Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịṅụ Ọgwụ Aspirin Kwa Ụbọchị—M̀ Kwesịrị Ka Ọ̀ Bụ na M Kwesịghị?

Ịṅụ Ọgwụ Aspirin Kwa Ụbọchị—M̀ Kwesịrị Ka Ọ̀ Bụ na M Kwesịghị?

Ịṅụ Ọgwụ Aspirin Kwa Ụbọchị—M̀ Kwesịrị Ka Ọ̀ Bụ na M Kwesịghị?

Ọnọdụ na-esonụ nke otu dọkịta kọwara yiri ihe na-eme eme. Ọ na-egosipụta nsogbu dị mwute a na-enwe ọtụtụ mgbe.

EZINỤLỌ ahụ dum nwere nchegbu. Ugbu a ọbụna dọkịta ha nwekwara. “Ọ bụrụ na ọbara na-agba ya akwụsịghị ọsọ ọsọ,” ka dọkịta ahụ kwuru, “anyị nwere ike lee ma a ga-amịnye ya ọbara.”

Rụọ ọtụtụ izu, ọbara ji nke nta nke nta na-agba nwoke ahụ n’ime eriri afọ, a chọpụtara na ọ na-enwe afọ mgbu. “Ì ji n’aka na ọ dịghị ọgwụ ị na-aṅụ?” ka dọkịta ahụ nwerelarị nkụda mmụọ jụrụ.

“Mba. Ọ bụ nanị ọgwụ a m jere zụrụ n’onwe m maka ọrịa arthritis m,” ka nwoke ahụ kwuru.

Ozugbo dọkịta ahụ ghewere ntị ya oghe. “Ka m hụgodị ya.” Ka o ji nlezianya na-enyocha akwụkwọ a mapawara n’ọgwụ ahụ bụ́ nke na-akọwa ihe ndị e ji mee ya, ọ hụrụ ihe ọ na-achọ. Mmiri ọgwụ bụ́ acetylsalicylic acid! Okwu ebiela. Mgbe onye ọrịa ahụ kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ahụ nwere aspirin, e nyekwa ya iron na ụfọdụ ọgwụ ndị ọzọ na-agwọ ọrịa afọ, ọbara ọgbụgba ahụ kwụsịrị, ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ya jikwa nke nta nke nta dịghachi otú o kwesịrị ịdị.

Ọbara Ọgbụgba nke Ọgwụ Na-akpata

Ọbara ịgba mmadụ n’ime eriri afọ bụ́ nke ọgwụ na-akpata bụ nnukwute nsogbu ahụ ike e nwere taa. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ọgwụ pụrụ ịkpata ya, ọ bụ ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa arthritis na ahụ mgbu na-akpata ihe ka ukwuu ná nsogbu ndị dị otú ahụ. Ndị a na-agụnye ọgwụ ndị so ná ndị na-agwọ afọ mgbu bụ́ ndị a na-ejighị mmiri ọgwụ steroid mee, ma ọ bụ NSAIDS. A pụrụ ịkpọ ya ihe dịgasị iche iche site n’otu mba gaa n’ọzọ.

A na-ahụ aspirin n’ọtụtụ ọgwụ ndị mmadụ na-azụrụ n’onwe ha, n’ọtụtụ mba ndị na-aṅụ ọgwụ aspirin kwa ụbọchị amụbawokwa n’afọ ndị na-adịbeghị anya. N’ihi gịnị?

Inwe Oké Mmasị n’Ọgwụ Aspirin

Na 1995 Harvard Health Letter kọrọ na “ịṅụ ọgwụ aspirin mgbe nile na-echekwa ndụ.” N’ihota ọtụtụ nnyocha e mere n’ụwa nile, bụ́ ndị e meghachiworo ọtụtụ ugboro eri mgbe ahụ, ndị nnyocha kwubiri, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla nweworo nkụchi obi ma ọ bụ rịaworo ọrịa strok, nwere ọrịa obi, ma ọ bụ onye e gbugharịworo okpo akwara obi ya kwesịrị ịdị na-aṅụ site n’ọkara ruo otu mkpụrụ ọgwụ aspirin kwa ụbọchị, ọ gwụla ma ahụ ya adịghị anabata ọgwụ ahụ.” *

Ndị nnyocha ndị ọzọ na-ekwu na ịṅụ ọgwụ aspirin kwa ụbọchị ga-abara ndị ikom gafeworo afọ 50 uru bụ́ ndị pụrụ inwe nkuchi obi nakwa ndị inyom pụrụ inwe ya. Ọzọkwa, e nwere nnyocha ndị na-egosi na ịṅụ ọgwụ aspirin kwa ụbọchị pụrụ ibelata ohere e nwere ịrịa ọrịa cancer eriri afọ nakwa na ịṅụ ya hie nne ruo ogologo oge pụrụ inye aka belata shuga dị n’ọbara onye na-arịa ọrịa shuga.

Olee otú ọgwụ aspirin si arụ ọrụ iji rụzuo ihe ndị a e bu n’uche na ọ na-arụ? Ọ bụ ezie na a machaghị ha nile, ihe àmà na-egosi na ọgwụ aspirin na-eme ka platelet ndị na-adị n’ọbara ghara ịlọcha alọ, si otú a na-egbochi mkpụkọ nke ọbara. Ikekwe, nke a na-enye aka egbochi mkpọchi nke obere akwara ndị gara n’obi na ụbụrụ, si otú a na-egbochi akụkụ ahụ ndị dị mkpa imebi.

