Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụnanya Ndị Kraịst—Mgbe E Nwere Ugwu Mgbawa

Ịhụnanya Ndị Kraịst—Mgbe E Nwere Ugwu Mgbawa

Ịhụnanya Ndị Kraịst—Mgbe E Nwere Ugwu Mgbawa

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA CAMEROON

OTU nnukwu ihe gbawara n’ụzọ dị egwu n’afọ gara aga n’otu mba dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, bụ́ Cameroon. Ugwu Cameroon ji sentimita 4,070 karịa elu oké osimiri. E kwuru na nke a—nke ugboro ise ugwu ahụ na-agbawa na narị afọ nke 20—bụ nke kasị ukwuu ma dị njọ e nwetụrụla.

Ọdachi ahụ malitere n’ehihie Saturday, March 27, 1999. Ndị bi n’obodo Buea, bụ́ nke dị ná mkpọda ugwu ahụ, ndị hụrụ mgbe o mere kọrọ na mgbidi, ụlọ, na ọbụna osisi mara jijiji nke ukwuu. Ná mgbede echi ya, mgbe o ji ihe dị ka ọkara gafee elekere anya asatọ, ógbè ahụ mara jijiji, n’ụzọ kasị dị ukwuu ma dị egwu. O metụtara ndị nọ na Douala dị kilomita 70 site n’ebe ahụ. Isiakụkọ Le Messager nke Tuesday, March 30, 1999, bụ: “Mgbawa nke Ugwu Cameroon—Mmadụ 250,000 Na-eche Ọkụ Ihu.” Ọ gara n’ihu, sị: “Ala mara jijiji ugboro 50 n’ime ụbọchị abụọ; e nweworị òkòkòrò 4; ọtụtụ narị ụlọ emebiela; ebe obibi president na Buea adakpọọla.”

Ihe dị ka mmadụ 80 n’ime Ndịàmà Jehova bi na Buea. Ọtụtụ ụlọ obibi mebiri kpam kpam, gụnyere otu nke e ji mere Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otú ọ dị, ọ dịghị onye nwụrụnụ.

Ịhụnanya Ndị Kraịst Nọ n’Ọrụ

E tinyere ịhụnanya ndị Kraịst n’ọrụ ozugbo iji mezie mbibi nke ajọ nnukwu ihe a kpatara. E hiwere kọmitii enyemaka, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova mere ndokwa inye ego dị oké mkpa, ọtụtụ narị Ndịàmà jikwara ịhụnanya wepụta oge, ike, na ego ha ozugbo.

Ọtụtụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova zigara ihe oriri. Otu Onyeàmà nyere 1,000 blọk. Onye ọzọ mere ndokwa ịzụta gbamgbam n’ọnụ ego dị ala. Onye ọzọkwa jiri ụkwụ gaa kilomita 16 ije nweta osisi. Otu nwa okorobịa nke chekwaworo ego ọ ga-eji kwụọ ndị ọgọ ya ụgwọ isi nwanyị yigharịrị ụbọchị agbamakwụkwọ ya ma jiri ego ahụ rụzie injin osisi ya. Ọ banyere n’ime oké ọhịa, bụ́ ebe ọ nọrọ izu atọ waa osisi ga-ezu ịrụcha ụlọ ahụ! Ụmụnna ndị na-eto eto siri ike bụ́ ndị Kraịst jiri isi buru osisi ndị ahụ gaa ebe dị kilomita ise site n’ebe ahụ, bụ́ ebe gwongworo nọ buru ha.

Mwughachi ahụ malitere n’April 24 bụ́ mgbe ndị ọrụ afọ ofufo 60 zukọtara n’ebe ahụ e nwere ọdachi. N’ime izu ndị sochirinụ, ọnụ ọgụgụ ahụ mụbara ruo 200. Ndịàmà atọ na-arụ ọrụ oge nile bịara mgbe ha rụsịrị ọrụ ụbọchị ha ma rụgide ọrụ ruo mgbe ọ gafere etiti abalị. Otu Onyeàmà si Douala rụrụ ọrụ n’ebe ọ na-arụ ọrụ Bekee n’ụtụtụ; e mesịa ya gbara ọgba tum tum ya gaa kilomita 70 ma rụgide ọrụ ruo etiti abalị tupu ya lawa. A rụsịrị ụlọ isii n’ihe na-erughị ọnwa abụọ. Ka ọ dịgodị, Ọgbakọ Buea nọgidere na-enwe nzukọ n’ụlọ mmadụ, ọ bụ ezie na ndị na-abịa nzukọ ji ihe dị ka okpukpu abụọ karịa ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ.

N’otu oge a, kọmitii enyemaka ahụ kesara ihe karịrị mkpụrụ ọgwụ 40,000 iji mee ka mmiri dị mma ọṅụṅụ na iji gwọọ ihe dị ka mmadụ iri nwere nsogbu iku ume bụ́ nke gas na-egbu egbu na ntụ si n’ugwu ahụ kpatara. Gịnị bụ mmeghachi omume nke ndị hụrụ ịhụnanya a nke ndị Kraịst?

Ịhụnanya Ndị Kraịst Enwee Ihe Ịga nke Ọma Karịsịa

Mgbe o kirisịrị otu n’ime ụlọ ndị ụmụnna ahụ rụrụ, otu nwoke si n’Òtù Na-ahụ Maka Ọrụ Ugbo nke Ógbè kwuru, sị; “Ụlọ ahụ bụ ihe na-agba ezigbo àmà n’onwe ya . . . , ngosipụta nke ịhụnanya.” Otu onye nkụzi kwuru, sị: “Ahụtụbeghị m ihe dị otú ahụ mbụ ná ndụ m . . . . Nke a na-egosi n’ezie na ọ bụ ezi Iso Ụzọ Kraịst.”

Ndị ritere uru n’onwe ha kwupụtakwara obi ekele ha. Timothy, bụ́ onye dị afọ 65 ma na-arịakarị ọrịa, dere, sị: “Oge ọ bụla anyị lere ụlọ ọhụrụ anyị anya, anya mmiri nke ọṅụ na-agba anyị. Anyị na-ekele Jehova mgbe nile maka ihe o mewooro anyị.” Otu nwanyị di ya nwụrụ nke na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova na ụmụ ya anọ gbaara aka mgbe ụlọ ha dara. Ọzọkwa, ndị e goro ka ha nyere ya aka zuuru ihe ndị a ga-eji kụọ ụlọ ya gbamgbam. Ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ Ndịàmà gbataara ya ọsọ enyemaka. O kwuru, sị; “Amaghị m otú m ga-esi kelee unu. Obi m jupụtara n’ọṅụ.” Elizabeth, bụ́ nwunye otu onye Kraịst bụ́ okenye, kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na e nwere ịhụnanya n’ọgbakọ Jehova. Ọ na-egosi na anyị na-ejere Chineke dị ndụ ozi.”

Mgbawa nke ugwu ahụ dị egwu, ma ọ pụghị imenyụ ịhụnanya ndị Kraịst nke òtù ụmụnna a. Dị ka a kpaliri Pọl onyeozi ide site n’ike mmụọ nsọ, “ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 13:8.

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ntụ ọkụ si n’ugwu gbawara agbawa rudata bibiri ọtụtụ ihe

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị ọrụ afọ ofufo rụsiri ọrụ ike iji rụzie ụlọ ndị mebiri emebi

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ugwu Cameroon