Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Internet?

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Internet?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Internet?

WERE ya na ị nọ n’ọ́bá akwụkwọ kasị ibu n’ụwa. Akwụkwọ, akwụkwọ akụkọ, akwụkwọ mkpọsa ngwá ahịa, foto, na ụdị ihe dị iche iche dị na tepụ—ndị metụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isiokwu nile—gbara gị gburugburu. Ihe ọmụma nile kasị ọhụrụ nakwa ọnụ ọgụgụ buru ibu nke akwụkwọ ndị e bipụtara na narị afọ gara aga dị gị n’ihu.

Internet pụrụ ime ka i nweta ihe ọmụma dị otú ahụ n’ụzọ dị mfe. Ọ na-enyere mmadụ aka ịnọ n’ihu kọmputa ya ma soro kọmputa na ndị nwere kọmputa n’ebe ọ bụla n’ụwa na-ezirịta ozi. * Ọ na-eme ka ndị nwere ya nwee ike ire ngwá ahịa, ịzụta ihe, itinye ego n’ụlọ akụ̀, ikwurịta okwu, na ịge egwú ndị kasị ọhụrụ—ihe a nile mgbe nanị ha nọ n’ụlọ ha.

Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere ndị ọkachamara ụfọdụ ji na-ebu amụma na ihe karịrị nde mmadụ 320 ga na-eji Internet eme ihe mgbe ọ na-erule ngwụsị afọ a. Iji Internet eme ihe si otú a na-aghọ ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ebe ụlọ akwụkwọ na ọ́bá akwụkwọ dị iche iche na-akwalitesi iji ya eme ihe ike, ọtụtụ nde ndị na-eto eto na-eji ya eme ihe. Na United States, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 65 nke ndị ntorobịa nọ n’agbata afọ 12 na 19 ejiriwo Internet mee ihe ma ọ bụ kwụnye ụgwọ iji ya eme ihe.

E jiri ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi, Internet pụrụ ịbụ ebe e si enweta ihe ọmụma na-enye aka banyere ihu igwe, njem, na ihe ndị ọzọ. Site na ya, ị pụrụ ịzụ akwụkwọ, akụkụ ahụ ụgbọala, na ihe ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị na-eji ya eme ihe maka ọrụ ụlọ akwụkwọ.

Ọ bụ ezie na Internet pụrụ ịba uru, ọ pụkwara iyi ọ́bá akwụkwọ na-enweghị onye nlekọta ma ọ bụ nke ndị ọzọ na-ekiri ihe a na-eme na ya. Mmadụ pụrụ imepe ya n’echiche nke na ọ dịghị onye ọzọ nọ nso. Ma nke a bụ otu n’ime ihe ndị kasị dịrị ize ndụ n’iji Internet eme ihe. N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma n’Internet nwere ihe ndị rụrụ arụ n’ụzọ omume ma na-ebibi ebibi n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, Internet pụrụ ikpughepụ ndị Kraịst na-eto eto nye ọnwụnwa. E kwuwerị, ụmụ mmadụ nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ịmata ihe—ọchịchọ nke Setan bụ́ Ekwensu jiworo na-eme ihe eri ogologo oge. Setan jiri ọchịchọ ịmata ihe nke Iv mee ihe n’ezie ma ‘were aghụghọ ya ghọgbuo ya.’—2 Ndị Kọrint 11:3.

N’otu aka ahụ, onye Kraịst na-eto eto pụrụ ịbụ onye ihe ọmụma na-adịghị mma rafuru ma ọ bụrụ na ọ chọghị ichebe ọnọdụ ime mmụọ ya. Otu isiokwu dị na Better Homes and Gardens kọwara, sị: “Internet bụ ebe ndị nwere ọgụgụ isi mepụtara ihe ọhụrụ na-edebe ihe ọmụma kasị ọhụrụ; ma ndị na-edina ụmụaka, ndị nghọgbu, ndị na-anụbigara nkwenkwe ọkụ n’obi ókè, nakwa ndị ọzọ rụrụ arụ nwekwara ebe ndị ha na-edebe ihe ọmụma n’Internet.”

