu ụzọ agwa anyị mgbe nile banyere ihe ndị na-emegasị n’ụwa. Ka Jehova nọgide na-agọzi unu, ka ọtụtụ nde mmadụ wee nwee ike ịnọgide na-erite uru n’ihe ọmụma a.”

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Rut na asambodo na-egosi na o so kere òkè