Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ezinụlọ Anyị Si Dịghachi n’Otu

Otú Ezinụlọ Anyị Si Dịghachi n’Otu

Otú Ezinụlọ Anyị Si Dịghachi n’Otu

Dị ka Lars na Judith Westergaard si kọọ

EBE obibi ha dị nnọọ otú ezinụlọ ọ bụla nwere obi ụtọ na Denmark kwesịrị ịdị. Ọ bụ ụlọ ị ga-atụsara ahụ na ya nke nwere ubi mara mma, ma dịrị n’obodo nta dị jụụ. N’ime ya, e nwere otu nnukwu foto dị n’ahụ ájá nke na-egosi ụmụaka nọ n’ezinụlọ ahụ bụ́ ndị ahụ dị, ndị na-achịkwa ọchị.

Nna ha, bụ́ Lars, bụ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Nwunye ya, bụ́ Judith, bụ onye ọsụ ụzọ (Onye na-ezisa ozi ọma oge nile). Ọ bụ ezie na ha bụ di na nwunye nwere obi ụtọ, ọ dịbughị otú ahụ. Lars na Judith agabigawo oge nsogbu na obi ilu nke dugara n’ịgba alụkwaghịm na ntisa nke ezinụlọ ha. Otú ọ dị, ugbu a, ezinụlọ ha adịghachiwo n’otu. N’ihi gịnị? Ha na-akọwa ihe merenụ.

Lars na Judith ahụghị ihe dị njọ n’ịkọ ihe gajọrọnụ n’alụmdi na nwunye ha na otú ha si dịghachi n’otu. Ha na-eche na ahụmahụ ha nwere ike inyere ndị ọzọ aka.

Ọ Malitere Nnọọ nke Ọma

Lars: Alụmdi na nwunye anyị bụ nnọọ ihe obi ụtọ mgbe ọ malitere, n’April 1973. Ụwa yiri ihe dị mma nye anyị. Anyị amaghị banyere Bible ma ọ bụ Ndịàmà Jehova, ma o doro anyị anya na anyị pụrụ ime ka ụwa bụrụ ebe ka mma obibi ma ọ bụrụ na mmadụ nile arụsie ọrụ ike iji mee ka ọ dị otú ahụ. Ya mere anyị mikpuru onwe anyị n’ọtụtụ ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Obi ụtọ anyị rịrị elu ka anyị mụtara ụmụ nwoke atọ ahụ dị, ndị dịkwa gara gara—Martin, Thomas, na Jonas.

Judith: Anọ m n’ọkwá dị elu n’otu ngalaba nke ọrụ bekee. N’otu oge ahụ, etinyere m aka n’ihe omume ọchịchị na nke òtù ndị ọrụ. Nke nta nke nta e bugoro m n’ọkwá idu ndú.

Lars: Nke m bụ na ana m arụ ọrụ n’otu òtù nwere ndị ọrụ buru ibu, arịgokwara m n’ọkwá dị elu. Anyị nọ nnọọ na-eme nke ọma n’ọrụ anyị, ọ dịghịkwa nsogbu ọ bụla anyị nwere.

Ikewa

Lars: Ma ọrụ anyị dịgasị iche naara anyị oge anyị nke na anyị adịghị enwekwa oge buru ibu ịnọkọrịta. Anyị na-arụrụ otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọrụ ma, ọ bụ na ngalaba ndị dị iche. Ọ bụ ndị ọzọ na-elekọta ụmụ anyị ndị nwoke atọ, n’ụlọ anyị ma ọ bụ n’ebe a na-elekọta ụmụaka. Ebe ọ bụ na anyị abụọ na-enwe nchegbu banyere ihe nke aka anyị, ndụ ezinụlọ anyị ghasara. Ọ bụrụ na ọ dapụta na anyị abụọ nọ n’ụlọ, ọtụtụ mgbe oké esemokwu na-ebilite. Mgbe ahụ amalitere m ịṅụ mmanya na-aba n’anya dị ka ọgwụ nkụjụ ahụ.

Judith: N’ezie, anyị ka hụrụ onwe anyị na ụmụ anyị n’anya, ma anyị azụliteghị ịhụnanya anyị otú o kwesịrị; o yiri ka ọ na-anyụ ọkụ. Mmekọrịta anyị bịara dị nnọọ njọ, ụmụaka anyị takwara ahụhụ n’ihi ya.

Lars: Ná mgbalị siri ike idozi ezinụlọ anyị, ekpebiri m ịkwụsị ọrụ m. Na 1985 anyị kwapụrụ n’obodo ukwu gaa n’ime obodo nta anyị bi na ya ugbu a. Ihe katụrụ mma ruo oge ụfọdụ, ma mụ na nwunye m nọgidere na-atụkwasị uche n’ihe ndị dịgasị iche. N’ikpeazụ, na February 1989, alụmdi na nwunye anyị dịruworo afọ 16 jedebere n’ịgba alụkwaghịm. Ezinụlọ anyị tisasịrị.

