Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ịhụnanya Kpuru Ìsì

Mgbe Ịhụnanya Kpuru Ìsì

Mgbe Ịhụnanya Kpuru Ìsì

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SPAIN

KA E were ya na ị na-achọ nwanyị ị ga-alụ ma ị dịghị ahụ ihe nọ n’ebe dị anya nke ọma, ụmụ agbọghọ dị mma ana-apụtakwa nanị n’abalị. Ọnọdụ dị otú ahụ ka nla nke oké nọ na ya. Ma ahụhụ a mara mma nwere ihe ụfọdụ nke na-eme ka ihe ịma aka a dị egwu ghara isi oké ike.

N’ọnwa oge okpomọkụ, nla nke oké bụ́ nke gaje ịchọ nke nne na-eri ihe nile ọ pụrụ ịhụ n’oge ọ bụ nnukwu ọbụbụ. N’ihi ya, n’oge opupu ihe ubi na-esonụ, mgbe o tozukwuru, nla ahụ mara mma ga-eriworị nri ga-edu ya n’oge ndụ ya dum—nke na-abụrụ ya nanị ọnwa abụọ.

Ebe o gboworo mkpa ihe oriri, nla ukwu ahụ pụrụ ilekwasị anya n’ọrụ ịchọta nwunye. Ka o sina dị, a sị na ọ bụghị otu ngwá ọrụ ọ na-ebu agagharị, iji ìhè nke ọnwa achọta nke nne gaara esi ike dị ka ịchọ ewu ojii mgbe chi jiworo.

E nwere mpi abụọ dị peke peke na-etopụta n’isi pere mpe nke nla ahụ. Ihe ndị a topụtara n’isi ya nwere ike ịbụ ngwá ọrụ kasị bụrụ ọkpọka a na-eji amata ísì n’ụwa. Ọzọkwa, e mere ha n’ụdị dị mma ịmata “ísìsì” ndị kasị nta nla nke nne ga-ewepụtarịrị.

Ọ bụ ezie na ndị nke nne pụrụ ịdị ole na ole ma nọrọ n’ebe dị anya, ísìsì ha dị ike na-arụ ọrụ dị ka ihe na-akpali ihe na-amata ísìsì. Mpi nla nke oké dị nkọ nke ukwuu nke na ha pụrụ ịmata nke nne nọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 11 site n’ebe ha nọ. N’ụzọ dị otú a, ha na-emesị merie ihe mgbochi nile, nla nke oké ahụ na-emesịkwa zute nke nne. Ịhụnanya pụrụ ikpu ísì n’ala ụmụ ahụhụ—ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ọnọdụ a.

Ihe Chineke kere jupụtara ná nkọwa ndị dị otú ahụ na-adọrọ mmasị na ọdịdị pụrụ iche! Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile.”—Abụ Ọma 104:24.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

© A. R. Pittaway