Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-agbanwe Agbanwe?

Chineke Ọ̀ Na-agbanwe Agbanwe?

Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Na-agbanwe Agbanwe?

ỌKÀ mmụta mmalite mmadụ bụ́ George Dorsey kọwara Chineke nke “Agba Ochie” dị ka “Chineke obi tara mmiri.” O kwukwara, sị: “Yahweh enweghị . . . ịhụnanya ma ọlị. Ọ bụ Chineke nke ndị na-akwakọrọ ihe mmadụ, nke ndị na-ata mmadụ ahụhụ, nke ndị dike, nke ndị nwere mmeri.” Ndị ọzọ ekwubiwo ihe ndị yiri nke ahụ banyere Chineke nke “Agba Ochie”—Yahweh, ma ọ bụ Jehova. Ya mere, ụfọdụ taa na-ajụ ma Jehova ọ̀ bụ n’ezie Chineke obi ọjọọ nke mesịrị gbanwee omume ya wee ghọọ Chineke nke na-ahụ n’anya ma na-eme ebere nke “Agba Ọhụrụ.”

Echiche dị otú ahụ banyere Chineke nke Bible abụghị ihe ọhụrụ. Ọ bụ Marcion, nke na-abụchaghị onye Gnostic nke narị afọ nke abụọ nke O.A., bụ onye mbụ chepụtara ya. Marcion ekweghị na Chineke nke “Agba Ochie.” O lere Chineke ahụ anya dị ka onye na-eme ihe ike ma na-abọ ọ́bọ̀, onye ọchịchị aka ike nke na-eji ihe onwunwe akwụ ndị na-efe ya ụgwọ ọrụ. N’aka nke ọzọ, Marcion kọwara Chineke nke “Agba Ọhụrụ”—dị ka Jisọs Kraịst mere ka a mata ya—dị ka Chineke zuru okè, Chineke nwere ezi ịhụnanya ma na-eme ebere, nke amara na mgbaghara.

Jehova Na-eme Ihe n’Ụzọ Kwekọrọ ná Mgbanwe nke Ọnọdụ

Aha Chineke n’onwe ya nke bụ́ Jehova, pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Nke a pụtara na Jehova na-eme onwe ya ka ọ ghọọ Onye Mmezu nke nkwa ya nile. Mgbe Mosis jụrụ Chineke aha ya, Jehova kọwara ihe ọ pụtara n’ụzọ dị otú a: “M gaje ịghọ ihe m gaje ịghọ.” (Ọpụpụ 3:14, NW). Nsụgharị Rotherham si otú a kwuo ya: “M ga-aghọ ihe ọ bụla masịrị m.”

Ya mere Jehova na-ahọrọ ịghọ, ma ọ bụ na-aghọ, ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nzube na nkwa ezi omume ya nile. Ihe àmà na-egosi nke a bụ eziokwu ahụ bụ na o nwere ọtụtụ utu aha na okwu ndị na-akọwa ya: Jehova nke usuu nile nke ndị agha, Onyeikpe, Ọkaaka, Onye Ekworo, Eze Onyenwe Anyị, Onye Okike, Nna, Onye Nkụzi Ukwu, Onye Ọzụzụ Atụrụ, Onye na-anụ ekpere, Onye Mgbapụta, Chineke dị ngọzi, na ọtụtụ ndị ọzọ. O zubewo ịghọ ihe a nile—na ọtụtụ ndị ọzọ—iji mezuo nzube ịhụnanya ya nile.—Ọpụpụ 34:14; Ndị Ikpe 11:27; Abụ Ọma 23:1; 65:2; 73:28; 89:26; Aịsaịa 8:13; 30:20; 40:28; 41:14; 1 Timoti 1:11.

Mgbe ahụ, nke a ọ̀ pụtara na omume Chineke ma ọ bụ ụkpụrụ ya na-agbanwe agbanwe? Ee e. Banyere Chineke, Jemes 1:17 na-ekwu, sị: “Onye ọghụgha ọ bụla na-apụghị ịdị n’ebe Ọ nọ, ma ọ bụ onyinyo nke nchigharị na-eweta.” Olee otú Chineke pụrụ isi na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ ná mgbanwe nke ọnọdụ n’agbanweghị n’onwe ya?

