Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwụsị Ise Siga?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwụsị Ise Siga?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwụsị Ise Siga?

ISE siga abụghị maka ndị chọrọ ịdị ndụ ogologo na nke obi ụtọ. Ohere onye nọworo na-ese siga ruo ogologo oge nwere ịbụ onye ụtaba ga-emesị gbuo bụ 1 n’ime 2. Ọga kpata kpata nke Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) kwuru, sị: “Siga bụ . . . ihe e ji nnọọ nkà mepụta nke na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị nnọọ ekwesị nke nicotine iji mee ka onye na-ese ya bụrụ onye o riri ahụ ná ndụ ya nile tupu ọ na-egbu onye ahụ.”

Ya mere, otu ihe mere a ga-eji kwụsị ise ụtaba bụ n’ihi na ise ụtaba na-etinye ahụ ike na ndụ mmadụ n’ihe ize ndụ. E jikọwo ise siga na ihe karịrị ọrịa 25 na-eyi ndụ egwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe kasị akpata nkụchi obi, ọrịa strok, ọzịza nke opi akpa ume na-adịghị ala ala, emphysema, na ọrịa cancer dịgasị iche iche, ọkachasị ọrịa cancer akpa ume.

N’ezie, mmadụ pụrụ ise siga ruo ọtụtụ afọ tupu ọ na-arịa otu n’ime ọrịa ndị a. Ka ọ dịgodị, ise siga adịghị adọtakwu ndị mmadụ n’ebe onye ahụ nọ. Mkpọsa ngwá ahịa na-egosi ndị na-ese siga dị ka ndị mara mma na ndị ahụ siri ike. Nke a abụghị eziokwu. Ise siga na-akpata ọnụ ísì ma na-eme ka ezé gbachuo agbachuo, ọ na-emekwa ka mkpịsị aka chanwụọ achanwụọ. Ọ na-eso eme ka nwoke ghara ịtụwali nwanyị ime. Ọ na-akpata ụkwara na iku ume ọkụ ọku nke ndị na-ese siga. Ndị na-ese siga yikarịkwara ka hà ga-enwe ihu ndọlị na nsogbu akpụkpọ ahụ ndị ọzọ mgbe oge ha na-erubeghị.

Otú Ise Siga Si Emetụta Ndị Ọzọ

Bible na-ekwu, sị: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Ịhụnanya maka ndị agbata obi gị—ndị òtù ezinụlọ gị bụkwa ndị agbata obi kasị nọrọ gị nso—bụ ezigbo ihe mere ị ga-eji kwụsị ise siga.

Ise siga na-emerụ ndị ọzọ ahụ. Tupu oge ndị na-adịbeghị anya, onye na-ese siga pụrụ ịmụnye siga ya ọkụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe ọ bụla, n’atụghịkwa anya ihe mgbochi. Ma omume ndị mmadụ agbanwewala, n’ihi na ọtụtụ ndị na-aghọta ihe ize ndụ dị n’ikuru anwụrụ na-esi na siga ndị ọzọ na-ese apụta. Dị ka ihe atụ, onye na-adịghị ese siga nke lụrụ onye na-ese siga nwere ohere dị pasent 30 nke ịrịa ọrịa cancer akpa ume karịa ka ọ gaara enwe ma ọ bụrụ na ọ lụrụ onye na-adịghị ese siga. Ụmụaka ha na nne na nna ha na-ese siga bi yikarịrị ka oyi ọ ga-aba ha n’ahụ ma ọ bụ ha arịa ọrịa ọzịza nke opi akpa ume n’ime afọ abụọ mbụ nke ndụ ha karịa ụmụaka bi n’ụlọ ebe a na-enweghị onye na-ese siga.

Ndị inyom dị ime bụ́ ndị na-ese siga na-etinye ụmụ ọhụrụ ha ka bu n’afọ n’ihe ize ndụ. Nicotine, carbon monoxide, na mmiri ọgwụ ndị ọzọ dị ize ndụ bụ́ ndị dị n’ime siga na-abanye n’ọbara nke na-erugharị n’ahụ onye bụ́ nne ma si ya banye kpọmkwem n’ahụ nwa ka nọ n’ime akpa nwa. Ihe ndị na-esi na ya apụta na-agụnye ime ka ohere e nwere afọ ime ịpụ mmadụ, ịmụ nwa nwụrụ anwụ, na inwe ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụ ọhụrụ na-anwụnụ, dị elu nke ukwuu. Ọzọkwa, ihe ize ndụ nke ọnwụ mberede ụmụaka ji okpukpu atọ ka elu n’etiti ụmụ ọhụrụ nne ha na-ese siga mgbe ha dị ime.