Otu onye ntorobịa aha ya bụ Javier * na-ekwu, sị: “Ebe ụfọdụ a na-edebe ihe ọmụma n’Internet na-awụ akpata oyi n’ahụ. Ha pụrụ ịpụta na mberede.” O kwukwasịrị: “Ha na-anwa ịnwụchi gị. Ha chọrọ ịrata gị—iji nweta ego gị.” Otu onye Kraịst na-eto eto aha ya bụ John na-ekweta, sị: “Ozugbo ị malitere ikiri ihe na-ezighị ezi, ọ ga-esi ike ịkwụsị—ọ na-eri nnọọ mmadụ ahụ.” Ndị Kraịst ụfọdụ bụ́ ndị ntorobịa agawo ọtụtụ ugboro n’ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma n’Internet, nke a akpatakwuworo ha nnukwu nsogbu. Ọbụna ụfọdụ emebiwo mmekọrịta ha na Jehova. Olee otú a pụrụ isi zere nke a?

‘Ile Ihe Efu’

Mgbe ụfọdụ adres ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet na-egosi n’ụzọ doro anya na e nwere ihe ndị na-adịghị mma na ya. * Ilu 22:3 na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.”

Otú ọ dị, nke na-abụkari nsogbu ọtụtụ mgbe bụ na ndị mmadụ pụrụ ịdaba n’ebe a na-edebe ihe ndị na-adịghị mma na mberede. Ebe a na-akpọsa ihe dị na ya pụrụ inwe foto ndị na-asọ oyi bụ́ ndị e ji nlezianya see iji ranye gị n’ịchọgharị ihe n’ebe ahụ a na-edebe ihe ọmụma—ma na-alọghachi na ya ugboro ugboro! *

Kevin na-akọwa ihe mere otu n’ime ndị enyi ya: “O nweghị ọrụ o ji n’aka, o nwekwara ọchịchọ ịmata ihe. N’oge na-adịghị anya ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ghọrọ ihe ọ na-emekarị.” Ọ dabara nke ọma na onye Kraịst a na-eto eto gakwuuru otu okenye ma nweta enyemaka.

Ì kpebiwo ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị daba n’ebe dị otú ahụ a na-edebe ihe ọmụma na mberede? Ihe onye Kraịst kwesịrị ime doro anya: Pụọ n’ebe ahụ a na-edebe ihe ọmụma ozugbo—ma ọ bụ ọbụna mechie Internet ahụ! Na-adị ka ọbụ abụ ahụ bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Mee ka anya m abụọ si n’ile ihe efu gabiga.” (Abụ Ọma 119:37; tụlee Job 31:1.) Cheta na ọ bụrụgodị na ọ dịghị onye ọzọ na-ahụ ihe anyị na-eme, a na-ahụ ihe anyị na-eme. Bible na-echetara anyị na ihe nile ‘bụ ihe e megheworo n’anya Ya, bụ́ Onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.’—Ndị Hibru 4:13.

Ịkọrọ ya ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị Kraịst ọzọ tozuru okè pụrụ iwusi mkpebi i mere ike ịghara ịgaghachi n’ebe ahụ a na-edebe ihe ọmụma ndị na-adịghị mma. E kwuwerị, ọ bụrụ na ị daba n’ime ájá na-emi emi, ị̀ ga-anọgide na-adọlị ruo mgbe o ruru gị n’olu tupu ị kpọwa òkù maka enyemaka?

Gịnị Banyere Mkpakọrịta n’Internet?

