Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nna Gbahapụrụ Ibu Ọrụ Ha—Hà Pụrụ Ịgbahapụ Ya n’Ezie?

Ndị Nna Gbahapụrụ Ibu Ọrụ Ha—Hà Pụrụ Ịgbahapụ Ya n’Ezie?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ndị Nna Gbahapụrụ Ibu Ọrụ HaHà Pụrụ Ịgbahapụ Ya n’Ezie?

“Mgbe ọ sịrị, ‘Ana m aga ịmụrụ gị nwa,’ akụjara m. Ònye ga-elekọta nwa ọhụrụ ahụ? Adịghị m njikere ilekọta ezinụlọ. Ọ dị m ka m gbafuo.”—Jim. *

“KWA afọ,” ka otu akụkọ si n’Ụlọ Ọrụ Alan Guttmacher na-ekwu, “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 nde ndị inyom nọ n’afọ iri na ụma . . . na-atụrụ ime.” Ihe ruru “78% nke ụmụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-amụ na-abụ ndị a mụrụ n’alụghị di.”

N’oge gara aga, ndị ikom na-ewere ya na ọ bụ ibu ọrụ ha ilekọta ụmụaka ha mụrụ. Ma dị ka akwụkwọ bụ́ Teenage Fathers na-ekwu, “ịtụrụ ime n’alụghị di adịghịzi akpata ihere na mmechuihu ọ na-akpata [na mbụ].” N’etiti ndị na-eto eto nọ n’ógbè ụfọdụ, e nwedịrị ike ile ịmụta nwa anya dị ka ihe e ji amata ọnọdụ mmadụ! Ma, ọ bụ ụmụ okorobịa ole na ole na-elekọta ụmụ ha mụtara ruo ogologo oge. N’ikpeazụ, ọtụtụ na-agbafu. *

Ma nwa okorobịa ọ̀ pụrụ ịgbanahụ ihe nile na-esi n’omume rụrụ arụ apụta? Ọ bụghị dị ka Bible si kwuo. Ọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” (Ndị Galetia 6:7) Dị ka anyị ga-ahụ, mmekọahụ rụrụ arụ na-enwekarị ihe ọ na-akpatara ma ụmụ agbọghọ ma ụmụ okorobịa n’ogologo ndụ ha nile. Ndị na-eto eto pụrụ izere ihe ndị dị otú ahụ site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ doro anya nke Bible banyere izere mmekọahụ rụrụ arụ.

ỊgbapụỌ Dịchaghị Mfe

Ilekọta nwatakịrị na-achọ ịchụ nnukwu oge, ego, na nnwere onwe n’àjà. Akwụkwọ bụ́ Young Unwed Fathers na-ekwu, sị: “Ụfọdụ ụmụ okorobịa enweghị mmasị ‘n’ilekọta onye ọzọ,’ ma ọ bụrụhaala na ime otú ahụ ga-efu ha ego.” Otú ọ dị, ọ na-efu ọtụtụ ndị ihe dị ukwuu n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ha nanị. Otu ihe bụ na ụlọikpe na ndị ome iwu nọ n’ọtụtụ mba anọgidewo na-elewanye ndị ikom na-adịghị akwado ụmụ ha, anya ọjọọ. Ozugbo ụlọikpe chọpụtara nwoke mụrụ nwa, a pụrụ ịchọ ka ndị nna bụ́ ụmụ okorobịa kwụọ ihe ọ ga-ewe ruo ọtụtụ afọ—o zikwara ezi ime otú ahụ. A na-amanye ọtụtụ ndị ntorobịa ịkwụsị akwụkwọ ma ọ bụ ịrụ ọrụ a na-akwụ ụgwọ dị nta iji rụzuo ibu ọrụ dị otú ahụ. “Ruo n’ókè nna ahụ bụruru nwata,” ka akwụkwọ bụ́ School-Age Pregnancy and Parenthood na-ekwu, “ókè ahụ ka ọ ga-enweta agụmakwụkwọ dị nta.” Ọ bụrụkwa na ọ hapụ ịkwụ ụgwọ nkwado, ọ pụrụ iji ụgwọ dị ukwuu.

