Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrịa Aids n’Africa—Olileanya Dị Aṅaa Ka E Nwere Maka Narị Afọ Iri Ọhụrụ A?

Ọrịa Aids n’Africa—Olileanya Dị Aṅaa Ka E Nwere Maka Narị Afọ Iri Ọhụrụ A?

Ọrịa Aids n’Africa—Olileanya Dị Aṅaa Ka E Nwere Maka Narị Afọ Iri Ọhụrụ A?

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA ZAMBIA

NA SEPTEMBER gara aga ndị si akụkụ Africa dị iche iche gbakọrọ na Lusaka, Zambia, maka agba nke 11 nke Nnọkọ Mba Nile Banyere Ọrịa AIDS na Ọrịa Ndị A Na-ebute ná Mmekọahụ n’Africa. Otu nzube nke nnọkọ ahụ bụ ime ka e nwee mmekọrịta ka ukwuu n’etiti ógbè ha n’ịza ajụjụ bụ́, Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe maka mgbasa nke ọrịa AIDS n’Africa?

Prọfesọ Nkandu Luo, bụ́ minista Zambia na-ahụ maka ahụ ike mgbe ahụ, kwuru na ọnọdụ dị n’Africa na n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ndị ka na-emepe emepe “dị nnọọ njọ,” na-ekwukwa na ọ “na-akwụsị ọbụnakwa na-emeghasị ụfọdụ n’ime ọganihu ndị dị ịrịba ama e nweworo ná nlekọta ahụ ike nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ọnọdụ akụ̀ na ụba.”

Otu usoro isiokwu e nwere banyere ịdị nchebe nke ọbara na-egosi na e butewo ọrịa AIDS site ná mmịnye ọbara. Otu dọkịta, bụ́ onye nnọchiteanya Ngalaba Na-ahụ Maka Ịdị Nchebe nke Ọbara nke Òtù Ahụ Ike Ụwa, kwuru na ọ bụ ezie na isoro onye nwere ọrịa ahụ nwee mmekọahụ adịchaghị eme ka e bute HIV, onye a mịnyere ọbara ọrịa AIDS dị na ya ga-ebute ya—ihe ọ sọrọ ya mee! E nwere ezi ihe mere dọkịta a ji kwuo na n’ọnọdụ dị otú a “mmịnye ọbara kasị dị nchebe bụ nke a na-amịnyeghị amịnye.”

Nnọkọ ahụ mesiri ya ike na ịdị oké ọnụ nke ọgwụgwọ ọrịa AIDS na-eme ka o siere ndị bu ya ike ịkwụ ụgwọ nlekọta ahụ ike ma ọ bụ ghara ikwe ha omume. Dị ka ihe atụ, ná nkezi, onye Uganda bi n’ebe mepere emepe na-akpata ihe dị ka $200 n’ọnwa. Ma iji ọgwụ ndị na-agwọ ọrịa ndị nje virus na-akpata eme ihe, pụrụ ifu ihe ruru $1,000 kwa ọnwa!

Nnọkọ ahụ e nwere na Lusaka gosiri na mmalite nke narị afọ iri ọhụrụ a agaghị eweta ngwọta dị mfe nye mgbasa nke ọrịa AIDS. Otú ọ dị, ndị mmụta Bible maara na nanị ngwọta e nwere maka ọrịa nile dabeere n’Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, bụ́ onye kwere nkwa na n’ime ụwa ọhụrụ ya, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.

[Map/Foto ndị dị na peeji nke 31]

Prọfesọ Nkandu Luo

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto e sere site n’ike a natara E. Mwanaleza, Times of Zambia