Ebe a na-ezirịta ozi n’ìgwè na-eme ka ndị na-eji Internet eme ihe n’ụwa nile na-ezirịta ibe ha ozi ozugbo ahụ. Ụlọ ọrụ achụmnta ego dị iche iche na-eji ya enwe nnọkọ na kọmputa, na-ejikwa ya enye ndị ahịa ha ihe ha chọrọ. Ebe ụfọdụ a na-ezirịta ozi n’ìgwè na-eme ka ndị so na ya nye ndị ọzọ ihe ọmụma banyere nkà na ụzụ, dị ka ịrụzi ụgbọala ma ọ bụ itinye ihe na kọmputa. Ụdị ebe ụfọdụ a na-anọ ezirịta ozi n’ìgwè na-eme ka ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ na-ezirịta ozi nanị ha n’emefughị ego dị ka a na-emefu ma a nọrọ n’ebe dị anya kpọọ mmadụ na telifon. Ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ihe ndị ziri ezi a na-eji usoro a eme, è nwere ihe ize ndụ ọ bụla dị na ya?

Ọ dị mkpa n’ezie ka a kpachara anya mgbe a bịara n’ihe banyere ebe ọha na eze na-anọ ezirịta ozi n’ìgwè, n’ihi na nke a pụrụ ịkpata ihe ize ndụ ụfọdụ. Onye edemede bụ́ Leah Rozen kwuru, sị: “Ndị nọ n’afọ iri na ụma maara otú e si eji nkà na ụzụ eme ihe na-etinye ọtụtụ awa n’isoro ndị ha na-amaghị ezirịta ozi na kọmputa ná mba ha ma ọ bụ, ọbụna, n’ụwa nile. Ọ dị mwute na ụfọdụ n’ime ndị ahụ ha na-amaghị bụ́ ndị ndị nọ n’afọ iri na ụma pụrụ iso na-ekwurịta okwu na kọmputa na-abụkwa ndị toworo eto rụrụ arụ na-achọ ka ha na ụmụaka zute ma nwee mmekọahụ.” Otu isiokwu dị na Popular Mechanics dọrọ aka ná ntị na “ị ghaghị ịkpachara nnọọ anya” mgbe ị nọ n’ebe ọha na eze na-ezirịta ozi n’ìgwè. Inye onye ị na-amaghị aha na adres gị pụrụ ịbụ ịkpọ nnukwu nsogbu òkù! N’ihi gịnị ka ị ga-eji tinye onwe gị n’ihe ize ndụ ahụ?

Otú ọ dị, nke ka dịrị ize ndụ bụ ịbụ onye e jichiri n’isoro ndị ị na-amaghị, bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ ụkpụrụ Bible na-enwe mkpakọrịta na-ezighị ezi. * Ndị nnyocha na-ekwu na akụkụ ka ukwuu ná mkparịta ụka ndị nọ n’afọ iri na ụma na-enwe n’ebe a na-ezirịta ozi n’ìgwè na-elekwasị anya n’ihe metụtara mmekọahụ. N’ihi ya ndụmọdụ Bible dị ná 1 Ndị Kọrint 15:33 kwesịrị ekwesị: “Unu ekwela ka e duhie unu: Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” Mkpakọrịta ọjọọ na kọmputa dị ize ndụ. Ò kwesịrị ekwesị ka onye ntorobịa na-atụ egwu Chineke jiri elezighị anya kpughepụ onwe ya nye ụdị ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ?

Ihe Nchebe

N’ihi ihe ize ndụ ndị dị n’Internet, a ghaghị ịkpachara anya mgbe e ji ya na-eme ihe. Dị ka ihe atụ, ezinụlọ ụfọdụ na-edebe kọmputa ha n’ebe onye ọ bụla ga na-ahụ ya, dị ka na palọ. Ha pụkwara iti iwu ka a na-eji Internet eme ihe nanị mgbe ndị ọzọ nọ n’ụlọ. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị etie iwu dị otú ahụ, rube isi na ya. (Ilu 1:8) Ụkpụrụ nduzi ndị doro anya bụ ihe àmà nke ịhụnanya ha.