Ọ Na-efu Oké Ego

Ihe ọzọ mere a ga-eji kwụsị ise siga bụ na ọ na-efu oké ego. Otu nnyocha nke Ụlọ Akụ̀ Ụwa mere na-eme atụmatụ na ihe nlekọta ahụ ike na-efu bụ́ nke nanị ise siga na-akpata bụ ihe dị ka ijeri $200 kwa afọ. N’ezie, ọnụ ego ahụ adịghị egosipụta nhụjuanya na ihe mgbu ndị buteworo ọrịa ndị ise siga na-akpata na-enwe.

Ọ dị mfe ịgbakọta ego ole siga na-efu onye ọ bụla na-ese siga. Ọ bụrụ na ị na-ese siga, jiri 365 mụbaa ego ole ị na-eji azụ siga n’otu ụbọchị. Nke ahụ ga-egosi gị ego ole ị na-emefu n’otu afọ. Jiri iri mụbaa ọnụ ego ahụ, ị ga-ahụ ego ole ị ga-emefu na siga ma ọ bụrụ na i see siga ruo afọ iri ọzọ. Ihe ị ga-enweta pụrụ iju gị anya. Chee banyere ihe ọzọ ị pụrụ iji ego nile ahụ mee.

Iji Ihe Ọzọ Dochie Anya Siga Ọ̀ Ka Mma?

Ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba na-akpọsa siga ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ tar na nicotine dị ala—nke a na-akpọsa dị ka siga ndị na-adịghị ize ndụ—dị ka ụzọ isi belata ihe ize ndụ ahụ ike dị n’ise siga. Ma otú ọ dị, ndị na-esezi siga ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ tar na nicotine dị ala na-achọsi ike inweta otu ọ̀tụ̀tụ̀ nicotine ahụ ha na-enwetabu. N’ihi ya, ndị na-esezi ụdị siga ọzọ na-enwetaghachikarị ihe ndị ha tụfuru site n’ise ọtụtụ siga, na-eloda anwụrụ ọkụ dị ukwuu ọtụtụ mgbe karị, ma ọ bụ na-ese otu siga nke ọ bụla ogologo oge karị. Ọbụna nye ndị na-emeghị mgbanwe ọ bụla iji nwetaghachi ihe ndị ha tụfuru, abamuru ahụ ike ndị ha na-enweta na-adị ntakịrị ma e jiri ha tụnyere uru ndị dị n’ịkwụsị ya kpam kpam.

Gịnị banyere ọkpọkọ na akwụkwọ ụtaba a fụrụ afụ? Ọ bụ ezie na ọ dịwo anya ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba kwalitewere ọkpọkọ na akwụkwọ ụtaba a fụrụ afụ dị ka ihe e ji amata ọnọdụ mmadụ, anwụrụ na-esi na ha apụta na-egbukwa mmadụ dị ka nke siga. Ọ bụrụgodị na ndị na-ese siga adịghị eloda anwụrụ akwụkwọ ụtaba a fụrụ afụ ma ọ bụ ọkpọkọ, ha nọ n’ihe ize ndụ dị ukwuu nke ịrịa ọrịa cancer egbugbere ọnụ, nke ọnụ, nakwa nke ire.

Ụtaba na-adịghị akwụ anwụrụ ọ̀ bụ ihe na-adịghị ize ndụ? Nke a na-adị n’ụdị abụọ: anwụrụ na ụtaba a na-ata ata. Anwụrụ bụ ụtaba a kwọrọ akwọ, bụ́ nke a na-erekarị ná mkpọ ma ọ bụ ná ngwugwu. Ọtụtụ mgbe, ndị na-ara ya na-etinye ya n’úkwù ezé ma ọ bụ n’ime nti ha. A na-ere ụtaba a na-ata ata ná ngwugwu ndị e kenyere n’eriri dị ogologo. Dị ka aha ya na-egosi, a na-ata ya ata, a dịghị aracha ya aracha. Ma anwụrụ ma ụtaba a na-ata ata na-akpatacha ọnụ ísì, ezé mgbachu, cancer ọnụ na nkọlọ, nicotine iri mmadụ ahụ, ọnyá ọnụ nke na-acha ọcha bụ́ nke pụrụ ịghọ cancer, agbụ̀ irichapụ erichapụ, na úkwù ezé esikwaghị ike. N’ụzọ doro anya, ịracha ma ọ bụ ịta ụtaba abụghị ihe ọzọ amamihe dị na ya a pụrụ iji dochie anya ise siga.

