Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwukwe Nọ n’Ọrụ n’Oge Ọdachi

Okwukwe Nọ n’Ọrụ n’Oge Ọdachi

Okwukwe Nọ n’Ọrụ n’Oge Ọdachi

N’IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 gara aga, Mina Esch natara mpempe akwụkwọ ozi site n’aka di ya, bụ́ Peter. Ozi ahụ e ji aka dee dị nkenke ma bụrụ nke na-edochaghị anya. Ka o sina dị, o nwere obi ụtọ na ahụ iru ala mgbe ọ nwetara ya. Di Mina bụ onye mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ Buchenwald, bụ́ ebe ndị gọọmenti Nazi tinyere ya n’ihi na ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Okwu a dị nkenke, dị n’azụ mpempe akwụkwọ ahụ: “Onye mkpọrọ a ka siri ọnwụ bụrụ Onye Mmụta Bible [dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ] . . . N’ihi nke a nanị, a napụla ya ihe ùgwù nke nderịta akwụkwọ a gaara enye ya.” Ozi a gwara Mina na Peter ka nọgidesiri ike n’okwukwe ya.

E debere mpempe akwụkwọ ozi ahụ, bụ́ nke meworo ochie ma chagharịa achagharịa ugbu a, n’Ebe Ngosi Ihe Nketa Ochie nke Ndị Juu—Ihe Ncheta A Na-ahụ Anya nke Oké Mgbukpọ ahụ, dị n’Ogige Battery, New York City, ka ọ dịrị n’ebe ahụ ruo nwa oge. Foto Peter Esch na mpempe akwụkwọ ozi ahụ na-enyetụ aka n’ime ka a mara ọdachi ukwu dakwasịrị ụmụ mmadụ—Oké Mgbukpọ ahụ—bụ́ mgbe nde ndị Juu isii nwụrụ. Ebe ndebe ihe bụ́ isi nke ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ nwere ihe karịrị foto 2,000 na ihe osise 800 ndị metụtara akụkọ ihe mere eme na ọdịbendị bụ́ ndị na-egosi ahụmahụ nke ndị Juu malite n’afọ ndị 1880 ruo ugbu a, gụnyere Oké Mgbukpọ ahụ. N’ihi gịnị ka Ebe Ngosi Ihe Nketa Ochie nke Ndị Juu ji bụrụ ebe kwesịrị ekwesị idebe akwụkwọ ozi Peter Esch?

“Ebumnobi nke ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ bụ igosi akụkọ banyere ndị Juu,” ka ọkọ akụkọ banyere ebe ngosi ihe mgbe ochie, bụ́ Dr. Jud Newborn, kwuru. “A kpagburu Ndịàmà Jehova n’ihi ndị ha bụ. A kpagburu Ndịàmà a nanị n’ihi nkwenkwe okpukpe ha nakwa n’ihi na ha jụrụ ịkpa ókè agbụrụ, jụ ịkwado onye ụwa ji obi ọjọọ na aka ike na-achị. Ha alụghịkwa agha ya. . . . Ndị Juu gbalịsiri ike ijigide ụkpụrụ ha nakwa okwukwe ha mgbe e megidere ha n’ụzọ jọgburu onwe ya. Ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ na-eme ka a mara nguzosi ike ime mmụọ dị otú ahụ. N’ihi nke ahụ, ụlọ ọrụ a maara ma nwee mmasị n’okwukwe Ndịàmà Jehova nwere n’oge ọchịchị ndị Nazi.”

N’Ebe Ngosi Ihe Nketa Ochie nke Ndị Juu, ebe e debegodịrị ya ugbu a, otu akwụkwọ ozi dị nkenke na-egosi mgbalị nke otu nwoke e tinyere nguzosi ike ya n’ebe Jehova nọ n’ule. Peter Esch lanarịrị ahụmahụ ọjọọ o nwere n’ogige ndị Nazi, n’emebighị okwukwe ya.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ebe Ngosi Ihe Nketa Ochie nke Ndị Juu, Dị na New York City

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

A tụrụ Esch, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, mkpọrọ site na 1938 ruo 1945 n’ihi na o kweghị agbahapụ nkwenkwe ya