Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Europe Ọ̀ Ga-adị n’Otu n’Ezie?

Europe Ọ̀ Ga-adị n’Otu n’Ezie?

Europe Ọ̀ Ga-adị n’Otu n’Ezie?

Ọ BỤRỤ na ọ na-esiri gị ike ikwere na Europe anaghị egwu egwu banyere ịdị n’otu, nanị ihe ị ga-eme bụ ịgafe ókèala mba ole na ole dị na ya. Ndị mmadụ na-agagharịzi n’enweghị ihe mgbochi n’ime Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe (EU). Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a naghị egbukwa oge n’ịgafe ókèala mba. N’ezie, nke a na-amasị ndị na-eme njem—ma ọ bụghị nanị ha ga-erite uru. Ugbu a ụmụ amaala mba ndị so na EU pụrụ ịgụ akwụkwọ, rụọ ọrụ, ma guzobe azụmahịa n’ebe ọ bụla n’ime EU. Nke a, n’aka nke ya, edugawo n’ọganihu akụ̀ na ụba ná mba ndị ka daa ogbenye so ná Njikọ ahụ.

Ịgafe ókèala mba n’ụzọ dị mfe bụ mgbanwe gbara ọkpụrụkpụ n’ezie. Otú ọ dị, ànyị ga-ekwubi na Europe adịworị n’otu nakwa na e nweghị ihe mgbochi ọ bụla na-emegide ịdị n’otu? N’ụzọ megidere nke ahụ, ihe mgbochi ka dị n’ihu, ụfọdụ n’ime ha na-akụda mmụọ n’ezie. Ma tupu anyị atụlee ihe ndị a, ka anyị leba anya n’otu n’ime ọganihu ndị kasị ukwuu e nweworo n’iweta ịdị n’otu. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị pụrụ ịghọtakwu ihe mere ndị mmadụ ji enwe oké olileanya maka ịdị n’otu.

Mbọ Ndị A Gbara Iji Nwee Otu Ụdị Ego

Ilekọta ókèala pụrụ ifu oké ego. Iwu ndị metụtara ibubata ngwá ahịa n’etiti mba 15 so na EU nwere mgbe o furu mba ndị ahụ ihe dị ka ijeri euro 12 n’otu afọ. Ọ bụghị ihe ijuanya na ọnọdụ ọhụrụ e nwere n’ókèala mba ndị dị na Europe akwalitewo uto akụ̀ na ụba. Mgbe i chere banyere nde mmadụ 370 bi na EU bụ́ ndị na-aga site n’otu mba ruo n’ọzọ na-azụkọrịta ahịa n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla, o doro anya na ohere e nwere maka ọganihu akụ̀ na ụba dị ịrịba ama. Gịnị mere ọganihu dị otú ahụ ji kwe omume?

Laa azụ na February 1992, ndị ndú ọchịchị mere oké mgbalị inweta ịdị n’otu site n’ịbịanye aka ná Nkwekọrịta Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe, ma ọ bụ Nkwekọrịta Maastricht. Nkwekọrịta ahụ tọrọ ntọala maka iguzobe otu njikọ azụmahịa na Europe, otu ụlọ akụ̀ etiti, na otu ụdị ego. Ma, ọ dị mkpa ka e mee ihe ọzọ: iwepụ mgbanwe a na-enwe n’ọnụ ahịa e ji agbanwere ego. E kwuwerị, ọnụ ahịa a ga-eji gbanwere ego echi pụrụ ime ka e lee ahịa a na-azụ taa anya n’ụzọ dị iche.

E wepụrụ ihe a na-egbochi mgbalị ịdị n’otu site n’iguzobe Njikọ Akụ̀ na Ụba na Ego (EMU) na iwepụta euro dị ka otu ụdị ego a ga-eji na-eme ihe. E nweghịzi ọnụ ahịa e ji agbanwere ego, ọ dịkwaghị mkpa ka ndị achụmnta ego nọrọ na nche megide ihe ọghọm nke ọnụ ahịa e ji agbanwere ego. Ihe ọ rụpụtara bụ imefu ego dị nta n’azụmahịa na inwekwu azụmahịa mba na mba. N’aka nke ya, nke a pụrụ iduga n’inwekwu ọrụ na ịmụba ikike ịzụta ihe nke ego—nke ga-abara onye ọ bụla uru.

