Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ezinụlọ Ga-esi Nagide Ọrịa Na-adịghị Ala Ala

Otú Ezinụlọ Ga-esi Nagide Ọrịa Na-adịghị Ala Ala

Otú Ezinụlọ Ga-esi Nagide Ọrịa Na-adịghị Ala Ala

A PỤRỤ ịkọwa ịnagide ihe dị ka “ikike ịlụso nsogbu ndị mmadụ nwere ọgụ n’ụzọ dị irè na ime ihe banyere ha.” (Taber’s Cyclopedic Medical Dictionary) Ọ gụnyere iche nsogbu nke ọrịa na-adịghị ala ala ihu n’ụzọ ga-eme ka i nwee ike ịchịkwatụ ya ma nwee udo nke uche. N’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ọrịa na-adịghị ala ala bụ nsogbu ezinụlọ, nkwado ịhụnanya nke onye òtù ezinụlọ nke ọ bụla ji iguzosi ike n’ihe na-enye dị mkpa iji mee ka ezinụlọ nagide ya n’ụzọ gara nke ọma. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ezinụlọ ga-esi nagide ọrịa na-adịghị ala ala.

Abamuru nke Ihe Ọmụma

Ọ pụru ịbụ na a gaghị agwọtali ọrịa ahụ, ma ịmata ụzọ a ga-esi nagide ya pụrụ ibelata mkpasasị uche na mwute nke ọrịa na-akpata. Nke a kwekọrọ n’ilu oge ochie nke na-ekwu, sị: “Onye nwere ihe ọmụma na-eme ka ike nwee ume.” (Ilu 24:5) Olee otú ezinụlọ pụrụ isi nweta ihe ọmụma banyere otú ha ga-esi nagide ya?

Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịchọta dọkịta dị njikere ịnabata nkwurịta okwu na inye aka, onye dị njikere iji nwayọọ na mkpachara anya kọwaara onye ọrịa na ezinụlọ ya ihe nile. “Ezigbo dọkịta,” ka akwụkwọ bụ́ A Special Child in the Family na-ekwu, “na-echebara ezinụlọ ahụ dum echiche, nweekwa nkà nile dị mkpa maka ọgwụgwọ ọrịa.”

Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịnọgide na-ajụ ajụjụ ndị a kapịrị ọnụ ruo mgbe ị ghọtara ọnọdụ ahụ nke ọma ruo n’ókè i nwere ike. Otú ọ dị, cheta na mgbe gị na dọkịta nọ, ọ na-adị mfe inwe mgbagwoju anya na ichezọ ihe ị chọrọ ịjụ. Otu aro na-enye aka bụ idetusị ajụjụ tupu ị gawa ịhụ ya. Karịsịa, ị pụrụ ịchọ ịmata ihe ị ga-atụ anya ya n’ọrịa ahụ na n’ọgwụgwọ ya na ihe ị ga-eme banyere ya.—Lee igbe bụ́ “Ajụjụ Ndị Ezinụlọ Pụrụ Ịjụ Dọkịta.”

Ọ dị mkpa karịsịa inye ụmụnne nwatakịrị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala ihe ọmụma zuru ezu. “Kọwaa ihe merenụ mgbe a mụrụ ya,” ka otu nne na-atụ aro ya. “Ha pụrụ n’ụzọ dị mfe inwe mmetụta nke ịbụ ndị e kewapụrụ iche n’ezinụlọ ma ọ bụrụ na ha aghọtaghị ihe na-aganụ.”

Ezinụlọ ụfọdụ enwewokwa ike inweta ihe ọmụma bara uru site n’ime nchọpụta n’ọbá akwụkwọ dị n’ógbè ha, n’ebe a na-ere akwụkwọ, ma ọ bụ n’Internet—ọtụtụ mgbe ha na-enweta ihe ọmụma zuru ezu banyere ọrịa ụfọdụ kpọmkwem.

Ịnọgịde Na-ebi Ndụ Dịtụ Mma

Ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị ndị òtù ezinụlọ ịchọ ime ka onye ọrịa ahụ nọgide na-ebi ndụ dịtụ mma. Were, dị ka ihe atụ, Neil du Toit, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ. Ọ ka na-enwe obi nkoropụ n’ihi ike ọgwụgwụ nke ọrịa ya na-akpata. Ka o sina dị, ọ na-etinye ihe dị ka awa 70 n’otu ọnwa n’ime ihe ọ kasị enwe mmasị ime—ịgwa ndị nọ n’ógbè ha okwu banyere olileanya ya dabeere na Bible. “Inye ntụziaka Bible n’ọgbakọ,” ka ọ na-ekwu, “na-emekwa ka m nwee afọ ojuju n’ime onwe m.”