N’ezie, ọ bụghị ndị ikom nile na-eto eto nwere obi ịta mmiri n’ebe ụmụ ha nọ. Ọtụtụ na-eji ezi nzube obi amalite. Dị ka otu nnyocha si kwuo, pasent 75 nke ndị nna nọ n’afọ iri na ụma letara ụmụ ha n’ụlọ ọgwụ. Ma, n’oge na-adịghị anya, ihe ka ọtụtụ ná ndị nna bụ́ ụmụ okorobịa na-abụ ndị ibu ọrụ nke ilekọta nwata rikpuru.

Ọtụtụ na-achọpụta na ha enweghị nnọọ nkà ma ọ bụ ahụmahụ a chọrọ iji nweta ọrụ dị mma. N’ịbụ ndị ihere nke enweghị ike inye nkwado ego na-eme, n’oge na-adịghị anya ha na-agbahapụ ibu ọrụ ha. Ka o sina dị, nwa okorobịa pụrụ ịnọgide na-akwa ụta ruo ọtụtụ afọ na-abịanụ. Otu nna bụ́ nwa okorobịa na-ekweta, sị: “Mgbe ụfọdụ ana m eche ihe meworo nwa m nwoke. . . . Ọ na-ewute m na m gbahapụrụ [ya], ma ugbu a o funahụwo m. Ikekwe otu ụbọchị ọ ga-achọta m.”

Mmejọ E Mejọrọ Ụmụaka

Ndị nna gbahapụrụ ibu ọrụ ha nwekwara ike ha aghaghị ịnagide oké ihere—ihere nke ịbụ onye mejọworo nwa ya. E kwuwerị, dị ka Bible na-egosi, ma nne ma nna dị nwatakịrị mkpa. (Ọpụpụ 20:12; Ilu 1:8, 9) Mgbe nwoke gbahapụrụ nwa ya, ọ na-akpatara nwa ya ọtụtụ nsogbu. Otu akụkọ nke Òtù Na-ahụ Maka Ahụ Ike na Ijere Ọha Ozi na United States na-ekwu, sị: “Ụmụaka na-eto eto nọ n’ezinụlọ nwere nanị nne na-enwekarị akara mmụta dị ala n’ule ajụjụ ọnụ na nke mgbakọ na mwepụ. N’agbata afọ 7 ruo 10, ụmụaka nanị nne ma ọ bụ nna na-azụlite na-enwekarị akara mmụta dị ala, na-enwe nsogbu n’omume ha karị, na-akakwa arịa ọrịa na-adịghị ala ala na ọrịa uche. N’etiti ndị nọ n’oge uto na ndị toruworo ogo mmadụ, a na-ejikọ ịbụ ndị a zụlitere n’ezinụlọ nanị nne na-azụ nwa na ihe ize ndụ dị elu nke ịmụ ụmụ n’oge a nọ n’afọ iri na ụma, ịkwụsị akwụkwọ, ịga mkpọrọ, na ịbụ ndị na-enweghị ọrụ ma ọ bụ ndị na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ.”

Magazin bụ́ Atlantic Monthly na-ekwubi, sị: “Dị ka ihe àmà na-ebuwanye ibu e nwetara ma n’aka ọha mmadụ ma n’aka ndị ọkà mmụta sayensị gosiri, ụmụaka nọ n’ezinụlọ ịgba alụkwaghịm tisasịrị na ndị a mụrụ n’alụghị di adịghị eme nke ọma n’ọtụtụ akụkụ dị ka ụmụaka nọ n’ezinụlọ e nwere ma nne ma nna. Ụmụaka nọ n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna ji okpukpu isii yie ka ha ga-ada ogbenye. O yikwara ka ha ga-anọgide na-abụ ogbenye.”

Buru n’uche na ihe ize ndụ ndị a dabeere ná nnyocha e mere ìgwè dị iche iche iji nweta ngụkọ ọnụ ọgụgụ, ọ bụghịkwa ndị mmadụ n’otu n’otu ka o metụtara. Ọtụtụ ụmụaka na-emesịa bụrụ ndị okenye na-eme nke ọma, ndị nwere ezi uche n’agbanyeghị na ha si n’ezinụlọ na-adịghị otú o kwesịrị. Ya bụrụgodị otú ahụ, obi amamikpe pụrụ inye nwa okorobịa gbahapụrụ nwa ya oké nsogbu. “Ọ na-adị m nnọọ ka m [kpaghasịala] ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi,” ka otu nna na-alụghị nwunye kwuru.—Teenage Fathers.

