Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Ụlọ Ọrụ Na-emepụta Ụtaba Ekweta na Ise Siga Na-akpata Ọrịa Cancer
Ka ọtụtụ iri afọ nke ịgbagha nchọpụta nke ndị ọrụ ahụ ike dị iche iche mere gasịrị, Philip Morris, bụ́ ụlọ ọrụ kasị emepụta siga na United States, ekwetawo ugbu a na ise siga na-akpata ọrịa cancer akpa ume na ọrịa ndị ọzọ na-egbu egbu. Otu ozi ụlọ ọrụ ahụ nyere ụlọ ọrụ mgbasa ozi, na-ekwu, sị: “E nwere nkwekọrịta dị ukwuu nkà ịgwọ ọrịa na nkà mmụta sayensị nwere bụ́ na ise siga na-akpatara ndị na-ese ya ọrịa cancer akpa ume, ọrịa obi, emphysema, na ọrịa ndị ọzọ siri ike.” The New York Times na-ekwu na “n’oge gara aga, ụlọ ọrụ ahụ arụwo ụka . . . na ise siga ‘bụ ihe so akpata’ ma ọ bụ ‘ihe sotụ akpata’ ihe ize ndụ n’ọrịa ndị dị ka ọrịa cancer akpa ume, ọ bụghị na ọ na-akpata ọrịa ahụ.” Otú ọ dị, n’agbanyeghị nkweta a, ụlọ ọrụ ahụ na-ekwu sị: “Anyị ji ụdị siga anyị na-emepụta na otú e si akpọsa ha bụ́ nke kwadoworo ha ruo ọtụtụ afọ, eme ọnụ.”
Ihe Nhụwa Ama Na-apụ n’Anya
Ụlọ ebe a na-echekwa ọka ji nwayọọ nwayọọ na-apụ n’anya n’ugbo ọka nke ebe ọdịda anyanwụ Canada. E nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ụlọ nchekwa ọka na 1933, bụ́ mgbe e nwere 5,758 jupụtara n’ime ime obodo. Kemgbe ahụ ọnụ ọgụgụ ahụ agbadawo ruo 1,052. Gịnị kpatara ya? Otu onye hụrụ ntikpọ nke otu ụlọ nchekwa ọka kwara arịrị, sị: “Oge agbanwewo nke ukwuu. Ọrụ ugbo bụzi ọrụ ugbo azụmahịa. Ugbo ezinụlọ na-apụ n’anya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụlọ nchekwa ihe.” “Ugbo ọka na-enweghị ụlọ nchekwa ọka ga-eyitụ Venice na-enweghị ọwà mmiri, New York na-enweghị ụlọ ndị dị oké elu ma ọ bụ Britain na-enweghị ụlọ mmanya,” ka magazin bụ́ Harrowsmith Country Life na-akọ. Òtù ndị nwere mmasị pụrụ iche na-arụ ọrụ iji chekwaa ihe e lere anya dị ka ihe owuwu ndị e ji mara ógbè ọrụ ugbo nke Canada. E ji otu ụlọ nchekwa ọka mee ụlọ ndebe ihe ochie ma jiri nke ọzọ mee ụlọ oriri a na-eme ihe nkiri na ya.
Ọ Dịghị Mgbe Oge Na-ezu
Na Europe nile, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụ mmadụ, na-eme ihe ọkụ ọkụ, ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Gießener Allgemeine na-akọ. Otu ihe ahụ bụkwa eziokwu ma ndị mmadụ hà na-arụ ọrụ n’ebe na-abụghị ụlọ ha, n’ụlọ ha ma ọ bụ mgbe ha na-atụrụ ndụ. “Ndị mmadụ na-ehi ụra dị nta, na-eri nri ọkụ ọkụ, ma na-abụ ndị na-adịghị enwekwa ohere n’ọrụ karịa ka ọ dị n’afọ 40 gara aga,” ka ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Manfred Garhammer, nke Mahadum Bamberg, na-ekwu. Ọ chọpụtara na ndụ a na-adị kwa ụbọchị agawo ọkụ ọkụ ná mba Europe nile o nyochara. Ngwá ọrụ ndị na-eme ka ọrụ ụlọ dị mfe na mbelata nke oge a na-etinye n’ọrụ emebeghị ka e nwee “ọha mmadụ na-atụrụ ndụ” ma ọ bụ “oge dị ukwuu.” Kama nke ahụ, ná nkezi, oge e ji eri nri ejiriwo minit 20 belata, oge ezumike anyasị ejiriwokwa minit 40 belata.