Nguzobe e guzobere Ụlọ Akụ̀ Etiti nke Europe na 1998 bụ mgbalị ọzọ pụtara ìhè e mere n’inwe otu ụdị ego. Ụlọ akụ̀ a kwụụrụ onwe ya, nke dị n’obodo Frankfurt, Germany, na-achịkwa ego gọọmenti ndị so ná njikọ ahụ. Ọ na-agbalị ime ka ịrị elu nke ọnụ ahịa dị ala n’ebe a na-akpọ ógbè euro, nke mba 11 mejupụtara, * na ime ka ọnụ ahịa euro e ji agbanwere dollar na yen ghara ịdị na-agbanwegharị.

Ya mere a bịa n’ihe metụtara ego, e nwewo ọganihu dị ukwuu n’inweta ịdị n’otu. Otú ọ dị, ihe ndị metụtara ego na-egosipụtakwa oké adịghị n’otu nke ka dị n’etiti mba ndị dị na Europe.

Ihe Ndị Ọzọ Metụtara Ego

Mba ndị ka daa ogbenye na EU nwere ihe ndị na-ewute ha. Ọ na-adị ha ka mba ndị ka baa ọgaranya so na ya adịghị ewepụtacha akụ̀ na ụba ha ka ha soro keta. Ọ dịghị nke ọ bụla ná mba ndị ahụ na-ekwetaghị na e nwere mkpa inyekwuru mba Europe ibe ha na-abarughị ọgaranya ka ha aka n’ụzọ ego. N’agbanyeghị nke ahụ, mba ndị ahụ ka nwee ego na-eche na ha nwere ezi ihe mere ha ji ala azụ inye aka.

Were Germany dị ka ihe atụ. Ịnụ ọkụ n’obi mba ahụ nwere ịbụ ndị na-eweta ego maka ịdị n’otu Europe adalatawo n’ụzọ doro anya, ugbu a mkpa ego o nwere buworo ibu. Ego o were iji jikọghachi East Germany na West Germany nanị dị ukwuu—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị ijeri dollar n’otu afọ. Nke ahụ bụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke atụmatụ mmefu ego mba ahụ! Ihe ndị a emewo ka ụgwọ mba Germany ji rịa oké elu nke na Germany aghaghị ime mgbalị dị ukwuu iji nweta ihe a chọrọ maka ịbata na EMU.

Ndị Ọhụrụ Na-achọ Ịbata na EU

N’oge na-adịghị anya, ndị na-akwado inwe otu ụdị ego na-atụ anya na mba EU ndị na-esonyebeghị na EMU ga-emeri ihe mgbochi ha tupu afọ 2002, mgbe e chere na a ga-eji mkpụrụ ego na akwụkwọ ego euro dochie anya ego ndị Europe na-eji eme ihe taa. Ọ bụrụ na Britain, Denmark, na Sweden akwụsị ịla azụ, ọbụna ndị bi n’ala ndị ahụ pụrụ ịhụ ka e ji euro dochie pound, kroner, na kronor ha.

Ka ọ dịgodị, mba Europe isii ndị ọzọ na-achọ ịbata na EU. Ha bụ Saịprọs, Czech Republic, Estonia, Hungary, Poland, na Slovenia. Mba ise ọzọ na-eche ka oge nke ha ruo, ha bụ, Bulgaria, Latvia, Lithuania, Romania, na Slovakia. Mbata ha agaghị adị mfe. A na-eme atụmatụ na n’agbata afọ 2000 na 2006, EU aghaghị iwepụta ijeri euro 80 iji nyere mba iri ga-esi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe bata ọhụrụ aka.

Otú ọ dị, ego mba ndị ọhụrụ ahụ na-aghaghị iwepụta iji nweta ihe a chọrọ iji bata na EU ji ọtụtụ okpukpu karịa ego enyemaka ha ga-enweta na EU. Dị ka ihe atụ, Hungary aghaghị imefu ijeri euro 12 n’idozi okporo ụzọ ya na ụzọ ụgbọ okporo ígwè ya. Czech Republic aghaghị imefu ihe karịrị ijeri euro 3.4 n’ime ka mmiri ya dị mma ọṅụṅụ nanị, Poland kwa aghaghị imefu ijeri euro 3 iji belata mwepụta nke ikuku sulphur. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ahụ na-achọ ịbata na-eche na abamuru ya karịrị ihe ọ ga-efu. Otu ihe bụ na azụmahịa ha na mba ndị nọ na EU ga-amụba. Ma, ndị ahụ na-achọ ịbata aghaghị icheretụ. Dị ka ihe ọtụtụ ndị na-eche ugbu a na-egosi, a ga-anabata mba ndị ọhụrụ nanị mgbe EU dozisịrị nsogbu ego o nwere.