Ibi ndụ dịtụ mma gụnyekwara ikike nke igosi na inweta ịhụnanya, ime ihe ndị na-enye obi ụtọ, na ịnọgide na-enwe olileanya. Ndị ọrịa ka ga-achọ ịma ụtọ ndụ ruo n’ókè ọrịa ha na ọgwụgwọ a na-enye ha ga-ekwe. Otu nna nke ezinụlọ ya nagideworo ọrịa nwa ha ruo ihe karịrị afọ 25 na-akọwa, sị: “Ihe omume ndị a na-eme n’èzí na-amasị anyị, ma n’ihi ọnọdụ nwa m nwoke, anyị apụghị ime mkpagharị. N’ihi ya anyị na-eme ya n’ụzọ dị iche. Anyị na-aga mee ihe omume ndị a na-eme n’èzí bụ́ ndị na-achọghị imesi ihe ike.”

Ee, ndị ọrịa na-anọgide na-enwe ikike ndị na-eme ka ha nwee ike inwetụ afọ ojuju ná ndụ. Dabere n’ụdị ọrịa ha, ọtụtụ ka pụrụ inwe mmasị ịga ebe ndị mara mma na ịnụ egwú ndị dị ụtọ. Ka ha na-enwe mmetụta nke ịchịkwali akụkụ dị iche iche nke ndụ ha, otú ahụ ka o yikarịrị ka ha ga-ebi ndụ dịtụ mma.

Ime Ihe Banyere Mmetụta Uche Ndị Siri Ike

Akụkụ dị oké mkpa nke ịnagide ya gụnyere ịmụta ụzọ isi chịkwaa mmetụta uche ndị na-emerụ ahụ. Otu n’ime ha bụ iwe. Bible na-ekweta na mmadụ pụrụ inwe ihe mere ọ ga-eji wee iwe. Otú ọ dị, ọ na-agbakwa anyị ume ka anyị ghara ‘iwe iwe ọsọ ọsọ.’ (Ilu 14:29) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe ime otú ahụ? Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, iwe “pụrụ iji nke nta nke nta bibie gị ma mee ka i nwee obi ilu ma ọ bụ mee ka i kwuo ihe ndị na-akpasu iwe ị ga-emesị kwaara ụta.” Ọbụna otu ugboro e were iwe pụrụ ịkpata ihe mgbu pụrụ iwe ogologo oge tupu e chezọọ ya.

Bible na-atụ aro, sị: “Ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) O doro anya na ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime iji mee ka anyanwụ ghara ịda n’oge ya. Ma anyị pụrụ ime ihe iji mee ka “mkpasu iwe” anyị dajụọ ngwa ngwa ka anyị ghara ịnọgide na-akpatara onwe anyị na ndị ọzọ nsogbu. O yikarịkwara ka ị ga-eme ihe banyere otu ọnọdụ n’ụzọ ka nnọọ mma ma ọ bụrụ na iwe gị adajụọ.

Dị ka ezinụlọ ọ bụla, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke gị ga-enwe ọnọdụ ndị dị mma na ndị dị njọ. Ọtụtụ ndị na-achọpụta na ha na-anagide ihe karị mgbe ha kọọrọ ya ibe ha ma ọ bụ onye ọzọ nwere obi ebere na ọmịiko. Nke a bụ n’ezie ihe Kathleen mere. O buru ụzọ lekọta nne ya, bụ́ onye rịara ọrịa cancer, e mesịa o lekọta di ya, bụ́ onye nwere oké ịda mbà n’obi ma mesịa rịawa ọrịa Alzheimer. Ọ na-ekweta, sị: “Ịgwa ndị enyi m nwere ọmịiko okwu bụ ụzọ m si nweta ahụ efe na nkasị obi.” Rosemary, bụ́ onye lekọtara nne ya ruo afọ abụọ, na-ekweta nke ahụ. “Ịgwa ezi enyị m okwu,” ka ọ na-ekwu, “nyeere m aka ịnọgide na-enwe mmetụta uche dị mma.”