Iri Ahụ nke Ịgba Chaa Chaa n’Australia
“Ịgba chaa chaa bụzi nsogbu ahụ ike siri ike n’Australia, na-emetụta kpọmkwem ihe dị ka 330,000 ndị ịgba chaa chaa riri ahụ,” ka The Australian na-akọ. Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ si kwuo, ihe karịrị 1 n’ime ígwè electronic 5 e ji agba chaa chaa n’ụwa nile dị n’Australia, ebe pasent 82 nke ndị toruworo ogo mmadụ bi na ya na-agba chaa chaa. Otu òtù na-enyocha ụlọ ọrụ ịgba chaa chaa n’Australia chọpụtara na pasent 2.3 nke ndị Australia toruworo ogo mmadụ nwere nsogbu siri ike nke ịgba chaa chaa. N’ime ndị a, pasent 37 achọwo igbu onwe ha, ihe karịrị pasent 11 anwawo igbu onwe ha, pasent 90 kwa kwuru na ha nwere oké ịda mba n’obi n’ihi ịgba chaa chaa. Òtù ahụ kwuru ka e mezigharịa ịgba chaa, tụọkwa aro ka e debe saịn bọdụ ịdọ aka ná ntị n’ụlọ ebe a na-agba chaa chaa.
Ịlụso Nrụgide Ọgụ
Ị̀ na-enwe nrụgide? Dị ka a kọrọ na El Universal, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchebe Ọha na Eze nke Mexico na-atụ aro ụkpụrụ nduzi na-esonụ dị ka ihe ga-enye aka ịlụso ahụ erughị ala ọgu. Hie ụra ruo ókè ahụ gị chọrọ—site na awa isii ruo iri kwa ụbọchị. Rie nri ụtụtụ zuru ezu ma na-edozi ahụ, nri ehihie kwesịrị ekwesị, na nri anyasị na-ebughị ibu. Ọzọkwa, ndị ọkachamara na-atụsi aro ike ka i belata iri ihe oriri ndị nwere abụba dị ukwuu, belata ọ̀tụ̀tụ̀ nnu ị na-eri, ma belata ịṅụ mmiri ara ehi na ịra shuga, mgbe ị gafesịrị afọ 40. Gbalịa iwepụta oge maka ntụgharị uche n’ọnọdụ dị jụụ. Belatakwuo nrụgide site n’ikiri ihe ndị e kere eke.
Iji Nsí Achọ Mma
Usoro ịchọ mma nke gụnyere ịgbanye nsí botulin n’ime ahụ bụ nke e ji eme ihe ugbu a iji wepụ ihu ndọlị, ka The Toronto Star na-akọ. Nsí ahụ na-akpọnwụ uru ahụ ụfọdụ dị n’ihu, bụ́ nke ike na-agwụ n’ime ụbọchị ole na ole, na-eme ka ihu ndọlị pụchaa. Ọgwụgwọ ahụ na-ewe ihe dị ka ọnwa anọ ma na-eme ka onye ahụ nwee ọdịdị dị mma na nke onye ntorobịa. Otú ọ dị, e nwere nsogbu na-esi na ya apụta. Akwụkwọ ahụ na-adọ aka ná ntị na “ndị na-eji ya eme ihe na-ewepụ ihu ndọlị ha, ma na-ewepụkwa ikike ha nwere iweli iku anya ha elu mgbe ha hụrụ ihe ịtụnanya, ịchịpụta ọchị, [na] ịgbarụ ihu.” Ọ pụtara ịdị njikere “ịkpọnwụ akụkụ dị iche iche nke ihu gị maka ịma mma ntorobịa,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.
“Olee Ndị Chineke Dịnyeere?”
“Ebughị m n’obi ilelị nkwenkwe onye ọ bụla,” ka onye na-ede akụkọ egwuregwu bụ́ Sam Smith na-ede, “ma ọ̀ bụ na ngosipụta a nke iji okpukpe kpọrọ ihe agabigabeghị ókè n’egwuregwu? N’ihi gịnị ka ndị na-agba bọl ji ekpe ekpere mgbe ha nyesịrị gol?” A pụkwara ịhụ otu ndị ahụ na-eme egwuregwu bụ́ ndị na-ekpe ekpere mgbe e mesịrị egwuregwu ka “ha na-akọcha ndị nta akụkọ” n’ọnụ ụlọ mgbanwe ákwà ha ma ọ bụ ka “ha na-agbalị imerụ ndị so eme egwuregwu ahụ” mgbe asọmpi egwuregwu biiri ọkụ, ka Smith na-ekwu. Iche na Chineke na-adịnyere otu òtù karịa nke ọzọ “yiri ilelị ikwere na Chineke anya,” ka ọ na-ekwu. N’ihi ya, ihe odide ya na-ekwubi, sị: “Ka anyị ghara ime ka egwuregwu karịa ihe ọ bụ.”