Abamuru Ndị Dị n’Ịkwụsị Ya

Ka e were ya na i sewo siga ruo ọtụtụ oge. Gịnị ga-eme mgbe ị kwụsịrị ya? O jiri minit 20 gafee mgbe ị kwụsịrị ya, ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara gị ji erugharị ga-agbada ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị. Mgbe otu izu gasịrị, nicotine agakwaghị adị gị n’ahụ. Mgbe otu ọnwa gasịrị, ụkwara, imi mkpọchi, ike ọgwụgwụ, na iku ume ọkụ ọkụ ga-amalite ibelata. Mgbe afọ ise gasịrị, ohere i nwere ịnwụ n’ọrịa cancer akpa ume ga-eji pasent 50 belata. Mgbe afọ 15 gasịrị, ohere i nwere ịrịa ọrịa akwara obi ga-ebelata ịdị ka nke onye na-esetụbeghi siga mbụ.

Ị ga na-anụ ụtọ ihe oriri karị. Ọnụ gị, ahụ gị na uwe gị ga na-esi ísì ọma karị. Ị gaghịzi enwe nsogbu ma ọ bụ mmefu nke ịzụ ụtaba. Ị ga-enwe afọ ojuju. Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka, ihe nlereanya gị ga-ebeleta ohere ha nwere ịghọ ndị na-ese siga. O yikarịrị ka ị ga-adị ogologo ndụ karị. Ọzọ, ị ga na-eme omume kwekọrọ n’uche Chineke, ebe ọ bụ na Bible kwuru sị: “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ.” (2 Ndị Kọrint 7:1) Echela na oge agafeela ịkwụsị ya; i mee ngwa ngwa kwụsị ya, ọ ga-akara gị mma.

Ihe Mere O Ji Esi Ike nke Ukwuu Ịkwụsị Ya

Ọ na-esi ike ịkwụsị ise siga—ọbụna nye ndị nwere ezi nzube ịkwụsị ya. N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ n’ihi na nicotine ahụ dị n’ụtaba bụ ọgwụ na-eri ahụ nke ukwuu. “N’ihe banyere ọ̀tụ̀tụ̀ iri ahụ nke ọgwụ ndị na-emetụta akparamàgwà mmadụ, e gosiri na nicotine na-eri ahụ karịa heroin [na] cocaine,” ka òtù WHO na-ekwu. N’adịghị ka heroin na cocaine, nicotine adịghị enye ihe àmà pụtara ìhè nke igbu egbu, n’ihi ya, ọ dị mfe ileda ikike ya anya. Ma, mmetụta obi ụtọ ọ na-enyetụ na-eme ka ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nọgide na-ese ya iji na-enweta mmetụta ahụ ugboro ugboro. Nicotine na-agbanwe mmetụta gị n’ezie; ọ na-ebelata nchegbu. Otú ọ dị, ihe na-eso akpata mbelata siga na-ebelata ahụ erughị ala bụ agụụ nicotine n’onwe ya.

Ọ na-esikwa ike ịkwụsị ise siga n’ihi na ọ bụ àgwà na-amara mmadụ ahụ. E wezụga ịbụ ndị nicotine riri ahụ, ndị na-ese siga na-azụlite omume ịmụnye ọkụ na ikupụ anwụrụ ọkụ mgbe nile. ‘Ọ bụ ihe ị ga-eji aka gị na-eme.’ ‘Ọ na-eme ka i jiri ọrụ n’aka,’ ka ụfọdụ pụrụ ikwu.

Ihe nke atọ mere o ji esi ike nkwụsị bụ n’ihi na e mewo ka ụtaba bụrụ akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba na-emefu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri dollar isii kwa afọ ná mkpọsa ngwá ahịa na-egosi ndị na-ese siga dị ka ndị mara mma, dị gara gara, ahụ siri ike, nakwa ndị nwere ọgụgụ isi. Ọtụtụ mgbe a na-egosi ha ebe ha na-agba ịnyịnya, na-egwu mmiri, na-apịa tennis, ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ na-adọrọ mmasị. Ihe nkiri sịnịma na ihe omume telivishọn na-egosi ndị na-ese siga—ọ naghị abụkebe ndị nwere àgwà ọjọọ. Iwu kwadoro ire siga, a na-enwetakwa ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe nile. Ọtụtụ n’ime anyị bi onye na-ese siga nso. Ị pụghị izere ha.

Ọ dị mwute na e nweghị ọgwụ ị pụrụ ịṅụ iji wepụ ọchịchọ ise siga dị ka ọgwụ aspirin pụrụ ịkwụsị isi ọwụwa. Iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ ahụ siri ike nke ịkwụsị ya, mmadụ aghaghị inwe ezi nzube. Dị ka ifelata, ọ chọrọ ịdị nnọọ uchu ruo ogologo oge. Ibu ọrụ nke inwe ihe ịga nke ọma dabeere n’aka onye ahụ na-ese siga.

