Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Bi n’Ọgba n’Oge A

Ndị Bi n’Ọgba n’Oge A

Ndị Bi n’Ọgba n’Oge A

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SOUTH AFRICA

Ọ̀ DỊ ndị bi n’ọgba n’oge anyị a? Anyị hụrụ ụfọdụ na Lesotho, nke bụ́ alaeze ugwu jupụtara dị n’ebe ndịda Africa. Obodo nta ha, bụ́ Ha Kome dị ná mkpọda nnukwu Ugwu bụ́ Maluti, dị ihe dị ka kilomita 60 site na Maseru, bụ́ isi obodo Lesotho. N’ọnwa oge okpomọkụ, okooko osisi ndị na-acha ọbara ọbara na-ejupụta na ndịda ugwu a. Okooko osisi ndị a mara mma, bụ́ ndị ọtụtụ ndị maara dị ka osisi ọkụ, na-eme nnọọ ka oké ọhịa na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ dị n’ebe ahụ nwekwuo àgwà.

N’ebe a ọtụtụ ezinụlọ na-ebi ndụ dị ka ndị mgbe ochie. Ha na-ewu ụlọ ha n’ezie n’ime ọgba ndị dị na ndịda ugwu ahụ. A na-eji osisi na ihe ndị ọzọ, dị ka ahịhịa, amalite iwu mgbidi buru ibu na-adị n’ihu ụlọ ha. A na-ete apịtị a gwakọtara ya na nsị ehi ná mgbidi ahụ. Ihe a a na-ete ná mgbidi na-eme ka ụlọ kpoo ọkụ n’oge oyi na Lesotho, bụ́ mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi pụrụ ịdị nnọọ elu. N’ime ụlọ, e nwere ebe dị ala a na-akpọ ifo, nke pụtara “ebe a na-emenwu ọkụ,” bụ́kwa ebe a na-esi enweta okpomọkụ mgbe oyi na-atụ.

Nkume ọgba ahụ na-aghọ elu ụlọ, mgbidi azụ, na ahụ ájá. A na-ete ha apịtị a gwakọtara ya na nsị ehi, a na-eteghachikwa ya kwa afọ. Nke a na-eme ka ahụ nkume ahụ maa mma ma na-akwọ mụrụmụrụ. A na-eji akpụkpọ ehi achọ ime ụlọ ndị ahụ mma, e jikwa ha emere ute maka ịrahụ ụra.

Onye si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ gaa ebe ahụ ga-ahụ na ụzọ ndụ ọdịnala ahụ dị iche ma na-enye ume ọhụrụ. Blanket ndị mara mma na okpu ndị kapịrị ọnụ e ji ahịhịa mee bụ ihe ndị ha ji ejikarị ejiji. A na-ahụkarị ụmụaka nwoke bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ gba ụkwụ ọtọ ka ha na-elekọta ìgwè atụrụ ha. A pụrụ ịhụ ndị ikom obodo ahụ ka ha na-arụ ọrụ n’ugbo ọka ha ma ọ bụ jiri ịnụ ọkụ n’obi soro ndị ikom ndị ọzọ na-akparịta ụka.

A na-ahụ ihe ndị e mepụtara site na nkà na ụzụ nke oge a n’ebe ahụ mgbe ụfọdụ. Obere ụgbọelu na-efefe n’elu mgbe ụfọdụ na ụgbọala ndị na-ebute ndị nleta n’ọgba ndị ahụ na-eme ka obi dị ụmụaka na ndị okenye nọ n’obodo ahụ ụtọ. Ihe ka ọtụtụ ná nri ha na-esi bụ n’èzí, na-eji ite ígwè ojii ndị nwere ụkwụ atọ, bụ́ ndị a na-akwanwụ ọkụ n’okpuru ha. N’ihi ụkọ nkụ, a na-eji nsị ehi kpọrọ nkụ, ahịhịa, na alaka osisi ole na ole emenwu ọkụ. Arịa ụlọ ndị na-adịkarị n’ọgba ndị a e bi ebi gụnyere nkume igwe nri maka igwe ọka na eku e ji akpagharị nri ọka.

A maara Lesotho nke ọma maka ihe ndị Bushmen sere, bụ́ ndị dị n’ọtụtụ ọgba na nkume dị iche iche ná mba ahụ dum. Ndị Bushmen bụ ndị mbụ biri n’ọgba ndị dị na Ha Kome. Ihe osise ha na-egosi ihe omume dị iche iche, site n’iji ụgbọ epepe na ụgbụ akụ azụ̀ ruo n’ịgba oké egwú bụ́ nke yiri ka ndị ahụ na-agba ya ha na-eyi ihu anụmanụ. Ihe osise ndị ahụ na-egosikwa ụmụ anụmanụ, dị ka adaka, ọdụm, enyi mmiri, na ụdị ele ndị kasị ukwuu. Ihe ka ọtụtụ n’ihe osise ndị dịbu n’ọgba ndị dị na Ha Kome adịghịzi. Nanị ole na ole n’ime ha ka fọdụrụ dị ka ihe ncheta nke nkà ise ihe nke ndị Bushmen.

Otu ìgwè Ndịàmà Jehova na-aga ọrụ nkwusa ha n’otu ebe na-adịchaghị anya na Ha Kome. Site n’oge ruo n’oge, ha na-aga eleta ndị ahụ bi n’ọgba, bụ́ ndị e ji ile ọbịa mara. A na-ejikarị ọbà nri ọka a na-esi n’ebe ahụ bụ́ nke a na-akpọ motoho anabata Ndịàmà. Ọtụtụ ndị bi na Ha Kome na-enwe mmasị ịnata akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Mgbe mgbe ha na-egosi ekele ha nwere maka akwụkwọ ndị ahụ site n’inye akwụkwọ nri, àkwá, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, dị ka onyinye iji kwado ọrụ nkụzi nke Ndịàmà na-arụ.

Ndị a bi n’ọgba n’oge a na-akwanyere Bible ùgwù dị ukwuu ma bụrụ ndị na-enwe mmasị ịjụ ọtụtụ ajụjụ banyere ndụ, ọnwụ, na nkwenkwe ọdịnala ha. Ọrụ Ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi na-arụ n’ebe ahụ emewo ka e nwee ọtụtụ ọmụmụ Bible. N’ụzọ dị otú a, mkpụrụ nke eziokwu achọtawo ala dị mma n’obi ndị a dị obi umeala.—Matiu 13:8.

[Map dị na peeji 26]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

HA KOME