Otú ọ dị, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ị pụghị igbochi anya mmiri ka ị na-ekwu okwu. “Ịkwa ákwá na-ebeleta obi erughị ala na ihe mgbu, ọ na-enyekwara gị aka imeri mwute ị na-enwe,” ka akwụkwọ bụ́ A Special Child in the Family, na-ekwu. *

Nọgide Na-enwe Àgwà Ziri Ezi

“Ọchịchọ i nwere ịdị ndụ pụrụ ịkwagide gị mgbe ị na-arịa ọrịa,” ka Eze Solomọn maara ihe kwuru. (Ilu 18:14, Today’s English Version) Ndị nnyocha nke oge a ekwuwo na atụmanya ndị ọrịa—ma ha bụ ndị dị njọ ma ha bụ ndị dị mma—na-eyikarị ka hà na-emetụta ihe ọgwụgwọ ha ga-arụpụta. Otú ọ dị, olee otú ezinụlọ pụrụ isi nọgide na-enwe nchekwube n’agbanyeghị ọrịa diteworo aka?

Ọ bụ ezie na ha agaghị eleghara ọrịa ahụ anya, ezinụlọ ga-anagide ọrịa karị mgbe ha lekwasịrị anya n’ihe ndị ha ka nwere ike ime. “Ọnọdụ ahụ pụrụ ime ka unu nwee nnọọ echiche na-ezighị ezi,” ka otu nna na-ekweta, “ma unu aghaghị ịghọta na unu ka nwere ọtụtụ ihe. Unu ka nwere ndụ, onwe unu, na ndị enyi unu.”

Ọ bụ ezie na a gaghị eji ọrịa na-adịghị ala ala egwurịa egwu, omume dị mma nke ịkpa ọchị na-enye aka egbochi mmụọ nke enweghị nchekwube. Omume ịkpa ọchị nke ezinụlọ Du Toit na-eme n’oge kwesịrị ekwesị na-egosipụta nke ahụ. Collette, bụ́ nwanne nwanyị Neil du Toit nke ha tọchara, na-akọwa, sị: “Ebe ọ bụ na anyị amụtawo ịnagide ọnọdụ ụfọdụ, anyị pụrụ ịchị ihe ndị na-eme anyị ọchị bụ́ ndị pụrụ ịdị ka ha ga-akpasu ndị ọzọ nnukwu iwe. Ma ime otú ahụ na-enye aka n’ezie n’ibelata obi erughị ala.” Bible na-emesi anyị obi ike na “obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ dị mma.”—Ilu 17:22.

Ihe Ime Mmụọ Ndị Dị Oké Mkpa

Akụkụ dị mkpa nke ọdịmma ime mmụọ nke ezi ndị Kraịst gụnyere ‘isite n’ekpere na arịrịọ mee ka Chineke mara ihe nile ha na-arịọ.’ Ihe ọ na-arụpụta bụ ihe e kwere ná nkwa na Bible: “Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 nke ilekọta ụmụ ya abụọ na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala gasịrị, otu nne na-ekwu, sị: “Anyị amụtawo na Jehova na-enyere gị aka ịnagide ihe. Ọ na-akwagide gị n’ezie.”

Ọzọkwa, nkwa Bible na-ekwe maka ụwa paradaịs na-enweghị ihe mgbu na ahụhụ na-ewusi ọtụtụ ndị ike. (Mkpughe 21:3, 4) “N’ihi ọrịa ndị na-adịghị ala ala ezinụlọ anyị cheworo ihu,” ka Braam na-ekwu, “anyị na-ahụ abamuru ọzọ nke nkwa Chineke kwere na ‘onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpụ ọṅụ.’” Dị ka ọtụtụ ndị ọzọ, ọ na-agụsi ezinụlọ Du Toit agụụ ike ịhụ oge ahụ na Paradaịs mgbe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24; 35:6.

Nwee obi ụtọ. Ihe mgbu na ahụhụ na-erikpu ihe a kpọrọ mmadụ bụ n’onwe ha akụkụ ihe àmà nke na-egosi na ọnọdụ ndị ka mma dị nso. (Luk 21:7, 10, 11) Otú ọ dị, ka ọ dịgodị, ọtụtụ ndị na-enye nlekọta na ndị ọrịa pụrụ ịgba akaebe na Jehova bụ, n’ezie, “Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Maka ntụle zuru ezu nke ụzọ isi nagide mkpasasị uche nke ọrịa na-akpata, biko lee “Inye Nlekọta—Ịnagide Ihe Ịma Aka Ya,” dị na Teta! nke February 8, 1997, peji nke 3-13.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

Ajụjụ Ndị Ezinụlọ Pụrụ Ịjụ Dọkịta

• Olee ihe ọrịa ahụ ga-aghọ, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?

