Ọnwa—Ọ̀ Na-emetụta Ndụ Gị?
Ọnwa—Ọ̀ Na-emetụta Ndụ Gị?
RUO ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ ekwetawo na ọnwa na-achịkwa akụkụ dị iche iche nke ndụ n’elu ụwa. E chewo na mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa na-emetụta ihe ọkụkụ, anụmanụ, na ọbụna ụmụ mmadụ. Ọ bụ ezie na nchọpụta nke sayensị ọgbara ọhụrụ egosiwo na echiche ụfọdụ e nwere eri oge abụghị eziokwu, nkweta ndị ọzọ ka dị ruo taa. Gịnị ka ihe ndị bụ eziokwu na-egosi?
Ụfọdụ ndị kwetara na e nwere njikọ dị n’etiti mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa na uto nke ihe ọkụkụ. N’ihi ya, ha na-ele anya na kalenda iji kpebie mgbe a ga-akụ ihe ọkụkụ, fesa nri ala, kwụchie mmanya, ma ọ bụ chekwaa ihe ná mkpọ. A na-eme nke a ná nkweta bụ́ na e mee ihe ụfọdụ n’oge na-ekwekọghị ná mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa, ihe a ga-arụpụta agaghị adị mma. Otu akwụkwọ na-enye ndị ọrụ ubi ndụmọdụ a: “E kwesịrị ịkpata akwụkwọ nri ndị a ga-eri ozugbo n’oge ọnwa na-etisi ike, ebe a ga-akpata akwụkwọ nri ndị a ga-echekwa echekwa n’oge ọnwa na-adịghị etisi ike.” È nwere ihe ndabere nkà mmụta sayensị maka isi otú a ewe ihe ubi?
O yiri ka nnyocha ụfọdụ hà na-ejikọ uto nke ihe ọkụkụ na ngagharị nke ọnwa. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ekwenyebeghị. Ha na-ekwu na ngagharị ndị ọnwa na-eme dị mgbagwoju anya, ha adịghị adị n’usoro mgbe nile, mmetụta ha adịghị abụkwa otu ụdị, ya mere o siri ike imeghachi nchọpụta ndị ahụ nnyocha ahụ dabeere na ha.
Otú ọ dị, e gosiwo na mmetụta ụfọdụ nke ọnwa dị adị. Dị ka ihe atụ, e gosiwo na e nwere ihe jikọrọ ebili mmiri bụ́ nke ikike ndọda nke ọnwa na-emetụta kpọmkwem na mgbanwe ndị dị n’ịrụ ọrụ, iri nri, ịmụ nwa, na usoro ndụ nke ọtụtụ ihe ndị dị ndụ.
Ụfọdụ na-azọrọ na ọ bụrụ na ọnwa na-emetụta ebili mmiri, ọ ghaghị imetụta ụmụ mmadụ n’otu aka ahụ, ebe ọ bụ na mmiri mejupụtara akụkụ ka ukwuu nke ahụ mmadụ. Gịnịkwa banyere mmekọrịta ahụ a sịrị dị n’etiti mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa na isi mgbaka, oge a mụrụ mmadụ, na ọbụna oge ịhụ nsọ, bụ́ nke ogologo oge ọ na-adịru na-afọdụ nke nta ka ọ kwekọọ ná mpụta nke ọnwa?
E mewo nnyocha ná mmụta banyere ọrịa uche, akparamàgwà mmadụ, na ọrịa ụmụ nwanyị iji mata ihe bụ eziokwu banyere okwu ahụ. E nwebeghị ezigbo ihe a chọpụtara. Ndị nchọpụta ụfọdụ na-azọrọ na ha ahụwo obere njikọ dị n’etiti ihe omume ụmụ mmadụ na ngagharị nke ọnwa, ma ndị ọzọ na-ekwu hoo haa na e nwetụghị njikọ ọ bụla dịnụ. Ha na-arụ ụka na ọ bụrụ na usoro ngagharị nke ọnwa nwere mmetụta pụtara ìhè n’ịmụ nwa, a gaara egosiworị njikọ ahụ eri ogologo oge n’ụzọ doro anya. E kwuwerị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime nchepụta echiche ndị ahụ e zubere iji kọwaa ihe ahụ e weere na ọ bụ mmetụta ọnwa na-enwe n’ahụ mmadụ, nke doworo ndị ọkà mmụta sayensị n’ozuzu ha anya. *
Ọ bụ ezie na nkà mmụta sayensị egosiwo na ọnwa na-enwe mmetụta ụfọdụ n’ahụ ihe dịgasị iche dị ndụ n’ụwa, ọ dịghị mfe ikwubi ókè ọ na-emetụtaru ha. Eluigwe na ala anyị dị nnọọ mgbagwoju anya, ma ọ dịghịkwa ihe ọzọ ka ọ dị ugbu a, a mabeghị ọtụtụ usoro ndị dị ebube na-achịkwa ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Ụfọdụ n’ime nchepụta echiche ndị a metụtara ìhè nke ọnwa, ike ndọda, ikike ndọta, na ikike ndọta nke eletrik.
[Foto dị na peeji nke 21]
Chi nwanyị bụ́ Selene, nke ndị Gris na ndị Rom oge ochie fere ofufe dị ka ihe nnọchianya nke ọnwa
[Ebe E Si Nweta Foto]
Musei Capitolini, Roma