Ebe e nwere ihe ndị a nile e chere na ọgwụ aspirin na-arụ, n’ihi gịnị ka mmadụ nile na-ejighị aṅụ ya? Otu ihe bụ na a ka nwere ọtụtụ ihe a na-amaghị. A maghịdị mkpụrụ ole dị mma ịṅụ otu ugboro. Aro ndị a tụrụ bụ ịṅụ site n’otu mkpụrụ ugboro abụọ n’ụbọchị ruo n’ịṅụ nanị obere ọgwụ aspirin kwa ụbọchị abụọ. Mkpụrụ ole ndị inyom ga-aṅụ ò kwesịrị ịdị iche na nke ndị ikom? Ndị dọkịta amachaghị. Ọ bụ ezie na a pụrụ ile ọgwụ aspirin nke mkpụrụ anya dị ka nke pụrụ inye aka, a ka na-arụ ụka banyere abamuru nke ọgwụ aspirin nke mmiri.

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Kpachara Anya

Ọ bụ ezie na e nyochawa ya, ọgwụ aspirin abụghị ihe aka mere—Ndị India America na-enweta mmiri aspirin n’ụgbụgbọ osisi willow—o nwere ọtụtụ ihe ọ na-akpata. E wezụga eziokwu bụ́ na ọ na-akpatara ndị ụfọdụ ọbara ọgbụgba, e nwere ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ ọgwụ aspirin pụrụ ịkpata, gụnyere inye ndị ahụ ha na-adịghị anabata ọgwụ aspirin nsogbu n’ahụ. O doro anya na ịṅụ ọgwụ aspirin kwa ụbọchị abụghị maka mmadụ nile.

Otú ọ dị, onye nọ n’ihe ize ndụ nke nkụchi obi ma ọ bụ ọrịa strok ma ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe ndị pụrụ ịkpata ha, kwesịrị ịjụ dọkịta ya banyere ihe ize ndụ na abamuru nke ịṅụ ọgwụ aspirin kwa ụbọchị. N’ezie onye ahụ kwesịrị ịhụ na o nweghị nsogbu ọbara ọgbụgba, na ahụ ya na-anabata ọgwụ aspirin, nakwa na o nweghị nsogbu afọ ma ọ bụ eriri afọ. E kwesịrị isoro dọkịta tụlee nsogbu ndị ọzọ pụrụ ịdapụta ma ọ bụ mmetụta nke ọgwụ ahụ ga-enwe tupu a malite usoro ọgwụgwọ.

Dị ka e kwuburu, ọgwụ aspirin na ọgwụ ndị yiri aspirin pụrụ nnọọ ịkpata ọbara ọgbụgba. Ọbara ọgbụgba ahụ pụkwara isi ike nchọpụta, ọ gaghị apụta ìhè ozugbo, ọ ga-ejikwa nke nta nke nta na-akawanye njọ ka oge na-aga. Ọ dịkwa mkpa ka e jiri nlezianya tụlee ọgwụ ndị ọzọ, karịsịa ọgwụ ndị ọzọ na-agwọ afọ mgbu. Hụ na ị gwara dọkịta gị ma ọ bụrụ na ị na-aṅụ nke ọ bụla n’ime ha. N’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ ọ ga-abụ ihe amamihe ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ahụ tupu a waa gị ahụ. Ikekwe ọbụna inyocha ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara gị mgbe nile ga-enye aka.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ichebe onwe anyị pụọ ná nsogbu ndị ga-abịa n’ọdịnihu, anyị ga-aṅa ntị n’ilu Bible bụ́: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, ha aghaghịkwa inweta mfu.” (Ilu 22:3, NW) N’okwu a metụtara ahụ ike, ka anyị soro ná ndị nwere ezi uche ebe ọ ga-eme ka anyị ghara ịtụfu ahụ ike anyị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Teta! adịghị atụ aro ka a gbasoo otu ụdị ọgwụgwọ ọ bụla.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Olee Ndị Pụrụ Ịtụle Ịṅụ Ọgwụ Aspirin Kwa Ụbọchị

● Ndị na-arịa ọrịa obi ma ọ bụ ndị nwere akwara olu ndị na-ebughị ibu.

● Ndị rịaworo ọrịa strok n’ihi mkpụkọ nke ọbara ma ọ bụ ndị ọrịa strok kpatụrụ aka.

● Ndị ikom gafeworo afọ 50 bụ́ ndị nwere otu ma ọ bụ karịa n’ime ihe ndị a na-esonụ bụ́ ndị pụrụ ịkpata ọrịa obi: ise siga, ọbara mgbali elu, ọrịa shuga, ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol dị elu, ọ̀tụ̀tụ̀ HDL cholesterol dị ala, oké ibu, ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè, ezinụlọ na-arịa ọrịa obi na nwata (inwe nkụchi obi tupu e ruo afọ 55) ma ọ bụ ọrịa strok, na ịnọkarị otu ebe.

● Ndị inyom gafeworo afọ 50 bụ́ ndị nwere abụọ ma ọ bụ karịa n’ime ihe ndị ahụ pụrụ ịkpata ọrịa obi.

I nwere ike chọọ ịkpọtụrụ dọkịta gị tupu i mee mkpebi ọ bụla banyere nsogbu a.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Consumer Reports on Health