• Mgbaàmà ndị dị aṅaa ga-adị, oleekwa ụzọ a puṛụ isi chịkwaa ha?

• Olee ihe ndị ọzọ a pụrụ iji dochie anya ọgwụgwọ ya?

• Olee nsogbu ndị ọzọ ọ pụrụ ịkpata, ihe ize ndụ, na abamuru nke ọgwụgwọ dị iche iche?

• Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka ọnọdụ ahụ ka mma, gịnịkwa ka a e kwesịrị izere?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nye Aka

Ndị ụfọdụ pụrụ izere ịga nleta ma ọ bụ inye aka n’ihi na ha amaghị ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ ụzọ ha ga-esi mee ihe banyere ọnọdụ ahụ. Ndị ọzọ pụrụ iyi ka ha na-atụ ụka, sitekwa n’ịmanye ndị ọzọ ime ihe ha chere ga-enye aka, ha pụrụ ịkpatakwuru ezinụlọ ahụ ahụ erughị ala. Oleezi otú mmadụ pụrụ isi nyere ndị nwere onye òtù ezinụlọ na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala aka n’etinyeghị ọnụ n’ihe ndị dịịrị nanị ezinụlọ ahụ?

Jiri Mmetụta Ọmịiko Na-ege Ntị. “Na-anụ ihe ọsọ ọsọ,” ka Jemes 1:19 na-ekwu. Na-egosi nchegbu site n’ịbụ onye na-ege ntị nke ọma, na-ekwekwa ka ndị òtù ezinụlọ butuo ibu arọ ha ma ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu okwu. Ha ga-achọ ime otú ahụ karị ma ọ bụrụ na ha achọpụta na i nwere “mmetụta maka ndị ọzọ.” (1 Pita 3:8, NW) Otú ọ dị, buru n’uche na ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ ezinụlọ abụọ na-emeghachi omume n’ebe ọrịa na-adịghị ala ala dị n’otu ụzọ. N’ihi ya, “enyela ndụmọdụ ọ gwụla ma ị maara ihe nile n’ezie banyere ọrịa ahụ ma ọ bụ ọnọdụ ahụ,” ka Kathleen, bụ́ onye lekọtara nne ya ma mesịa lekọtawa di ya na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala, na-ekwu. (Ilu 10:19) Chetakwa, ọ bụrụgodị na ị matụụrụ ihe banyere ọnọdụ ahụ, onye ọrịa ahụ na ezinụlọ ya pụrụ ikpebi na ha agaghị achọ ma ọ bụ ịnara ndụmọdụ gị.

Na-enyere Ha Aka n’Ụzọ A Na-ahụ Anya. Ka ị na-amata mkpa ọ dị ezinụlọ ahụ ime ihe ndị dịịrị nanị ha, wepụta onwe gị ijere ha ozi mgbe ha chọrọ gị n’ezie. (1 Ndị Kọrint 10:24) Braam, bụ́ onye e hotaworo n’ime usoro isiokwu a dum, na-ekwu, sị: “Enyemaka nke ndị enyi anyị bụ́ ndị Kraịst buru nnọọ ibu. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị nọbọrọ chi n’ụlọ ọgwụ n’ihi na ọrịa na-arịasi Michelle ike, anyị nwere ndị enyi anyị site na mmadụ anọ ruo mmadụ isii sooro anyị nọbọọ chi n’oge nile ahụ. Mgbe ọ bụla anyị chọrọ enyemaka, anyị na-enweta ya.” Nwunye Braam, bụ́ Ann, na-ekwukwa, sị: “Ọ bụ oge oké oyi, ruokwa izu abụọ a nọ na-enye anyị ụdị ofe dị iche kwa ụbọchị. E mere ka anyị rijuo afọ site n’inye anyị ofe dị ọkụ na ezi ịhụnanya dị ukwuu.”

Na-eso Ha Ekpe Ekpere. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị ezigbo ihe bara uru ị pụrụ ime. Otú ọ dị, otu n’ime ihe ndị kasị agba ume bụ iso ndị ọrịa na ezinụlọ ha kerịta echiche Akwụkwọ Nsọ na-ewuli elu ma ọ bụ kpee ekpere sitere n’ala ala obi. (Jemes 5:16) “Ya adịla mgbe ị ga-elelị ikike nke ikpere—na isoro—ndị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala na ezinụlọ ha kpee ekpere,” ka Nicolas dị afọ 18 na-ekwu, bụ́ onye nne ya nwere oké ịda mbà n’obi.

