Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ọrịa Na-adịghị Ala Ala Dakwasịrị Ezinụlọ

Mgbe Ọrịa Na-adịghị Ala Ala Dakwasịrị Ezinụlọ

Mgbe Ọrịa Na-adịghị Ala Ala Dakwasịrị Ezinụlọ

OBI ụtọ nke ezinụlọ Du Toit na-emetụta ndị ọzọ. Ezi ịhụnanya ha nwere maka ibe ha bụ ihe ọṅụ ikiri. I zute ha, ị gaghị amatadị na ha ediwo ọtụtụ ihe isi ike.

Iji malite, mgbe nwa mbụ ha, bụ́ Michelle, dị afọ abụọ, Braam na Ann chọpụtara na o bu ọrịa na-adịghị ala ala o ketara eketa bụ́ nke na-akpata nkụnwụ ahụ.

“Tupu ị mara ihe na-emenụ,” ka nne ya, bụ́ Ann na-akọwa, “ọ bụrụ na ị ghaghị ịmụta ụzọ isi nagide ọrịa na-adịghị ala ala nke na-akpata ike ọgwụgwụ. Ị hụzie na ndụ ezinụlọ agakwaghị adị otú ọ dịbu.”

Ma mgbe ha mụsịrị nwa nwanyị ọzọ na otu nwa nwoke, ọdachi dakwasịkwuru ezinụlọ a. Otu ụbọchị mgbe ụmụaka atọ ahụ nọ na-egwurị egwu n’èzí, ndị nke nwanyị abụọ ahụ gbabatara n’ụlọ. “Mama! Mama!” ka ha na-eti. “Bịa ọsọ ọsọ. Ọ dị ihe na-eme Neil!”

Ka ọ gbapụtara n’èzí, Ann hụrụ isi Neil bụ́ onye dị afọ atọ ka ọ kụdatara n’otu akụkụ. O nweghị ike ịkwụwa isi ya ọtọ.

“Ajọ akpata oyi wụrụ m,” ka Ann na-echeta, “aghọtakwara m ihe kpatara ya ozugbo ahụ. O wutere m nke ukwuu na obere nwa a ahụ siri ike aghaghị iche ihe ịma aka nke ịnagide otu nkụnwụ ahụ ahụ nwanne ya nwanyị nke tọrọ ya nwere.”

“N’oge na-adịghị anya ụfọdụ n’ime ihe ịma aka ndị kasị njọ anyị nwetụworo,” ka nna ha, bụ́ Braam, na-ekwu, “mebiri obi ụtọ nke ịmalite ezinụlọ nwere ahụ ike.”

N’agbanyeghị na e nyere Michelle ọgwụgwọ kasị mma n’ụlọ ọgwụ, o mesịrị nwụọ n’ihi nsogbu ndị ọzọ ọrịa ya kpatara. Ọ dị nanị afọ 14 n’oge ahụ. Neil na ihe ọrịa ya kpatara ka na-agba mgba.

Nke a na-akpata ajụjụ bụ́, Olee otú ezinụlọ dị iche iche dị ka nke Du Toit ga-esi nagide ihe ịma aka nke inwe onye òtù ezinụlọ na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ụzọ dị iche iche ọrịa na-adịghị ala ala si emetụta ezinụlọ.