Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Nlezianya Na-ekiri Telivishọn

Iji Nlezianya Na-ekiri Telivishọn

Iji Nlezianya Na-ekiri Telivishọn

TELIVISHỌN bụ “ọkọ akụkọ bụ́ isi, ihe na-eku nwa na ihe na-akpụzi echiche ọha na eze,” ka otu akụkọ bụ́ Not in the Public Interest—Local TV News in America na-ekwu, nke otu ìgwè na-enyocha ụlọ ọrụ mgbasa ozi na United States chịkọtara. “TV gbara anyị gburugburu . . . Dị ka anwụrụ ọkụ, ọ dị n’ikuku.” Dịkwa nnọọ ka ikuru anwụrụ ọkụ siga onye ọzọ si emerụ ahụ, otú ahụ ka iji ọtụtụ awa na-ekiri ihe omume TV a na-ahọrọghị nke ọma na-enwe mmetụta na-emerụ ahụ—karịsịa n’ahụ ụmụaka.

N’ikwu banyere mpụ na ime ihe ike nke TV, otu akụkọ ahụ na-ekwu na “ọtụtụ narị nnyocha ndị e mere egosiwo na ikiri ime ihe ike na-enwe mmetụta dị njọ n’ikike ịmụta ihe, ịchọ okwu na ọmịiko nke ụmụaka.” Òtù Ọgwụ na Ahụ Ike nke America kwuru na 1992 na “ihe ike telivishọn so n’ihe na-eyi ahụ ike nke ndị na-eto eto egwu.”

Olee otú ị pụrụ isi chịkwaa mmetụta nke ihe omume TV dị njọ na-enwe n’ahụ ụmụaka gị? Akụkọ ahụ depụtara ihe ọmụma ụfọdụ, bụ́ ndị e nwetara n’aro ndị òtù ahụ ike dị iche iche tụrụ, banyere otú a ga-esi ejikwu nlezianya na-ekiri telivishọn. Ụfọdụ n’ime ihe ọmụma ndị ahụ gụnyere ihe ndị na-esonụ.

▪ Mee atụmatụ ma belata ikiri TV. Kwuo mgbe ụmụaka pụrụ ikiri TV. Etinyela TV n’ọnụ ụlọ ụmụaka.

▪ Debe map ụwa n’akụkụ TV ahụ ka ụmụaka wee nwee ike ịhụ ebe ndị ha na-ekiri n’ihe omume TV.

▪ Soro ụmụaka gị na-ekiri telivishọn ka i wee nwee ike ịkọwa ihe ndị dị ka ọdịiche dị n’agbata ihe bụ echiche efu na ihe mere eme. Ọtụtụ ụmụaka na-erubeghị afọ iri apụghị ịmata ọdịiche ahụ mgbe nile.

▪ Bupụ telivishọn n’ebe a na-ahụkarị ya n’ụlọ gị. Debe TV n’ime kọbọd nwere ọnụ ụzọ. Ọ ga-eme ka o sitụ ike ịgbanye ya na ịgbanwegharị chanel ya.