Ihe atụ nke nne na nna na-ahụ n’anya bụ́ ndị na-arụ ọrụ dịgasị iche n’ihi ụmụ ha na-egosi otú nke a ga-esi kwe omume. N’otu ụbọchị, nne ma ọ bụ nna pụrụ ịbụ osi nri, onye ndozi ụlọ, onye ọrụ ọkụ eletrik, onye na-elekọta nwa, enyi, onye ndụmọdụ, onye nkụzi, onye na-enye ahụhụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Nne ma ọ bụ nna ahụ adịghị agbanwe onwe ya mgbe ọ na-arụ ọrụ ndị a; nanị ihe ọ na-eme bụ igbo mkpa dị iche iche ka ha na-adapụta. Otú ahụ ka ọ dị Jehova ma, ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka nnọọ elu. A pụghị igbochi ya ịghọ ihe ọ pụrụ ime onwe ya ka ọ ghọọ iji mezuo nzube ya na iji mee ka ihe ndị o kere eke rite uru.—Ndị Rom 11:33.

Dị ka ihe atụ, e mere ka a mata Jehova dị ka Chineke na-ahụ n’anya na nke na-eme ebere ma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma na nke Grik. Maịka onye amụma nke biri ndụ na narị afọ nke asatọ T.O.A. jụrụ banyere Jehova, sị: “Ònye bụ Chineke dị ka Gị, Nke na-ebupụ ajọ omume, na-agabigakwa njehie nke dịịrị ndị ala nketa Ya fọdụrụ? O jigideghị iwe Ya ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na onye ebere na-atọ ụtọ ka Ọ bụ.” (Maịka 7:18) N’otu aka ahụ, Jọn onyeozi dere okwu ahụ a maara nke ọma bụ́: “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.

N’aka nke ọzọ, n’akụkụ abụọ ahụ nke Bible, e kwuru okwu banyere Jehova dị ka Onye na-ekpe ikpe ziri ezi megide ndị na-anọgide na-emebi iwu ya n’ụzọ dị nnọọ oké njọ, na-emekwa otú ahụ n’enweghị nchegharị, ma na-emerụ ndị ọzọ ahụ. “Ndị nile na-emebi iwu ka [Jehova] ga-ekpochapụ,” ka ọbụ abụ ahụ kwuru. (Abụ Ọma 145:20) N’otu aka ahụ, Jọn 3:36 na-ekwu, sị: “Onye kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; ma onye na-ekwenyeghị Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ, kama iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.”

Àgwà Ya Adịghị Agbanwe Agbanwe

Omume Jehova na àgwà ya ndị bụ́ isi—ịhụnanya, amamihe, ikpe ziri ezi, na ike—agbanwebeghị. Ọ gwara ndị Israel, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) Nke a bụ ihe dị ka afọ 3,500 mgbe Chineke kesịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka ihe ahụ Chineke kwuru si dị, nnyocha e mere nke ọma na Bible dum na-eme ka a mata na Chineke bụ onye ụkpụru na àgwà ya na-adịghị agbanwe agbanwe. Omume Jehova Chineke agbanweghị n’ime ọtụtụ narị afọ ndị ahụ, n’ihi na mgbanwe dị otú ahụ adịghị mkpa.

Nkwụgide Chineke na-akwụgidesi ike n’ezi omume, dị ka e gosipụtara ya na Bible dum, ebelatabeghị, nke ịhụnanya ya ji adị ukwuu karịa otú ọ dị ná mmalite nke mmekọrịta ya na ụmụ mmadụ n’Iden. Ihe ndị yiri ka ha bụ ọdịiche dị n’omume ya, bụ́ ndị e gosipụtara n’akụkụ dị iche iche nke Bible bụ n’ezie akụkụ dị iche iche nke otu onye ahụ na-adịghị agbanwe agbanwe. Ihe ndị a bụ n’ihi ọnọdụ dị iche iche na ndị ya na ha mekọrịtara ihe, bụ́ ndị mere ka o gosipụta àgwà ma ọ bụ mmekorịta ndị dịgasị iche.

N’ihi ya, Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na àgwà Chineke agbanwebeghị eri ọtụtụ narị afọ, ọ gaghịkwa agbanwe n’ọdịnihu. Jehova na-akwụsi ike ma na-anọgidesi ike n’ihe. Ọ bụ onye a pụrụ ịdabere na ya ma bụrụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe nile. Anyị pụrụ ịdabere na ya mgbe nile.

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Otu Chineke ahụ bibiri Sọdọm na Gọmọra . . . . . . ga-eweta ụwa ọhụrụ nke ezi omume