Ihe Ịma Aka nke Inye Nkwado

Ọ bụghị ndị nna nile bụ́ ụmụ okorobịa na-agbahapụ ibu ọrụ ha. Ụfọdụ ụmụ okorobịa na-enwe mmetụta kwesịrị ekwesị nke ibu ọrụ n’ebe ụmụ ha nọ ma na-achọ n’ezie inye aka n’ịzụlite ha. Otú ọ dị, ọ na-adịkarị mfe ikwu nke a karịa ime ya eme. Otu ihe bụ na nna na-alụghị nwunye pụrụ inwe ikike iwu dị nta, na-eme ka nke nwanyị na ndị mụrụ ya na-achịkwa ókè ọ pụrụ isoro nwa ya na-akpakọrịtaru. “Ọ na-abụkarị ọgụ na mgba iji mara onye ga-enwe ikike n’ahụ nwa ahụ,” ka Jim na-ekwu, bụ́ onye e hotara ná mmalite. N’ihi ya, a pụrụ ime mkpebi ndị nna ahụ bụ́ nwa okorobịa pụrụ ịjụwapụ isi, dị ka nkuchi—ma ọ bụ ọbụna isikwopụ afọ ime. * “O siiri m ike ikwe ka ha nyefee ya onye ọzọ m na-amaghị,” ka otu nna bụ́ nwa okorobịa na-ekpesa, “ma ọ dị m ka o nweghị ihe ọzọ m pụrụ ime.”

Ụfọdụ ụmụ okorobịa na-ekwu na ha ga-alụ nne nke nwa ha. * N’eziokwu, ịlụ di ga-eme ka ihere ghara ime nwa agbọghọ ahụ ma mee ka nwa ahụ bụrụ onye nne na nna ya zụlitere. O nwedịrị ike ịbụ na n’agbanyeghị àgwà ọjọọ ha, di na nwunye ahụ hụrụ onwe ha n’anya n’ezie. Otú ọ dị, eziokwu ahụ bụ́ na nwoke nwere ike ịtụwa nwanyị ime enweghị mgbe ọ pụtara na o tozuru etozu n’uche na ná mmetụta uche bụ́ nke dị mkpa iji bụrụ di na nna. Ọ pụtaghịkwa na o nwere ike ịkwado nwunye ya na nwa ya n’ụzọ ego. Nnyocha na-egosi na alụmdi na nwunye malitere n’ihi ntụrụ ime adịghị adịte aka. Ya mere iji ọsọ agbaba n’alụmdi na nwunye adịghị abụkebe ihe ngwọta amamihe dị na ya.

Ọtụtụ ụmụ okorobịa na-ekwu na ha ga-akwado ụmụ ha n’ụzọ ego. Dị ka e kwuru na mbụ, ọ chọrọ mkpebi siri ike n’aka nna bụ́ nwa okorobịa ịnọgide na-enye nkwado dị otú ahụ ruo ogologo oge—ikekwe ruo afọ 18 ma ọ bụ karịa! Ma enyemaka a nọgidere na-enye n’akụkụ a pụrụ igbochi nne na nwa ahụ ibi ndụ ndị ogbenye.

Gịnị banyere ikere òkè n’ịzụlite nwa ahụ n’ezie? Nke a pụkwara ịbụ ihe ịma aka siri ike. Mgbe ụfọdụ nne na nna nke nwa agbọghọ ahụ na-atụ ụjọ na ha ka nwere ike ịnọgide na-enwe mmekọahụ, n’ihi ya kwa, ha na-agbalị igbochi—ma ọ bụ ọbụna machibido—nwa okorobịa na nwa agbọghọ ahụ ịhụ onwe ha. Nwa agbọghọ ahụ n’onwe ya pụrụ ikpebi na ya achọghị ka nwa ya na nwoke na-abụghị di ya ‘nwee njikọ.’ Ka o sina dị, ọ bụrụ na e kwe ka nna ahụ na nwa ya na-akpachi anya, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ezinụlọ ahụ ijide n’aka na a na-enwe onye na-anọ ya n’oge nleta ahụ, ka e wee gbochie ịdaba n’àgwà ọjọọ ọzọ.