Ee, ụdị nkwado ziri ezi pụrụ ime ihe dị ukwuu n’inyere ezinụlọ aka ịnagide ahụhụ nke ọrịa na-adịghị ala ala. Bible na-ekwu ya otú a, sị: “Enyi bụ onye na-ahụ n’anya mgbe nile, a na-amụkwa nwanne isoro kerịta nsogbu.”—Ilu 17:17, The New English Bible.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]

Mgbe Ọrịa ahụ Bụ nke Na-enweghị Ngwọta

Ezinụlọ ụfọdụ pụrụ ịla azụ ịtụle ọnwụ na-eru nso nke onye ha hụrụ n’anya na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ Caring—How to Cope na-ekwu na “ọ bụrụ na i nwetụrụ nghọta nke ihe a ga-atụ anya ya na ihe i kwesịrị ime, ọ pụrụ inye aka ibelata egwu.” Ọ bụ ezie na ihe ụfọdụ a ga-eme kpọmkwem ga-adịgasị iche na-adabere n’iwu na omenala ógbè, ndị a bụ aro ụfọdụ ezinụlọ pụrụ ịtụle mgbe ha nọ n’ụlọ na-elekọta onye ha hụrụ n’anya na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta.

Tupu Oge Eruo

1. Jụọ dọkịta ihe a ga-atụ anya ya n’ụbọchị na awa ndị ikpeazụ nakwa ihe a na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na onye ahụ anwụọ n’abalị.

2. Depụta aha ndị ọ ga-adị mkpa ka e mee ka ha mara banyere ọnwụ ya.

3.Tụlee otú a ga-esi lie ya:

• Gịnị ka onye ọrịa ahụ chọrọ ka e mee?

• À ga-eli ya eli ka à ga-esu ya ọkụ? Tụlee ihe ozi ndị nduzi olili ozu dị iche iche ga-efu.

• Olee mgbe e kwesịrị ili ya? Nye oge maka njem a ga-eme.

• Ònye ga-eduzi ma ọ bụ kwuo okwu olili ozu ahụ?

• Olee ebe a ga-anọ kwuo ya?

4. Ọbụna ma ọ bụrụ na e nyere ya ọgwụ na-akụjụ ahụ, onye ọrịa ahụ ka pụrụ ịnụ ihe a na-ekwu nakwa ịmata ihe a na-eme gburugburu ya. Kpachara anya ka ị ghara ịnọ n’ihu ya kwuo ihe ọ bụla ị na-achọghị ka ọ nụ. Ị pụrụ ịchọ imesi ya obi ike site n’ikwunyere ya okwu n’olu dị ala na site n’ijide aka ya.

Mgbe Onye ahụ A Hụrụ n’Anya Nwụrụ

Ndị a bụ ihe ụfọdụ ndị ọzọ pụrụ ime iji nyere ezinụlọ ahụ aka:

1. Nye ezinụlọ ahụ ohere ruo n’ókè ezi uche dị na ya ka nanị ha na onye ahụ nwụrụ anwụ nọọ ka ha nwee ike ịmalite idi ọnwụ ya.

2. Soro ezinụlọ ahụ kpee ekpere.

3. Mgbe ezinụlọ ahụ dị njikere, ha pụrụ ịchọ ka e nyere ha aka mee ka ndị na-esonụ mara banyere ya:

• Dọkịta ka o kwubie na ọ nwụọla ma nye satifiketi ọnwụ.

• Onye nduzi olili ozu, ebe nchekwa ozu, ma ọ bụ ebe a na-esu ozu ọkụ, ka ha lekọta ozu ahụ.

• Ndị ikwu na ndị enyi ha. (Ị pụrụ iji akọ kwuo ihe dị otú a: “M na-akpọtụrụ gị maka [aha onye ọrịa ahụ]. Ya ewutela gị na m wetaara gị akụkọ ọjọọ. Dị ka ị maara, ya na [ọrịa] anọwo na-agba mgba ruo oge ụfọdụ, ọ nwụrụ [mgbe na ebe].”)

• Ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ iji maa ọkwa ọnwụ ya ma ọ bụrụ na ha achọọ.

4. Ezinụlọ ahụ pụrụ ịchọ ịkpọ mmadụ ka o nyere ha aka mechaa ndokwa olili ozu ahụ.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị òtù ezinụlọ kwesịrị ime ihe ha nwere ike ime iji nọgide na-ebi ndụ dịtụ mma

[Foto dị na peeji nke 10]

Isoro ezinụlọ ahụ kpee ekpere pụrụ inyere ha aka ịnagide ya