Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Nnụnụ Pụrụ Ịkụziri Onye Mkpọrọ?

Gịnị Ka Nnụnụ Pụrụ Ịkụziri Onye Mkpọrọ?

Gịnị Ka Nnụnụ Pụrụ Ịkụziri Onye Mkpọrọ?

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SOUTH AFRICA

DỊ KA e dere na Sunday Tribune nke Durban, South Africa, nnụnụ na-ekere òkè n’ịgbanwe obi ndị mkpọrọ nọ n’Ụlọ Mkpọrọ Pollsmoor. Mmadụ 14 a mara ikpe na-ekere òkè ugbu a n’ihe omume metụtara ilekọta icheoku n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ha.

Olee otú ihe omume ahụ si aga? Onye mkpọrọ nke ọ bụla na-ekere òkè nwere ihe na-abụ àkwá aka mere n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ya. A na-enye onye mkpọrọ ahụ otu nwa nnụnụ a bụrụ ọhụrụ ilekọta, bụ́ onye na-enye nwa nnụnụ ahụ nri n’ọnụ kwa otu awa ma ọ bụ abụọ, ehihie na abalị, ruo ihe dị ka izu ise. Mgbe ahụ a na-etinye nnụnụ ahụ n’ime ụlọ nnụnụ, bụ́ nke a na-edebekwa n’ime ọnụ ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe nnụnụ ahụ toro, a na-eresị ya ọha na eze. Ụfọdụ ndị mkpọrọ na-enwe oké mmasị ná nnụnụ ha nke na ha na-ebe ákwá mgbe a na-ewepụ ha.

A na-ahụ ọbụna ka ụfọdụ ndị omekome obi tara mmiri na-aghọ ndị nwere obi ọmịiko ma na-eme nwayọọ nwayọọ mgbe ha gwasịrị nnụnụ ndị ahụ okwu ma lekọta ha kwa ụbọchị. Otu onye mkpọrọ kwuru, sị: “Ana m azụ nnụnụ ndị ahụ, ma ha azụwokwa m.” Onye ọzọ kwuru na nnụnụ ndị ahụ kụziiri ya inwe ndidi na njide onwe onye. Otu onye ohi a mara ikpe kwuru na ilekọta nnụnụ mere ka ya ghọta na ịbụ nne ma ọ bụ nna “bụ nnukwu ibu ọrụ”—ihe ọ na-emeghịrị ụmụ ya mgbe a na-atụbeghị ya mkpọrọ.

Ilekọta nnụnụ ndị a nwere abamuru ọzọ nye ndị mkpọrọ. “Site na nkà ha mụtara n’ebe a,” ka Wikus Gresse, bụ́ onye chepụtara ihe omume ahụ, na-ekwu, “ndị na-azụ nnụnụ ma ọ bụ ndị na-agwọ ụmụ anụmanụ ọrịa pụrụ inye ha ọrụ ma ha pụọ.”