Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Akwụkwọ Nduzi Dị Irè Ma Baa Uru”

“Akwụkwọ Nduzi Dị Irè Ma Baa Uru”

“Akwụkwọ Nduzi Dị Irè Ma Baa Uru”

N’OGE okpomọkụ gara aga akwụkwọ bụ́ Arkansas Democrat Gazette nyochara akwụkwọ dị iche iche Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. O kwuru banyere otu n’ime ha, sị: “Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ bụ akwụkwọ nduzi dị irè ma baa uru maka ezinụlọ, n’agbanyeghị okpukpe ha. . . .

“Akwụkwọ a na-enye onye na-agụ ya ọtụtụ ndụmọdụ bụ́ ịgba banyere omume na mmetụta uche. Dị ka ihe atụ, ndị dere ya ghọtara na ndị nile na-eto eto na-achọ inwere onwe ha pụọ ná mmachibido nke ndị mụrụ ha, ma ọ na-enye ndị na-eto eto ndụmọdụ na-esonụ:

“‘Ị̀ chọrọ ka e nyetụkwuo gị nnwere onwe na ibu ọrụ? Mgbe ahụ gosipụta onwe gị ịbụ onye ji ihe akpọrọ ihe. Were ọrụ ọ bụla ndị mụrụ gị kenyere gị dị ka ihe dị mkpa.’

“Ndị nne na nna ole na ole agaghị eji akwụkwọ a kpọrọ ihe bụ́ nke nọgidere na-akụzi na mmadụ ga-aza ajụjụ banyere onwe ya ma nọgidekwa na-adụ ndị na-eto eto ọdụ ka ha kwanyere ma onwe ha ma ndị ọzọ ùgwù. Ọ bụ ezie na akwụkwọ a na-egosikarị ebe Bible kwadoro ndụmọdụ ya, ọ dabeere karịsịa n’ezi uche. . . . Nkebi nke kwuru maka ùgwù onwe onye kasị akpali mmasị, ebe ọ bụ na e duhiewo ọtụtụ ndị na-eto eto iche na ito onwe onye gabiga ókè bụ ihe ziri ezi.”

Mgbe o hotasịrị ihe e dere n’akwụkwọ ahụ, isiokwu ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ihe ncheta ndị a e nyere n’ụzọ dị nro bụ́ na ibuli onwe onye elu bụ ụdị nke nganga nakwa na ịdị umeala n’obi bụ isi ihe ná ndụ onye Kraịst bụ ihe ngwọta nye ụfọdụ echiche nnwere onwe ezi uche na-adịghị na ha ndị enyi na ndị ndụmọdụ nwere ezi nzube obi na-akụnye n’uche ndị na-eto eto.”

Ọ bụrụ na ị ga-achọ irite uru site n’ihe ọmụma dị n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta mpempe akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta na-eji adres e depụtara na ya ma ọ bụkwanụ adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 nke magazin a.

□ Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.

□ Biko Kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.