Iwe, Ịhụ Mba n’Anya, na Enweghị Ọrụ

N’agbanyeghị mgbalị nile e meworo iji nweta ịdị n’otu ka ukwuu, e nwere nchegbu banyere ihe ndị na-emenụ na Kọntinent ahụ, ma na Europe ma n’ebe ndị na-abụghị Europe. E nwekwara obi erughị ala banyere otú a ga-esi kwụsị esemokwu agbụrụ, dị ka ụdị ahụ e nwere n’ógbè Balkan na-adakpọsị adakpọsị—nke mbụ agha Bosnia, e mesịakwa agha Kosovo. Mba ndị so na EU adịghị ekwekọrịta mgbe mgbe n’otú ha ga-esi dozie esemokwu ndị dị otú ahụ na Europe na gburugburu ya. Ebe ọ bụ na EU abụghị njikọ nke mba nwere otu gọọmenti, gharakwa inwe otu iwu na-achịkwa ya, inwe mmasị ná mba onwe onye na-apụtakarị ìhè. N’ụzọ doro anya, inwe mmasị ná mba onwe onye bụ ihe mgbochi dị ukwuu nye ‘United States of Europe.’

Europe nwere nsogbu ọzọ chọrọ ime ihe ngwa ngwa—ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị na-enweghị ọrụ. Ná nkezi, pasent 10 nke ndị kwesịrị inwe ọrụ enweghị ọrụ. Nke a pụtara na ihe karịrị nde mmadụ 16 enweghị ọrụ. N’ọtụtụ mba, ndị na-eto eto, bụ́ ndị mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi na EU, etinyewo mgbalị dị ukwuu ịchọta ọrụ ma ha achọtaghị. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji eche na ime ihe banyere ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị na-enweghị ọrụ bụ ihe ịma aka mbụ Europe ga-eche ihu! Ka ọ dị ugbu a, mgbalị ndị a na-eme iji dozie ọnọdụ ọrụ arụpụtabeghị ihe ọ bụla.

Otú ọ dị, a ka nwere otu ihe mgbochi ka ukwuu n’inweta ịdị n’otu.

Ònye Ka Ọ Dị n’Aka?

Onye ga-abụ onyeisi ka nọgidere na-abụ ihe mgbochi kasị ukwuu n’inweta Europe nke dị n’otu. Mba ndị so na ya aghaghị ikwekọrịta ókè ha dị njikere ịhapụru ikike mba ha. Nzube EU bụ iguzobe ụdị ọchịchị ga-emetụta mba ndị ọzọ. Ọ bụrụ na e nwetaghị nke a, ka Le Monde na-ekwu, mwepụta nke euro ga-abụ nnọọ “mmeri na-adịru nwa oge.” Otú ọ dị, ọ na-esiri ụfọdụ mba so na EU ike ịhapụ ikike ha. Dị ka ihe atụ, otu onye ndú nke otu mba so na EU kwuru na mba ya bụ “nke a mụrụ ịchị mba ndị ọzọ, ọ bụghị ka a na-achị ya.”

N’ụzọ kwere nghọta, mba ndị ka nta na-atụ ụjọ na mgbe e mesịrị, mba ndị ka ukwuu ga-eweghara ịbụisi, ha ga-ajụkwa ịnakwere mkpebi ndị pụrụ imebi ọdịmma ha. Dị ka ihe atụ, mba ndị ka nta na-eche otú a ga-esi kpebie mba ndị a ga-enwe isi ụlọ ọrụ nke òtù dị iche iche nke EU na ha. Nke a bụ mkpebi dị mkpa n’ihi na ụlọ ọrụ ndị ahụ ga-eme ka e nwekwuo ohere inweta ọrụ ná mba ndị ha dị na ha.

Ka a na-ahụ ihe mgbochi ndị a na-akụda mmụọ n’inweta ịdị n’otu—ahaghị nhata n’ihe banyere akụ̀ na ụba, agha, enweghị ọrụ, na ịhụ mba n’anya—ọ pụrụ iyi ihe dị mfe iwepụ obi n’okwu banyere ịdị n’otu nke Europe. Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na e nwewo ọganihu dị ukwuu. A mabeghị ọganihu ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Nsogbu ndị na-adakwasị ndị ahụ na-agbalị ime ka Europe dị n’otu bụ, n’ezie otu nsogbu ahụ nke na-adakwasị ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ.