Judith: Ọ bụ ihe mwute ịhụ ka ezinụlọ anyị tisara na ịhụ otú ụmụaka ahụ si taa ahụhụ. Anyị were oké iwe nke na anyị apụghịdị ikwe inwekọ ikike ịkpọrọ ụmụaka ahụ, ya mere enwetara m ikike ịkpọkọrọ ha atọ.

Lars: Mụ na Judith metụrụ mgbalị ndị na-eju anya ijikọta ezinụlọ anyị na-achọ ntisa. Ọbụna anyị kpegaara Chineke ekpere maka enyemaka. Ma anyị amachaghị ihe banyere Chineke.

Judith: Ekpere anyị mere ka anyị chee na Chineke anụghị ha. Obi dị anyị ụtọ na eri mgbe ahụ anyị ahụwo na Chineke na-anụ ekpere.

Lars: Anyị amaghị na ọ dị anyị mkpa ime mgbalị na ime mgbanwe n’onwe anyị. Ya mere ịgba alụkwaghịm ahụ ghọrọ ihe dị mwute merenụ.

Mgbanwe Lars Na-atụghị Anya Ya

Lars: Mgbe m bi nanị m, ihe gbanwere kpam kpam n’ụzọ m na-atụghị anya ya. Otu ụbọchị anatara m magazin abụọ n’aka Ndịàmà Jehova. Tupu mgbe ahụ anaghị m anabata Ndịàmà ma ọlị. Ma ka m na-eleba anya na magazin ndị ahụ, ahụrụ m na Ndịàmà n’ezie kwenyere ma na Chineke ma na Jisọs Kraịst. Nke ahụ bụ oké ihe ijuanya. Amaghị m na ha bụ ndị Kraịst.

N’ihe dị ka otu oge ahụ, ebinyeere m nwanyị ọzọ m zutere. Achọpụtara m na ọ bụtụwo otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe m malitere ịjụ ajụjụ, o gosiri m n’ime Bible na Jehova bụ aha Chineke. Ya mere “Ndịàmà Jehova” pụtara “Ndịàmà Chineke”!

Nwanyị ahụ mere ndokwa ka m gaa gee otu okwu ihu ọha a ga-ekwu n’Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ihe m hụrụ n’ebe ahụ kpaliri mmasị m n’ezie. Ejere m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè m ịmụtakwu ihe, a malitekwaara m ọmụmụ Bible. O weghị m oge ịchọpụta na ụzọ ndụ m dị njọ, ya mere akwapụrụ m na nke nwanyị ahụ mụ na ya bi ma gaa biri nanị m n’obodo m. Mgbe m latụsịrị azụ nke nta akpọtụụrụ m Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ ma gaa n’ihu n’ọmụmụ Bible m.

Ma, aka m nwetụrụ obi abụọ. Ndịàmà Jehova hà bụ ndị Chineke n’ezie? Gịnị banyere ihe nile m mụtara n’oge m bụ nwata? Ebe ọ bụ na a zụlitere m dị ka onye Seventh-Day Adventist, akpọtụziiri m pastọ ndị Adventist. O kwetara isoro m mụọ ihe na Wednesday ọ bụla, ebe mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ ihe na Monday ọ bụla. Ihe m chọrọ bụ azịza doro anya site n’òtù abụọ ahụ banyere isiokwu anọ gbara ọkpụrụkpụ: nlọghachi Kraịst, mbilite n’ọnwụ, ozizi Atọ n’Ime Otu, na otú e kwesịrị isi hazie ọgbakọ. O were m nanị ọnwa ole na ole iwepụ mgbagwoju anya nile. Na nke ọ bụla n’akụkụ anọ ahụ—na n’ihe ọ bụla ọzọ—ọ bụ nanị nkwenkwe Ndịàmà Jehova dabeere kpam kpam na Bible. N’ihi ya, ejiri m obi ụtọ malite ikere òkè n’ihe omume nile nke ọgbakọ, n’oge na-adịghịkwa anya rara onwe m nye Jehova. Na May 1990, e mere m baptism.

Gịnị Banyere Judith?

Judith: Ná njedebe nke nsogbu alụmdi na nwunye anyị, amalitere m ọzọ ịga chọọchị. Mgbe m nụrụ na Lars na-aga ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ masịtụdịghị m. Ọdụ nwa anyị, bụ́ Jonas dị afọ iri, na-eleta nna ya mgbe ụfọdụ, ma amachibidoro m Lars ịkpọrọ Jonas gaa nzukọ ọ bụla nke Ndịàmà. Lars kpọkuru ndị ọchịchị, ma ha dụnyeere m úkwù.

