Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Europe nke Dị n’Otu—Gịnị Mere Ọ Ga-eji Dị Mkpa?

Europe nke Dị n’Otu—Gịnị Mere Ọ Ga-eji Dị Mkpa?

Europe nke Dị n’Otu—Gịnị Mere Ọ Ga-eji Dị Mkpa?

A KWỤPERE ọtụtụ mmanya champagne. Ihe ndị na-agbapụ ọkụ jupụtara n’igwe. Gịnị ka a na-eme? Ọ̀ bụ narị afọ iri ọhụrụ? Ee e, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na ihe omume a dị ịrịba ama karịa mgbanwe nkịtị nke akara ụbọchị. Ọ bụ January 1, 1999. N’ụbọchị ahụ, e mere ka mmadụ nile mara banyere mwepụta nke otu ego ọhụrụ nke Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe (EU) ga-eji na-eme ihe—ụdị ego nke a kpọrọ euro.

Ọtụtụ ndị Europe hụrụ mwepụta nke ego ha nile ga-eji na-eme ihe dị ka mgbalị pụtara ìhè e mere iji weta ịdị n’otu nke Europe na-achọ eri ogologo oge. Akwụkwọ akụkọ Netherlands bụ́ De Telegraaf toro mwepụta nke euro ahụ dị ka “ihe gbara ọkpụrụkpụ a rụzuru n’ime ka Europe dị n’otu.” N’ezie, mgbe ọtụtụ iri afọ nke inwe olileanya, iso mba ndị ọzọ kwurịta okwu, na igbu oge gasịrị, o yiri ka a ga-enweta ịdị n’otu nke Europe karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

N’eziokwu, ndị na-ebighị na Europe nwere ike ịdị na-achọ ịmata ihe a na-emere mkpọtụ a nile. Mwepụta nke euro na mgbalị a na-eme inweta ịdị n’otu na Europe pụrụ iyi ihe na-emetụtachaghị ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Otú ọ dị, ịdị n’otu nke Europe ga-eweta njikọta akụ̀ na ụba kasị ukwuu n’ụwa. Ya mere ọ ga-esi ike ileghara Europe nke dị n’otu anya—n’agbanyeghị ebe mmadụ bi.

Dị ka ihe atụ, na nso nso a Osote Odeakwụkwọ Mba United States bụ́ Marc Grossman gwara ndị na-ege ya ntị n’Ebe Ugwu America, sị: “Ọganihu anyị nwere ihe jikọrọ ya na Europe.” N’ihi gịnị? N’ime ihe ndị o kwuru kpatara ya bụ na “otu onye n’ime mmadụ 12 ọ bụla na-arụ n’ụlọ ọrụ dị na United States nwere ọrụ o ji n’otu n’ime ụlọ ọrụ achụmnta ego 4,000 dị na United States bụ́ nke ndị Europe.” A kọkwara na ego ọhụrụ nke Europe pụrụ imetụta ọnụ ahịa nke ngwá ahịa ndị a tụbatara atụbata—na ọbụna ego ọmụrụ nwa—ná mba ndị dị anya na Europe.

Mba ndị na-emepe emepe nwere ike irite uru. N’ụzọ dị aṅaa? Otu akụkọ na-ekwu, sị: “Iji euro dochie anya ego dị iche iche e nwere na Europe ga-eme ka mmekọrịta azụmahịa dị n’etiti mba ndị na-emepe emepe na EU dị mfe.” Ọzọkwa, ụfọdụ ndị na-ekwu na ụlọ ọrụ achụmnta ego ndị Japan na United States dị na Europe ga-erite uru. Ebe a maliteworo iji euro eme ihe, a gaghị enwezi mgbanwe n’ọnụ ahịa e ji agbanwere ego ná mba ndị dị na Europe. Ịzụ ahịa na Europe pụrụ ịbụ ihe ga-eweta uru karị.

Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịga Europe, ị pụrụ ịhụkwa uru nke ịdị n’otu Europe. N’oge na-adịghị anya ị ga-enwe ike iji euro, bụ́ ego nke fọrọ nke nta ka ya na dollar United States hara nhata, zụrụ ma nweta ihe ná mba ndị dị na Europe. A gaghịzi enwe ndị na-eme njem ji mgbagwoju anya na-ejigharị gulden, franc, lire, deutsche mark, na ígwè mgbakọ ego na-aba n’akpa uwe.