Ọ̀ dị mgbe ọ ga-ekwe omume inwe ọchịchị nke pụrụ idozi nsogbu ndị dị otú ahụ dị ka esemokwu agbụrụ, ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị na-enweghị ọrụ, ịda ogbenye, na agha? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu banyere ụwa nke ndị mmadụ bi n’ezi ịdị n’otu? Isiokwu na-esonụ ga-atụle azịza nke pụrụ ịtụ gị n’anya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Mba ndị a bụ Austria, Belgium, Finland, France, Germany, Ireland, Itali, Luxembourg, Netherlands, Portugal, na Spain. N’ihi ihe dịgasị iche, Denmark, Great Britain, Gris, na Sweden abatabeghị.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Euro Apụtala!

Ọ bụ ezie na a gaghị akwụsị iji mkpụrụ ego na akwụkwọ ego mba ndị so ná Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe nwere ugbu a eme ihe ruo 2002, a malitelarị iji euro eme ihe n’azụmahịa ndị na-achọghị ego a na-ahụ anya. Mgbanwe ego a abụrụwo ọrụ buru ibu nye ụlọ akụ̀ dị iche iche. Otú ọ dị, e kpebiwo ọnụ ahịa euro ga-eji na-agbanwere ego mba ndị so na EU. Ebe ndị a na-azụ ahịa ego na-ejikwa euro egosi ọnụ ahịa ego. Ọtụtụ ụlọ ahịa na ụlọ ọrụ achụmnta ego na-ede ọnụ ahịa ngwá ahịa ha ma na euro ma n’ego mba ha.

Azụmahịa dị otú ahụ na-achọ mgbanwe dị ukwuu—karịsịa n’aka ndị meworo okenye, bụ́ ndị na-agakwaghị enwe ike iji deutsche mark, franc, ma ọ bụ lira maara ha ahụ na-eme ihe. Ọbụna ọ ga-adị mkpa idozigharị ígwè e ji agbakọ ego. Iji mee ka mgbanwe a gaa nke ọma ruo n’ókè o kwere mee, gọọmenti ahaziwo mkpọsa ihe ọmụma iji mee ka ndị mmadụ mara banyere mwepụta nke euro na iji ya eme ihe.

N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị fọdụrụnụ, euro na-apụta. N’ezie, ịkpụ na ibi euro amalitelarị. Ọ bụkwa ọrụ buru ibu. Ọbụna n’obere mba dị ka Netherlands, nke nwere ihe dị ka nde mmadụ 15 bi na ya, ígwè ndị na-akpụ ego na ndị na-ebi ego ga-arụgide ọrụ ruo afọ atọ iji mepụta ijeri mkpụrụ ego 2.8 na nde akwụkwọ ego 380 ka ọ na-erule January 1, 2002. Ọ bụrụ na a tụkọba akwụkwọ ego ọhụrụ ndị a nile, ikpó ya ga-eru kilomita 20 n’ịdị elu!

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ọ̀ Bụ “Ibibi Euro”?

Ná mmalite 1999 Òtù Ndị Europe, bụ́ òtù na-achịkwa Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe (EU), fọrọ nke nta ka ọ ghara ịlanarị otu ihe ndọghachi azụ siri ike. E boro òtù ahụ ebubo igwu wayo, nrụrụ aka, na imelara mmadụ ihe. E guzobere kọmitii ga-enyocha ebubo ndị ahụ. Mgbe izu isii nke ime nnyocha gasịrị, kọmitii ahụ chọpụtara na e nwewo igwu wayo na ejizighị ihe n’akụkụ nke Òtù Ndị Europe. Otú ọ dị, kọmitii ahụ mere nnyocha achọpụtaghị ihe àmà na-egosi na ndị so n’òtù ahụ emebawo onwe ha.

Mgbe e bipụtasịrị akụkọ kọmitii ahụ, Òtù Ndị Europe ahụ dum gbara arụkwaghịm na March 1999—ihe a na-ahụtụbeghị mbụ. Ọ kpataara EU oké ọgba aghara. Magazin Time kpọrọ ya “Ibibi Euro.” Ka oge na-aga a ga-amara mmetụta ọgba aghara ahụ ga-enwe n’ihe omume nke ime ka Europe dị n’otu.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọ dịwo nnọọ mfe karị ịgafe ókèala mba ndị dị na Europe

[Foto dị na peeji nke 7]

E guzobere Ụlọ Akụ̀ Etiti Europe, dị na Frankfurt, Germany, na 1998