Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peji nke 27. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee mbipụta bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)
1. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs gwara nwanyị Sameria na a ghaghị isi fee Chineke ofufe? (Jọn 4:24)
2. Gịnị ka Chineke na-enye ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha wee nagide nrụgide na mkpagbu? (2 Ndị Kọrint 4:7–10)
3. Ònye bụ nwa nwoke ikpeazụ nke Onyeikpe Gideọn, bụ́ onye nanị ya fọdụrụ n’ime ụmụ ya ndị ikom 70, nke nwanna ya bụ́ Abimelek na-egbughị? (Ndị Ikpe 9:5)
4. Olee aha e nyere afọ nke 50 mgbe Israel banyesịrị n’Ala Nkwa ahụ, bụ́ mgbe a na-akpọsa nnwere onwe n’ala ahụ dum? (Levitikọs 25:10)
5. Olee alaeze nta nke ụmụ ndị ikom Amọn si na ya nara ndị ikom 12,000 na-alụ agha ná ngo iji lụso Devid agha? (2 Samuel 10:6)
6. Gịnị ka Eze Babilọn bụ́ Nebukadneza hụrụ ná nrọ n’afọ nke abụọ nke ọbụbụeze ya nke nyere ya nsogbu nke ukwuu? (Daniel 2:1, 31)
7. Gịnị ka Samson ji aka nkịtị dọwaa abụọ dị ka ọ dị n’ihe ndekọ mbụ e dekọrọ banyere ojiji o ji ume Chineke nyere ya mee ihe? (Ndị Ikpe 14:5, 6)
8. Olee anụ Abraham hụrụ ka alụghụlụ jidere ya na mpi, bụ́kwa nke o ji chụọ àjà n’ọnọdụ Aịsak? (Jenesis 22:13)
9. Site n’ime gịnị ka Eze Sọl mebiri iwu Jehova n’ihe banyere agha ahụ ọ lụsoro ndị Amalek? (1 Samuel 15:3–9)
10. Mgbe ha lọtasịrị ná ndọrọ n’agha na Babilọn, olee aha e nyere Etanim, bụ́ ọnwa mbụ nke kalenda ndị Juu?
11. Olee ebe nne na nna Jisọs chọtara nwa ha nwoke dị afọ 12 mgbe ha chọgharịsịrị ya ruo ụbọchị atọ? (Luk 2:46)
12. Ònye ka e buru n’amụma ka ọ ṅụrịa ọṅụ maka mbanye mmeri Jisọs ga-eji nwa ịnyịnya ibu banye na Jerusalem? (Zekaraịa 9:9)
13. N’ihi gịnị ka Jisọs ji nye ndụmọdụ ka a ‘kpadoo akụ̀ n’eluigwe’? (Matiu 6:20)
14. Gịnị ka Jehova mere iji gosipụta iwe ya megide Solomọn mgbe Solomọn malitere ịchụ àjà nye chi ọzọ dị iche iche n’oge o mere agadi? (1 Ndị Eze 11:14, 23–26)
15. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ ichebe karịa ihe ọ bụla ọzọ? (Ilu 4:23)
16. Gịnị ka Eze Jehoịakim mere mgbe a gụụrụ ya akwụkwọ mpịakọta ahụ nke bu okwu Jehova kwuru megide Israel? (Jeremaịa 36:23)
17. Gịnị ka Jekọb weere na ọ bụ ya gburu nwa ya nwoke bụ́ Josef? (Jenesis 37:33)
18. Site n’oge ochie, olee obodo a maara dị ka “obodo nkwụ”? (Deuterọnọmi 34:3)
Azịza Nye Ajụjụ
1. “N’ime mmụọ na eziokwu”
2. “Ọkịka nke ike”
3. Jotam
4. Jubile
5. Tob
6. Nnukwute onyinyo mmadụ, nke ọla dịgasị iche mejupụtara akụkụ ahụ ya nile
7. Nwa ọdụm tozuru etozu
8. Ebule
9. Ọ hapụrụ igbu eze ha bụ́ Egag, tinyere ìgwè ewu na atụrụ ha ndị kasị mma
10. Tishri
11. N’ụlọukwu
12. “Ada Zaịọn”
13. Akụ̀ a na-ahụ anya na-ala n’iyi, ọ dịghịkwa eme ka e nwee ihu ọma Chineke
14. Ọ kwụsịrị ịgọzi ya ma mee ka ndị mmegide bilitere Solomọn
15. Obi ihe atụ
16. O bekasịrị ya ma tụba ya n’ọkụ
17. “Ajọ anụ”
18. Jeriko