Otú ọ dị, mgbalị Europe na-eme ịbụ kọntinent dị n’otu na-eweta ihe ọzọ na-akpali akpali—olileanya. Cheedị banyere ya, n’iri afọ ole na ole gara aga Europe nọ n’agha. E si otú ahụ lee ya anya, ịdị n’otu nke Europe bụ ihe ịtụnanya. Ndị mmadụ n’ụwa nile na-ekiri ihe na-emenụ.

Ọtụtụ ndị ka na-eche ma ịdị n’otu ụwa ọ̀ bụzi ihe a pụrụ ịtụ anya ya n’ikpeazụ. Nke a bụ atụmanya na-akpali akpali n’ezie! Mgbalị Europe na-eme ịdị n’otu ọ̀ ga-eme ka ụmụ mmadụ ruwe oge iweta ụwa dị n’otu? Tupu a zaa ajụjụ ahụ, ọ dị anyị mkpa ile anya nke ọma n’ịdị n’otu nke Europe. Ihe ndị dị aṅaa ga-egbochi mgbalị ịdị n’otu ka ọ dị mkpa ka e wepụ?

[Igbe/Chaatị dị na peeji nke 4]

Ọ̀ BỤ ỊDỊ N’OTU NKE A NA-AKWADEBE INWE?

Echiche nke ịdị n’otu nke Europe abụchaghị ihe ọhụrụ. E nwetụrụ ịdị n’otu n’oge Alaeze Ukwu Rom, mgbe ahụ n’oge Charlemagne na-achị, na mgbe e mesịrị n’oge Napoléon Mbụ na-achị. N’oge ndị ahụ, ịdị n’otu dabeere ná mmanye na ná mmeri. Otú ọ dị, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ọtụtụ mba ndị agha tisasịrị hụrụ mkpa ọ dị inwe ịdị n’otu dabeere n’imekọrịta ihe. Mba ndị a, tụrụ anya na imekọrịta ihe dị otú ahụ abụghị nanị na ọ ga-eme ka ọnọdụ akụ̀ na ụba ha ka mma kamakwa ọ pụrụ ịkwụsị agha. Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ e meworo nke dugara n’ọnọdụ ndị e nwere ugbu a:

1948 Ọtụtụ narị ndị ndú ọchịchị nke Europe agbakọta na The Hague, Netherlands, ma ṅụọ iyi sị: “Anyị agaghị alụsokwa ibe anyị ọgụ ọzọ.”

1950 France na Germany amalite imekọrịta ihe iji chebe ụlọ ọrụ ha ndị na-emepụta kol na ígwè. Mba ndị ọzọ esonyere ha, nke a edugakwa ná nguzobe nke Mba Ndị Na-emepụta Kol na Ígwè nke Europe (ECSC). ECSC amalite ọrụ na 1952, na-agụnyekwa Belgium, France, Itali, Luxembourg, Netherlands, na West Germany.

1957 Mba isii mejupụtara ECSC eguzobe òtù abụọ ọzọ: Njikọ Azụmahịa Mba Ndị Dị na Europe (EEC) na Njikọ Mba Ndị Dị na Europe Nwere Ike Atọm (Euratom).

1967 EEC na ECSC na Euratom ejikọta aka guzobe Mba Ndị Dị na Europe (EC).

1973 EC anabata Denmark, Ireland, na United Kingdom.

1981 Gris esonye na EC.

1986 Portugal na Spain esonye na EC.

1990 A mụbakwuo EC mgbe West Germany na East Germany jikọrọ ọnụ, na-ewebata ebe bụbu East Germany n’òtù ahụ.

1993 Mgbalị mba ndị mejupụtara EC na-eme iji nwetakwuo ịdị n’otu azụmahịa na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị eduga n’ikepụta Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe (EU).

2000 Ihe mejupụtara EU abụrụ mba 15​—⁠Austria, Belgium, Denmark, Finland, France, Germany, Gris, Ireland, Itali, Luxembourg, Netherlands, Portugal, Spain, Sweden, na United Kingdom.

[Foto dị na peeji nke 3]

Euro ga-anọchi anya ọtụtụ ego ndị Europe

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

Euro na akara euro na peji nke 3, 5-6, na 8: © European Monetary Institute