[Igbe dị na peeji nke 15]

Ndị O Riri Ahụ na Nwata

Nnyocha e mere na United States gosiri na 1 onye n’ime ndị na-eto eto 4 nwaleworo ise siga mesịrị bụrụ ndị o riri ahụ. Nke a na ọnụ ọgụgụ ndị nwalere cocaine na heroin bụ́ ndị o riri ahụ hà nhata. Ọ bụ ezie na ihe dị ka pesent 70 nke ndị nọ n’oge uto ha na-ese siga na-akwa ụta maka ịmalite ya, ọ bụ ole na ole n’ime ha nweworo ike ịkwụsị ya.

[Igbe dị na peeji nke 15]

Gịnị Dị n’Anwụrụ Siga?

Nsí tar dị n’ime anwụrụ siga, bụ́ nke nwere ihe karịrị mmiri ọgwụ 4,000 dị iche iche. N’ime mmiri ọgwụ ndị a, a maara 43 dị ka ndị na-akpata ọrịa cancer. Ndị a gụnyere cyanide, benzene, wood alcohol, na acetylene (mmanụ ọkụ a na-etinye n’oriọna). Anwụrụ siga nwekwara nitrogen oxide na carbon monoxide, bụcha gas ndị na-egbu egbu. Ihe dị n’ime ya nke kasị ike bụ nicotine, ọgwụ na-eri ahụ nke ukwuu.

[Igbe dị na peeji nke 16]

Inyere Onye Ị Hụrụ n’Anya Aka Ịkwụsị Ya

Ọ bụrụ na ị bụ onye na-adịghị ese siga nke maara ihe ize ndụ dị na ya, o yiri ka ọ ga-ewute gị mgbe ndị enyi gị na ndị ị hụrụ n’anya nọgidere na-ese siga. Gịnị ka ị pụrụ ime iji nyere ha aka ịkwụsị ya? Ịba mba, ịrịọ arịrịọ, mmanye, na ịkwa emo adịghị enwekebe ihe ịga nke ọma. Okwu nlelị adịghịkwa enwe ihe ịga nke ọma. Kama ịkwụsị ya, onye ahụ na-ese siga pụrụ ịmalite ise siga iji mee ka ihe ị na-ekwu ghara igbu ya mgbu n’obi nke ukwuu. Ya mere, gbalịa ịghọta otú o si esi ike ịkwụsị ya nakwa na ọ na-esiri ụfọdụ ike ịkwụsị ya karịa ndị ọzọ.

Ị pụghị ime ka onye na-ese siga kwụsị ise siga. Ume dị n’ime na ikweta ịkwụsị ya aghaghị isite n’ime onye ahụ na-ese siga. Ọ dị gị mkpa ịchọta ụzọ ịhụnanya nke isi gbaa onye ahụ ume ma kwado ọchịchọ ọ chọrọ ịkwụsị ya.

Olee otú ị pụrụ isi mee nke ahụ? Ị pụrụ igosi onye ahụ ịhụnanya n’oge kwesịrị ekwesị ma kwuo na ị na-enwe nchegbu banyere àgwà ise siga ya. Kọwaa na ị dị njikere ịkwado mkpebi ọ bụla ọ ga-eme ịkwụsị ya. Ma otú ọ dị, ọ bụrụ na e jiri ụzọ a mee ihe ọtụtụ ugboro, ịdị irè na nzube ya ga-efu.

Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya ekpebie ịkwụsị ya? Buru n’uche na ọ pụrụ inwe ihe mgbu nke ịkwụsị ya na-akpata, gụnyere iwe iwe na ịda mbà n’obi. Isi ọwụwa na inwe ihe isi ike ịrahụ ụra pụkwara ịbụ nsogbu. Chetara onye ị hụrụ n’anya na ihe mgbu ndị a ga-adịru nwa oge ma bụrụ ihe na-egosi na ahụ ya na-alaghachi n’ọnọdụ dị ọhụrụ nakwa nke siri ike. Na-enwe ihu ọchị na nchekwube. Gosi otú obi dịruru gị n’ụtọ na ọ na-akwụsị ya. N’oge nkwụsị ahụ nile, nyere onye ị hụrụ n’anya aka izere ọnọdụ ndị na-akpaghasị uche bụ́ ndị pụrụ ime ka ọ maliteghachi ya.

Gịnị ma ọ bụrụ na ọ maliteghachi ya? Gbalịa ịghara imeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè. Nwee obi ọmịiko. Were ọnọdụ ahụ dị ka ahụmahụ nwere ihe mmụta nye unu abụọ, na-eme ka mgbalị ọzọ ọ ga-eme yie ihe ga-aga nke ọma.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba na-emefu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde dollar isii kwa afọ n’ịkpọsa ngwá ahịa