Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Kwụsị Ya

Otú Ị Pụrụ Isi Kwụsị Ya

Otú Ị Pụrụ Isi Kwụsị Ya

DỊ KA ịmụ otú e si agba ịnyịnya ígwè, o sika ike ka ị kwụsị ise ụtaba ná mgbalị mbụ ị ga-eme ịkwụsị ya. Ya mere, ọ bụrụ na i kpebisiwo ike ịkwụsị ya, i kwesịrị ịdị njikere ime mgbalị ugboro ugboro ruo mgbe i nwere ihe ịga nke ọma. Elela ịmaliteghachi ya anya dị ka mmeri. Were ya ka ahụmahụ nwere ihe mmụta, ntakịrị ihe ndọghachi azụ n’ihe pụrụ ịbụ usoro ihe omume ga-aga nke ọma. E depụtara n’ebe a aro ndị nyewooro ndị ọzọ aka. Ha pụkwara inyere gị aka.

Kwadebe Uche Gị Ịkwụsị Ya

■ Nke mbụ, ị ghaghị ikweta n’onwe gị na ịkwụsị ya kwesịrị mgbalị ndị ị na-aga ime. Depụta ihe ndị mere i ji chọọ ịkwụsị ya, gụnyere abamuru ya nile. Mgbe ị kwụsịchara ya, ịtụleghchi ihe ndepụta a ga-ewusi mkpebi gị ike. Ọchịchọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ bụ nzube bụ́ isi maka ịkwụsị ya. Bible na-ekwu na anyị kwesịrị ịhụ Chineke n’anya site n’uche, obi, mkpụrụ obi, na ike anyị dum. Nke ahụ bụ ihe anyị na-apụghị ime ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị ise ụtaba riri ahụ.—Mak 12:30.

■ Tụlee àgwà ise siga gị ma chọpụta mgbe na ihe mere i ji ese siga. Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe na-enye aka idekọ mgbe na ebe ị nọ see siga nke ọ bụla n’otu ụbọchị n’akwụkwọ. Nke a ga-enyere gị aka ibu ụzọ hụ ọnọdụ ndị pụrụ ịnwa gị ise siga mgbe ị kwụsịworo ya.

Wepụta Ụbọchị Ị Ga-akwụsị Ya

■ Họrọ ụbọchị ị ga-akwụsị ya, ma kanye akara n’ụbọchị ahụ na kalenda gị. Ọ kasị mma ịhọrọ ụbọchị ị na-agaghị enwe nrụgide onye ọzọ kpatara. Mgbe ụbọchị ahụ ruru, kwụsị ya kpam kpam—na mberede, n’eseghịkwa ya ọzọ.

■ Tupu ụbọchị ahụ ị ga-akwụsị ya eruo, tụfuo efere ntụ siga, na mkpá ọkụ. Sachasịa uwe gị nile na-esi anwụrụ ụtaba anwụrụ ụtaba.

■ Gwa ndị ọrụ ibe gị, ndị enyi gị, na ezinụlọ gị ka ha kwado gị iji gbaa gị ume ná mgbalị ndị ị na-eme ịkwụsị ya. Atụla egwu ịgwa ndị ọzọ ka ha ghara ise siga n’ihu gị.

■ Mee atụmatụ ihe ndị ị ga-eme n’ụbọchị ị ga-akwụsị ya. Ị pụrụ ịga ebe a machibidoro ise siga, dị ka ebe ndebe ihe mgbe ochie ma ọ bụ ebe a na-ekiri ihe. Ị pụkwara imega ahụ—gwuo mmiri ma ọ bụ gbaa ịnyịnya ígwè ma ọ bụ mee mkpagharị ruo ogologo oge.