Ezutewo m nwoke ọzọ. Ọzọ, etinyekwuola m aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụdị nile nke ọrụ obodo. Ya mere ọ bụrụ na mmadụ kwuru na ọ ga-ekwe omume ezinụlọ anyị ịdịghachi n’otu n’oge ahụ, ọ gaara eyi ihe na-agaghị ekwe omume.

N’ịchọ ihe m ga-eji megide Ndịàmà Jehova, agakwuuru m otu pastọ nke parish dị n’ógbè anyị, bụ́ onye kwetara ozugbo na ya amaghị ihe ọ bụla banyere Ndịàmà nakwa na ya enweghị akwụkwọ ọ bụla na-ekwu banyere ha. Nanị ihe o kwuru bụ na ọ ga-akara m mma izere ha. Otú ọ dị, nke ahụ agbanweghị echiche dị njọ m nwere banyere Ndịàmà Jehova. Ma a manyeziri m izute ha n’ụzọ m na-atụghịdị anya ya.

Nwanne m nwoke bi na Sweden aghọwo otu n’ime Ndịàmà Jehova, a kpọkwara m òkù ịbịa agbamakwụkwọ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze! Ahụmahụ ahụ mere ka m gbanwee echiche m kpam kpam banyere Ndịàmà. Ọ bụụrụ m ihe ijuanya na ha abụghị ndị jụrụ nnọọ oyi dị ka m na-echebu. Ha dị obiọma ma nwee obi ụtọ, ọbụna na-egosi ezigbo omume ịkpa ọchị.

Ka ọ dịgodị, di m mbụ, bụ́ Lars, agbanwewo kpam kpam. Ọ na-eji ihe akpọrọ ihe karị, na-ewepụta oge esoro ụmụaka ahụ anọkọ, dị obiọma ma na-elezi anya n’ihe ọ na-ekwu, ọ dịghịkwa aṅụbiga mmanya ókè dị ka ọ na-emebu. Àgwà ya bụ nnọọ nke na-adọrọ adọrọ! Ugbu a ọ bụ ụdị nwoke m chọrọ ka ọ bụrụ. Ọ bụ nnọọ echiche na-agbawa obi na ọ bụkwaghị di m nakwa na ikekwe otu ụbọchị ọ ga-alụ nwanyị ọzọ!

Mgbe ahụ emere m atụmatụ “mwakpo” aghụghọ. N’otu oge ka Jonas na nna ya nọ, emere m atụmatụ ịkpọrọ ụmụnne m ndị nwanyị abụọ ịga leta Jonas na Lars ka o wee dị ka m chọrọ ka ụmụnne m ahụ nwee ohere ịhụ nwa nwanne ha. Anyị zutere n’ogige ntụrụndụ. Ka ụmụnne m na-elekọta nwa m, mụ na Lars chọtara otu bench ma nọdụ ala.

O juru m anya na ozugbo m kwulitere banyere ọdịnihu anyị, Lars wepụtara otu akwụkwọ n’akpa uwe ya. Aha ya bụ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ. * O nyere m akwụkwọ ahụ ma tụọ aro ka m gụọ isiakwụkwọ ndị kwuru banyere ọrụ nke di na nke nwunye n’ime ezinụlọ. O kwuru n’ụzọ pụrụ iche ka m gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ dị na ya.

Mgbe ahụ, ka mụ na Lars bilitere na bench ahụ, achọrọ m ijide ya n’aka, ma o jiri nwayọọ jụ nke ahụ. Lars ezubeghị isoro m banye ná mmekọrịta ọhụrụ n’amaghị echiche m banyere okwukwe ọhụrụ ya. Nke ahụ wutetụrụ m, ma achọpụtaziri m na ezi uche dị n’omume ya, na ọ bụkwa ihe ga-abara m uru ma ọ bụrụ na o mesịa bụrụ di m ọzọ.

Ihe ndị a nile mere ka m chọkwuo ịmara banyere Ndịàmà Jehova. N’ụbọchị na-esonụ, ejekwuuru m otu nwanyị m maara bụ́ Onyeàmà, anyị hazikwara ka ya na di ya nye m ihe ọmụma m chọrọ banyere okpukpe ha. Ha nwere azịza sitere na Bible nye ọtụtụ ajụjụ m nile. Ahụrụ m na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na Bible. Site n’otu isiokwu gaa n’ọzọ, aghaghị m ịnakwere nke bụ eziokwu.

