Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Evolushọn?

Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Evolushọn?

Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Evolushọn?

TAA, ndị na-akwado ozizi evolushọn na-ekwu na ọ bụ eziokwu. Ma, ruo ókè hà aṅaa ka nkwesi olu ike ha mgbe mgbe bụruru ihe ezi uche dị na ya? Tụlee ihe ndị na-esonụ.

Ọnyà ududo bụ otu n’ime ihe ndị kasị sie ike a maara. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kwuo, “a pụrụ ịdọtị eriri ya nke ọ bụla ruo pasent 40 nke ogologo ya, ọ pụkwara iji otu narị okpukpu sie ike karịa ígwè, n’adọbighị adọbi.” Olee otú e si emepụta ọnyà a dị egwu? Mmiri na-alọ alọ, bụ́ protein, na-esi n’ime obere ọwara ndị dị n’ahụ ududo agafere, mmiri ahụ na-agbanwekwa ghọọ eriri siri ike site ná mmegharị nke irighiri ihe ndị mejupụtara protein ya ahụ, ka Encyclopædia Britannica na-akọwa.

Magazin bụ́ New Scientist na-ekwubi, sị: “Ududo nwere nkà ndị o ji eme ihe bụ́ ndị ọbụna onye na-emepụta mmiri ọgwụ bụ́ onye kasị nwee nkà na-apụghị ịghọta.” À pụrụ ichetụ n’echiche na ududo nwere nkà o ji emepụta ihe nke gbara nnọọ gharịị ruo n’ókè nke na mmadụ aghọtabeghị ya?

Otu isiokwu dị na The Wall Street Journal, nke Phillip E. Johnson dere, bụ́ prọfesọ n’ihe banyere iwu na Mahadum California, na-ekwu na e nweghị ihe a ga-eji kwere n’evolushọn, ma na ndị na-akwado ya na-akwa ndị na-agbagha ya emo mgbe nile. Isiokwu ahụ na-ekwu, sị: “O siri nnọọ ike inweta ihe àmà na-akwado ozizi evolushọn—ma ndị na-akwado ya achọghị nrụrịta ụka ezi uche dị na ya nke pụrụ ime ka ha gbanwee echiche ha.”

Ihe atụ ọzọ na-egosi enweghị ezi izu ná nchepụta evolushọn bụ ihe banyere osisi. Ndị ọkà mmụta sayensị na-eme nnyocha na Morocco egwupụtawo ihe ochie 150 ndị na-egosi na e nwere otu ụdị osisi bụ́ archaeopteris, “bụ́ nke so n’osisi ndị mbụ na-amị mkpụrụ a chọpụtaworo, nke mịpụtara ihe ka ọtụtụ n’osisi ndị e nwere taa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke London na-ekwu. Onye na-achịkọta akụkọ ndị metụtara sayensị n’akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na osisi a “nyere aka kpụzie ụwa nke oge a site n’ịrụpụta akwụkwọ na alaka.” “Ịrụpụta ihe” bụ “inweta ihe site n’iche echiche.” Ezi uche ọ̀ dị n’ikwu na osisi nwere ikike nke iche echiche na ịrụpụta ihe?

Solomọn, bụ́ otu n’ime ndị ikom kasị nwee amamihe, na-adọ anyị aka ná ntị ‘idebe izuzu anyị,’ ka anyị na-eche echiche n’onwe anyị. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ọ dị mkpa ime otú ahụ karịa ka ọ dị ugbu a.—Ilu 5:2.