Ịnagide Nkwụsị Ya

Ọ bụrụ na ị na-ese siga nke ukwuu, o yiri ka ị ga-enwe ihe mgbu ma ị kwụsị ya, bụ́ nke na-amalite awa ole na ole ị kwụsịsịrị ya. Ha pụrụ ịgụnye iwe iwe, enweghị ndidi, ibu iro, nchegbu, ịda mbà n’obi, ehighị ụra nke ọma, ahụ mgbakasị, oké agụụ, na ọchịchọ siri ike nke ise siga. Ikekwe dọkịta gị pụrụ idepụtara gị ọgwụ pụrụ inye aka belata ihe mgbu ndị a. Ọzọkwa, e nwere ihe ndị ị pụrụ ime ga-enyere gị aka imeri n’ọgụ a.

■ N’ime izu ole na ole mbụ ndị siri ike, na-eri ihe oriri ndị nwere calorie dị ala, na-aṅụkwa mmiri nke ọma. Ụfọdụ ndị ahụwo ya dị ka ihe na-enye aka iri ihe oriri ndị a na-esighị n’ọkụ, dị ka karọt na ahịhịa celery. Ọ bụrụ na i megaa ahụ, ọ ga-enyere gị aka ifelata na ibelata ahụ ịma jijiji.

■ Zere ebe na ọnọdụ ndị ga-etinye gị n’ọnwụnwa nke ise siga.

■ Lusoo echiche ndị na-ezighị ezi bụ́ ndị pụrụ ịnwa gị ise siga ọgụ. Ndị a bụ ụfọdụ echiche ndị a na-enwekarị mgbe a kwụsịrị ya: ‘M ga-ese siga nanị taa iji nagide oge ihe isi ike a.’ ‘Ise siga bụ nanị nsogbu m nwere!’ ‘Ụtaba apụghị ịdịcha njọ otú ahụ; ụfọdụ ndị na-ese siga na-adịru ndụ ihe karịrị afọ 90.’ ‘Otu ihe ga-emesị kpata ọnwụ m.’ ‘Ndụ agaghị adị ụtọ ma e wezụga ụtaba.’

■ Ọ bụrụ na ị na-aga ịda n’ọnwụnwa ahụ, cheretụ. Site n’ichere ruo nanị minit iri, oké ọchịchọ ahụ pụrụ ịkwụsị. Mgbe ụfọdụ echiche nke esekwaghị siga ọzọ pụrụ iyi ihe siri ike. Ọ bụrụ na i nwee mmetụta dị otú ahụ, tinye uche n’ịkwụsị ya nanị maka taa.

■ Ọ bụrụ na ị chọrọ ijere Chineke ozi, kpee ekpere maka enyemaka. Onye Okike anyị na-ahụ n’anya pụrụ ‘inyere ndị na-agbalịsi ike ime ka ndụ ha kwekọọ n’uche ya aka n’oge mkpa.’ (Ndị Hibru 4:16) Ma atụla anya ọrụ ebube. Ị ghaghị ime ihe kwekọrọ n’ekpere gị.

Nọgide Na-abụ Onye Na-adịkwaghị Ese Siga

■ Ọnwa atọ mbụ bụ ndị kasị esi ike, ma ọbụna mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe ọ bụla o kwere omume, i kwesịrị izere ndị na-ese siga na ọnọdụ ndị pụrụ ịnwa gị ise siga.

■ Eduhiela onwe gị site n’iche na ị pụrụ ịbụ onye na-ese siga mgbe ụfọdụ, ọbụna ma ọ bụrụ na ị kwụsiwo ise siga ruo otu afọ ma ọ bụ karịa.

■ Guzogide ọnwụnwa nke ise “nanị otu siga.” Nanị otu pụrụ iduga ná ndị ọzọ, n’oge na-adịghịkwa anya ị ga-emebiworị mgbalị nile siri ike i tinyere n’ịkwụsị ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị kụda aka ma see otu siga, ọ dịghị ihe mere ị ga-eji see ọzọ. Ọ bụrụ na ị maliteghachi, kwụsị ya ọzọ.

Ọtụtụ nde ndị na-ese siga enwewo ihe ịga nke ọma n’ịkwụsị ya. Site ná mkpebisi ike na nnọgidesi ike, ị pụkwara ịkwụsị ya!