Ọ bụrụ na ọrụ ụlọ akwụkwọ na-achọ ka i jiri Internet rụọ ya, gịnị ma i nyochaa ókè oge ị na-etinye na ya hà? Gbalịa ibu ụzọ kpebie ókè oge ị ga-etinye na ya ga-aha, na-edebe klọọkụ nwere ihe mgbaàmà ka ọ na-echetara gị mgbe oge zuru. Tom na-atụ aro, sị: “Buru ụzọ mee atụmatụ, mata kpọmkwem ihe ị na-achọ, ma chọọ nanị ihe ahụ—n’agbanyeghị ókè ihe ndị ọzọ yiruru ka ha na-adọrọ mmasị.”

Ọ dịkwa mkpa ka ị kpachara anya mgbe a bịara n’ihe banyere iji E-mail eme ihe. Ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa na-akpachara anya ka a ghara ijichi ha n’ịgụ ozi E-mail buru ibu, nke ka nke ma ọ bụrụ na ihe ka ukwuu n’ime ya adịghị mkpa ma ọ bụ bụrụ ndị na-enweghị ihe ndabere. Iji E-mail emebiga ihe ókè pụrụ iricha oge dị mkpa maka ọrụ ụlọ akwụkwọ na ihe omume ime mmụọ.

Eze Solomọn kwuru, sị: “Ime ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ; ọtụtụ mmụta bụkwa ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ.” (Eklisiastis 12:12) Okwu ndị ahụ pụrụ nnọọ imetụta Internet. Etinyebigala onwe gị ókè n’ịchọ ihe ọmụma nke na ị ga-eleghara iji Bible na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye na ikere òkè n’ozi ndị Kraịst anya. (Matiu 24:14; Jọn 17:3; Ndị Efesọs 5:15, 16) Chetakwa na ọ bụ ezie na izirịta ozi na kọmputa pụrụ inwe abamuru nke ya, ọ dịghị ihe a pụrụ iji dochie anya izute onye Kraịst ibe gị ihu na ihu. Ya mere ọ bụrụ n’ezie na ị chọrọ iji Internet eme ihe, mee mkpebi siri ike iji ya eme ihe n’ụzọ amamihe. Zere ebe ndị dị ize ndụ a na-edebe ihe ọmụma, etinyekwala oge dị ukwuu na kọmputa. “Chebe obi gị,” ya adịkwala mgbe ị ga-aghọ ohu nke Internet.—Ilu 4:23.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee usoro isiokwu bụ́ “Internet—Ọ̀ Bụ Maka Gị?” dị ná mbipụta Teta! (Bekee) July 22, 1997.

^ par. 9 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 11 Adres ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet bụ mkpụrụ akwụkwọ ndị a haziri n’usoro bụ́ ndị e ji abanye n’ebe ahụ a na-edebe ihe ọmụma n’Internet. Mgbe ụfọdụ adres na-enwe okwu na-egosi nzube nke ebe ahụ a na-edebe ihe ọmụma.

^ par. 12 Ebe a na-akpọsa ihe dị n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet dị ka ebe a na-akpọsa ngwá electronic a na-ere ere. Ọ na-akọwa ihe a pụrụ inweta n’ebe a na-edebe ihe ọmụma, onye mepụtara ya, na ihe ndị ọzọ.

^ par. 19 Ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị n’ebe ọha na eze na-ezirịta ozi n’ìgwè bụ́ ebe ndị Kraịst nwere ezi nzube obi mepụtara maka ịtụle ihe ime mmụọ. Ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu na ndị si n’ezi ofufe dapụ esonyewo ná nkwurịta okwu a mgbe ụfọdụ ma jiri aghụghọ chọọ ịmanye ndị ọzọ ịnabata echiche ha na-adabereghị na Bible.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Ebe ụfọdụ a na-edebe ihe ọmụma n’Internet na-awụ akpata oyi n’ahụ. Ha pụrụ ịpụta na mberede.”

[Foto dị na peeji nke 25]

Ezinụlọ ụfọdụ na-edebe kọmputa ha n’ebe onye ọ bụla ga na-ahụ ya