N’ịchọ ịkparu ụmụ ha nso, ụfọdụ ndị nna na-alụghị nwunye amụtawo otú e si arụ ọrụ ụfọdụ ndị bụ́ isi nke onye bụ nna, dị ka ịsa ahụ, inye nri, ma ọ bụ ịgụpụtara ụmụ ha ihe. Nwa okorobịa nke mụtaworo ụkpụrụ Bible nwedịrị ike ịgbalị ịkụziri nwa ya ụfọdụ n’ime ụkpụrụ nke Okwu Chineke. (Ndị Efesọs 6:4) Ma ọ bụ ezie na ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ nlebara anya ịhụnanya nke nna dị mma nye nwatakịrị karịa enweghị ya enwe ma ọlị, ya na inwe nna na-anọ ya kwa ụbọchị abụghị otu ihe. Ọ bụrụkwa na nne nke nwata ahụ emesịa lụọ di, nna ahụ bụ́ nwa okorobịa agaghị enwe ọnụ okwu ka nwoke ọzọ na-eweghara ọrụ nke ịzụlite nwa ya.

Mgbe ahụ, o doro anya na ịmụta nwa n’alụghị nwunye na-eduga n’oké nhụsianya—nye ma nne na nna ahụ ma nwa ahụ. E wezụga nchegbu ndị kwesịrị ekwesị, e nwere ihe ize ndụ nke enwekwaghị ihu ọma Jehova Chineke, bụ́ onye kagburu inwe mmekọahụ rụrụ arụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3) Ọ bụ ezie na o nwere ike ikwe omume mmadụ ime ihe ọ pụrụ ime banyere ọnọdụ dị njọ dị ka ịtụrụ ime n’oge ntorobịa, o kwesịrị ido anya na ihe kasị mma ime bụ izere itinyedị aka etinye n’omume rụrụ arụ. Otu nna bụ́ nwa okorobịa na-ekweta, sị: “Ozugbo ị mụtara nwa n’alụghị nwunye, ndụ gị na-agbanwe kpam kpam.” N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na nna bụ́ nwa okorobịa aghaghị ịnakwere ihe ndị si n’ihie ụzọ ya pụta n’oge ndụ ya nile. (Ndị Galetia 6:8) Ọzọkwa, amamihe dị na ndụmọdụ Bible mgbe ọ na-asị: “Gbanarịnụ ịkwa iko.”—1 Ndị Kọrint 6:18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Ịmụta Ụmụ—Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Nwoke?” dị ná mbipụta Teta! nke May 8, 2000. Maka ntụle nke mmetụta ịbụ nne n’alụghị di na-enwe n’ahụ ndị inyom, lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Ịbụ Nne n’Alụghị Di—Ọ̀ Pụrụ Ịbụ M?” ná mbipụta December 8, 1986.

^ par. 16 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Nsikwopụ Afọ Ime—Ọ̀ Bụ Azịza Ya?” dị ná mbipụta Teta! (Bekee) nke March 8, 1995.

^ par. 17 Iwu Mosis kwuru na nwoke rafuru nwanyị na-amaghị nwoke ga-alụ ya. (Deuterọnọmi 22:28, 29) Otú ọ dị, alụmdi na nwunye ahụ abụghị iwu, n’ihi na nna nwa agbọghọ ahụ pụrụ ịjụ. (Ọpụpụ 22:16, 17) Ọ bụ ezie na ndị Kraịst taa anọghị n’okpuru Iwu ahụ, nke a na-eme ka o doo anya otú mmehie metụtara mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye dịruru ná njọ.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” dị ná mbipụta November 15, 1989 nke Ụlọ Nche.

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọ kasị mma ịdị mbụ zere itinye aka n’omume rụrụ arụ