Ọrụ Ndị Dị Ize Ndụ
Olee ọrụ iri kasị dịrị ize ndụ? Dị ka ọnụ ọgụgụ nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ọmụma Metụtara Ọrụ nke United States dekọrọ si gosi, ndị na-awa osisi bu ụzọ na-enwe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 129 n’ime 100,000 na-anwụnụ, ebe ndị ọkụ azụ na ndị na-arụ n’ụgbọ mmiri na-esochi na-enwe ihe dị ka mmadụ 123 na 94 na-anwụnụ n’ime 100,000 ndị ọrụ. Ọ bụrụ na e dekọọ ya site n’elu gbadaa, ọrụ ndị ọzọ dị ize ndụ bụ nke ndị na-anya ụgbọelu, ndị na-arụpụta ígwè e ji ewu ihe owuwu, ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala, ndị na-ewu ihe owuwu, ndị na-anya tagzi, ndị na-anya gwongworo, na ndị ọrụ ugbo. Otú ọ dị, “ọ̀tụ̀tụ̀ mmerụ ahụ na-akpata ọnwụ ndị a na-enwe n’ebe ọrụ—4.7 n’ime 100,000 mmadụ ọ bụla e were n’ọrụ—ejiwo ihe dị ka pasent 10 gbadata” n’ime afọ ise gara aga, ka Scientific American na-akọ.
Nnụnụ Ndị Dị Akọ!
“Egwele ndị dị na Calcutta na-ezere ọrịa ịba,” ka magazin France na-akọ banyere okike bụ́ Terre Sauvage na-ekwu. Ndị ọkachamara achọpụtawo na ka ịba na-amụba, egwele na-efega ebe dị anya ugbu a ịchọ akwụkwọ osisi ndị a maara nke ọma na ha nwere quinine n’ụba, bụ́ ọgwụ na-agwọ ịba. Tụkwasị n’idebe akwụkwọ ndị ahụ n’ime akwụ́ ha, o doro anya na nnụnụ ndị a na-eri ha eri. “O yiri ka egwele ndị a nwere mmasị n’obodo ukwu ma na-atụ egwu ịba hà achọpụtawo ụzọ ha pụrụ isi chebe onwe ha,” ka magazin ahụ na-ekwu.
Ego Ruru Unyi
Akwụkwọ akụkọ bụ́ Guardian na-akọ na e ji cocaine tetọọ ihe karịrị pasent 99 nke akwụkwọ ego ụlọ akụ dị na London. Ndị ọkachamara nyochara akwụkwọ ego dị 500 ma chọpụta na 496 nwetụrụ ọgwụ ọjọọ n’elu ha. Ntetọ ahụ na-amalite mgbe ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe metụrụ ego ndị ahụ aka. Ego ndị a na-etetọzi ego ndị ọzọ mgbe e ji ígwè na-agụ ego gụọ ha ma ọ bụ mgbe e dokọrọ ha n’otu ebe. Cocaine aghọwo ọgwụ ndị nọ n’afọ ndụ 20 ruo 24 kasị eji emere ọgwụ ntụrụndụ na Britain. Dị ka Atụmatụ Ọrụ Maka Ọdịmma Ndị Ntorobịa nke dị na London si kwuo, ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eji cocaine eme ihe n’ihi na ha chere na ọ na-eme ka a marakwuo ha ma na-amụbawanye ike ha.
“Ọrịa Ndị A Kasị Ebute Site n’Ọbara”
“Ọ dịkarịa ala nde ndị America 2.7 bu nje ịba ọcha n’anya nke C, na-eme ka ọ bụrụ ọrịa a kasị ebute site n’ọbara na United States,” ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi Associated Press na-akọ. Ụzọ kasịnụ e si ekesa ịba ọcha n’anya nke C site n’otu onye gaa n’ọzọ bụ site ná mmekọahụ ma ọ bụ ọbara ndị bu nje. Ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ ibute ọrịa ahụ bụ ndị na-ejikọrịta otu ntụtụ agbanye ọgwụ ọjọọ n’ahụ ha na ndị na-enwe mmekọahụ n’eyighị condom. Otú ọ dị, a pụkwara ikesa ọrịa ahụ site n’aka ndị na-egbu egbugbu na ndị na-agbapu ahụ bụ́ ndị na-adịghị asacha ngwá ọrụ ha nke ọma. Ndị narawooro ọbara nọkwa n’ihe ize ndụ. Kwa afọ, ihe dị ka 1,000 mmadụ na United States na-anara ọgwụgwọ mbugharị imeju n’ihi mmebi imeju nke nje ahụ kpatara.