Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Si na Tv—Ole n’Ime Ha Bụ Akụkọ n’Ezie?

Akụkọ Si na Tv—Ole n’Ime Ha Bụ Akụkọ n’Ezie?

Akụkọ Si na Tv—Ole n’Ime Ha Bụ Akụkọ n’Ezie?

Mgbe ha nyochasịrị akụkọ dị 102 si na TV nke obodo 52 mepere emepe dị na United States iji mara ihe ndị dị n’ime ha na ihe ha na-egosi, otu ìgwè na-enyocha usoro mgbasa ozi chọpụtara na ọ bụ nanị pasent 41.3 n’ihe omume ndị ahụ bụ akụkọ. Gịnị bụ ihe ndị ọzọ na-emejupụta akụkọ?

Ná nkezi, ọ bụ mkpọsa azụmahịa mejupụtara pasent 30.4 nke ihe a na-akọ na TV n’oge mgbasa ozi. N’ezie, ụfọdụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị e nyochara na-etinye oge dị ukwuu ná mkpọsa ngwá ahịa karịa n’ịgbasa akụkọ. Tụkwasị na nke a, ihe na-ejupụtakarị n’oge mgbasa akụkọ bụ ihe efu, ka ihe ndekọ e ji chịkọta ihe e metara ná nchọpụta ahụ na-ekwu. * N’okpuru isiakụkọ bụ́ “Ihe Efu,” ihe ndekọ ahụ na-agụnye “oge mgbasa ozi nile a na-etinye ná mkparịta ụka n’etiti ndị nta akụkọ, mkpọsa ngwá ahịa na ịgụpụta isiakụkọ ndị a ka ga-akọ, akụkọ ndị ‘dị ụtọ ná ntị’ ma ọ bụ ndị na-enweghị isi na akụkọ ndị ọzọ banyere ndị a ma ama. Ihe atụ nke akụkọ efu ndị ahụ bụ: “Asọmpi nke Ndị Nwere Olu Abụ Na-adịghị Ụtọ,” “Onye Nta Akụkọ Abanye n’Ihe Egwuregwu ‘Dị Egwu, nke Dị Ịtụnanya,’” na “Ọtụtụ Mmadụ Na-azụ Bred Ndị E Tinyere Anụ n’Ime Ha n’Ụlọ Ahịa.”

Akụkọ dị aṅaa mejupụtara ndị bụ ezigbo ya? Ọ bụ ihe banyere mpụ ka a kasị akọ na TV, na-ewere pasent 26.9 nke oge akụkọ mgbasa ozi. “‘Ọ bụrụ akụkọ banyere ihe ike na ọnwụ, ọ ga-abụ isiakụkọ’ ka nọgidere bụrụ eziokwu doro anya banyere akụkọ TV . . . Ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ pụrụ ịdị ala gburugburu United States n’afọ ole na ole gara aga, ma ọ bụghị n’akụkọ telivishọn nke obodo ahụ.” N’ihi gịnị? Dị ka ndị malitere nnyocha ahụ si kwuo, “ime mpụ na-apụta ìhè ma na-adọrọ uche ndị mmadụ.”

Akụkọ banyere ọdachi bụ ihe ọzọ na-esote ime mpụ, dị ka ọkụ, mkpọka ụgbọala, idei mmiri, na ntiwapụ (pasent 12.2 nke akụkọ), akụkọ egwuregwu na-esochizi (pasent 11.4). Mgbe ahụ a na-akọ akụkọ banyere ahụ ike (pasent 10.1), ọchịchị (pasent 8.7), na ọnọdụ akụ̀ na ụba (pasent 8.5). Isiokwu ndị dị ka agụmakwụkwọ, gburugburu ebe obibi, nkà, na sayensị na-enweta nlebara anya dị nta (site na pasent 1.3 ruo 3.6). N’aka nke ọzọ, akụkọ banyere ihu igwe na-ewere pasent 10 nke ihe nile a na-akọ. “Onye ọ bụla nwere mmasị ikwu banyere ihu igwe, akụkọ TV sokwa,” ka ndị nnyocha ahụ kwuru. Ha na-agbakwụnye, sị: “Ụdị ihu igwe ọ bụla, ma ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ, ma ọ̀ na-ekpo ọkụ ma ọ na-ajụ oyi, udu mmiri ma ọ bụ ọkọchị, pụrụ ịkpali akụkọ buru ibu na TV.”

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ihe odide ahụ na-ekwu na ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ode akụkọ na ndị nkiri hụrụ na ọ dị mkpa ime mgbanwe. Otú ọ dị, nnyocha ahụ na-ekweta na ụdị mgbanwe dị otú ahụ agaghị adị mfe n’ihi na “ndị na-ege akụkọ na anyaukwu dịnụ pụrụ ịnọgide na-eme ka o sie ike inweta akụkọ ndị dị mma.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ihe odide bụ́ Not in the Public Interest—Local TV News in America bụ nke anọ n’ime nnyocha mba a na-eme kwa afọ iji chọpụta ihe ndị dị n’akụkọ. Ọ bụ Dr. Paul Klite, Dr. Robert A. Bardwell, na Jason Salzman, nke Rocky Mountain Media Watch, chịkọtara ya.