N’oge ahụ ekewapụrụ m onwe m n’Evangelical Lutheran Church ma kwụsị ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị m. Ọbụna akwụsịrị m ise siga. Nke ahụ bụ ihe sikarịsịrị ike m mere. Ọmụmụ Bible m malitere n’August 1990, n’April 1991 kwa, e mere m baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Agbamakwụkwọ nke Abụọ Ha

Judith: Ugbu a anyị abụọ bụ Ndịàmà e mere baptism. Ọ bụ ezie na anyị bi iche iche, anyị amụwo Bible. N’ihi nkụzi ya ndị dị mma, anyị adịwo iche n’otú anyị dịbu. Anyị ka hụrụ onwe anyị n’anya, ikekwe n’ụzọ midịrị emi karịa otú ọ dịbu. Ya mere anyị nweere onwe anyị ịlụkwa ọzọ—nke ahụ bụkwa ihe anyị mere. Anyị gbara akwụkwọ nke ugboro abụọ, ma ugbu a ọ bụ n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.

Lars: Ihe a na-echeghị na ọ ga-eme emeela—ezinụlọ anyị adịghachila n’otu! Lee obi ụtọ na ọṅụ anyị nwere ugbu a!

Judith: Ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ bụ ụmụ anyị, ọtụtụ ndị ikwu, na ọtụtụ ndị enyi ọhụrụ anyị na ndị ochie. Ọ bụ ahụmahụ dị egwu. N’etiti ndị bịaranụ e nwere ụfọdụ ndị maara anyị n’oge alụmdi na nwunye mbụ anyị; obi dị ha ụtọ ịhụ ka anyị nọkọrọ ọnụ ọzọ, o jukwara ha anya ịhụ ezigbote ọṅụ dị n’etiti Ndịàmà Jehova.

Ụmụaka Anyị

Lars: Kemgbe e mere anyị baptism anyị enwewo ọṅụ nke ịhụ ụmụ anyị abụọ ka ha họọrọ ịrara ndụ ha nye Jehova.

Judith: Jonas enwewo mmasị n’eziokwu sitere na Bible eri ọ matara ya dị ka obere nwa mgbe o letara nna ya. Ọ dị nanị afọ iri mgbe ọ gwara m na ya chọrọ ka ya na nna ya biri n’ihi na, dị ka o si kọwaa ya, “papa m na-agbaso Bible.” E mere Jonas baptism mgbe ọ dị afọ 14. Ọ gụsịwo akwụkwọ, ugbu a ọ bụkwa onye ozi oge nile.

Lars: Nwa mbụ anyị, bụ́ Martin, dị afọ 27 ugbu a. Mgbanwe ndị ọ hụrụ anyị mere kwaliri ya iche echiche. Ọ hapụrụ ụlọ ma biri n’akụkụ ọzọ nke mba anyị. N’afọ abụọ gara aga ọ malitere isoro ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ha na-amụ Bible. Mgbe nanị ọnwa ise gasịrị, ọ dịwo njikere ka e mee ya baptism. Ọ ka nwere atụmatụ dị mma maka ndụ ya n’ọdịnihu dị ka onye Kraịst.

Nwa nke abụọ anyị, bụ́ Thomas, abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova ugbu a. N’ezie, anyị ka hụrụ ya n’anya, anyị na ya na-enwekwa mmekọrịta dị mma. Obi dị ya ụtọ banyere mgbanwe weere ọnọdụ n’ezinụlọ anyị. Anyị nile na-ekwetakwa na n’ihi ụkpụrụ ndị anyị bụ́ nne na nna mụtara na Bible, ezinụlọ anyị adịghachiwo n’otu. Lee ngọzi ọ bụụrụ anyị na anyị pụrụ ịnọkọta ọtụtụ mgbe dị ka ezinụlọ n’otu ụlọ, ebe ụmụ nwoke atọ na nne na nna ha nọcha!

Ndụ Anyị Taa

Lars: Anyị adịghị ekwu na anyị ezuwo okè. Ma anyị amụtawo ihe—na ịhụnanya na nkwanyerịta ùgwù bụ isi ihe ndị na-akpata alụmdi na nwunye na-aga nke ọma. Ntọala e wukwasịrị alụmdi na nwunye anyị na ya ugbu a dị nnọọ iche n’ihe ọ bụbu. Ugbu a anyị abụọ anakwerewo ikike karịrị nke anyị onwe anyị, n’ihi na anyị abụọ matara na anyị na-ebi ndụ dị ka Jehova si chọọ. Mụ na Judith na-enwe mmetụta nke ịdịghachi n’otu n’ezie ma jiri obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu.

Judith: Echere m na anyị bụ ihe akaebe a na-ahụ anya na Jehova bụ onye ndụmọdụ kasị mma e nwere maka alụmdi na nwunye na ezinụlọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 30 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1978; a dịghị ebikwa ya ugbu a.

[Foto dị na peeji nke 22]

Lars na Judith n’oge agbamakwụkwọ mbụ ha, na 1973

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụmụ nwoke atọ ịdị n’otu ezinụlọ ha funahụrụ ma ha achọtawo ya ọzọ

[Foto dị na peeji nke 25]

Lars na Judith taa, bụ́ ndị dịghachiri n’otu site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible