Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Banyere Osimiri Abụọ

Akụkọ Banyere Osimiri Abụọ

Akụkọ Banyere Osimiri Abụọ

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’INDIA

Osimiri abụọ bụ́ ebe bụ́ isi na-akwagide ndụ nke ndị bi n’ógbè buru ibu bụ́ India na-enye ọtụtụ narị nde mmadụ ihe ndị ha ji akwado ndụ. Ebe ọ bụ na ebe ha malitere dịdewere ibe ha n’akụkụ na-ajụ oyi nke ugwu ndị kasị elu nke ụwa, nke ọ bụla n’ime ha na-asọ n’ụzọ dị egwu n’ihe karịrị kilomita 2,400, na-esite ná mba abụọ karịsịa asọfe. Ha na-asọba n’osimiri abụọ dị iche. Osimiri nke ọ bụla bụ ebe mmepeanya oge ochie malitere. Nke ọ bụla n’ime ha nọ tupu mmalite nke otu okpukpe bụ́ isi. Ndị mmadụ nwere mmasị na ha abụọ n’ihi ihe ndị ha na-enweta na ha, a na-efe otu ofufe ọbụna taa. Gịnị bụ aha ha? Indus na Ganges, a maara nke ikpeazụ n’India ebe a dị ka Ganga.

N’IHI na mmiri dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa iji dịrị ndụ na maka ọganihu, mmepeanya ndị mbụ malitere na gburugburu osimiri. Ebe ọ bụ na mgbe ụfọdụ a na-eme ka osimiri dịgasị iche yie chi nwoke na chi nwanyị dị iche iche, ọ pụrụ ịbụ na e ji akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme gwagbuo ihe ndekọ ya ndị mbụ. Nke a bụ nnọọ eziokwu banyere akụkọ ihe mere eme nke Indus na Ganga, nke a makwaara n’India dị ka Ganga Ma (Nne Ganga).

Nye ma ndị Hindu ma ndị Buddha, Ugwu Kailash nke dị mita 6,714 n’ịdị elu na Ọdọ Mmiri Manasarovar dị ya nso, bụ ebe obibi nke ndị bụ́ chi. Ruo ogologo oge, e kweere na oké osimiri anọ na-asọpụta site n’ọdọ mmiri ahụ site n’ọnụ ụmụ anụmanụ. Osimiri ọdụm bụ Indus, osimiri ekwuru ụlọ bụ Ganga.

Ndị Tibet anabataghị ndị nchọpụta si mba ọzọ. Otú ọ dị, na 1811, onye England na-awa ụmụ anụmanụ ahụ bụ́ onye Ụlọ Ọrụ Ọwụwa Anyanwụ India were n’ọrụ mere njem gburugburu ala ahụ n’ọdịdị dị iche iche. Ọ kọrọ na ọ dịghị osimiri ndị si na Manasarovar na-asọpụta, ọ bụ ezie na mmiri ụfọdụ ndị si n’ugwu na-asọba n’ime ya. Ọ bụ nanị ná mmalite nke narị afọ nke 20 ka a matara ebe isi mmiri nke Indus na Ganga dị. Indus nwere isi ya na Tibet, n’ebe ugwu nke Himalaya, ebe Ganga malitere n’ọgba ice dị na ndagwurugwu nke Himalaya nke dị na ndagwurugwu dị n’ebe ugwu India.

Ebe Mmepeanya Oge Ochie Malitere

E kweere na ndị mbụ biri n’ógbè ahụ buru ibu bụ́ India gara n’ebe ọwụwa anyanwụ wee banye na Ndagwurugwu Indus. N’ebe a, ndị ọkà mmụta n’ihe ochie achọpụtawo mkpọmkpọ ihe ndị gosiri oké mmepeanya e nwere n’ebe ndị dị ka Harappa na Mohenjo-Daro. N’afọ iri ndị mbụ nke narị afọ nke 20, nchọpụta ndị a gbanwere echiche e nwere na ndị mbụ biri n’India bụ agbụrụ oge ochie na-awagharị awagharị. Ihe karịrị afọ 4,000 gara aga, Mmepeanya Indus haruru ka nke Mesopotamia ma ọ bụrụ na ọ kaghị ya. Ihe àmà nke okporo ámá ndị yiri onwe ha, ụlọ elu ndị nwere ọtụtụ okpukpu na ụlọ obibi dị iche iche, olulu mmiri nsị ndị bụ́ ọkpọka, ụlọ nkwakọba ọka ndị buru ibu, ụlọ nsọ, na ọdọ mmiri maka ememe nsacha, na-egosicha na ọ bụ obodo mepere nnọọ emepe. E nwekwara ihe àmà nke njikọ azụmahịa dị n’etiti Mesopotamia na Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, na-enwe Indus dị ka ụzọ e si aga n’Osimiri Arebia site n’ọtụtụ narị kilomita n’ime obodo.

Ruo ọtụtụ narị afọ, ọdachi ndị na-emere onwe ha—eleghị anya ala ọma jijiji ma ọ bụ oké idei mmiri—yiri ka ha ebelatawo mmepe nke Ndagwurugwu Indus. Nke a mere ka nnubata n’ìgwè nke agbụrụ ndị na-awagharị awagharị si n’Ebe Etiti Esia dị mfe, bụ́ ndị a na-akpọkarị ndị Aryan. Ha chụpụrụ ọtụtụ ndị bi ebe ahụ site n’osimiri ahụ, nke mere ka e were omenala oge ochie ndị dị na gburugburu Indus gaa ndịda India, bụ́ ebe agbụrụ ndị na-asụ asụsụ Dravidian ka bi ugbu a dị ka otu n’ime agbụrụ ndị bụ́ isi n’India.

N’ịga n’ebe ọwụwa anyanwụ site n’India, ụfọdụ ndị agbụrụ na-asụ asụsụ Aryan malitere ibi n’ọzara Ganga. N’ụzọ dị otú a, akụkụ na-asụ Aryan nke ógbè ahụ buru ibu malitere ọdịbendị ha pụrụ iche n’ebe ugwu nke India, nke e jikọrọ ya na Osimiri Ganga n’ụzọ bụ́ isi, bụ́ ebe ọ ka dị n’ụzọ dị ukwuu taa.

Osimiri Abụọ na Okpukpe Abụọ

Ihe mgbe ochie ndị a chọpụtara na-egosi myirịta dị n’etiti okpukpe a na-ekpe na Ndagwurugwu Indus na nke a na-ekpe na Mesopotamia. A chọtawo ụfọdụ ihe ncheta mgbe ochie nke okpukpe Hindu, bụ́ ndị a nọbu na-eche na ha bụ nke ndị Aryan, ná mkpọmkpọ ebe nke obodo dị iche iche nke Indus. Site n’ijikọ chi ndị Aryan na nke ndị bu ha ụzọ, nakwa nkwenkwe okpukpe, e hiwere okpukpe Hindu. Na mbụ, ndị Aryan na-ewere Indus dị ka ihe dị nsọ, ma ka ha na-aga ebe ọwụwa anyanwụ ma na-ebi na Ganga, ha maliteziri ife mmiri ahụ. Ka ọtụtụ narị afọ na-agafe, obodo ndị dị ka Haridwar, Allahabad, na Varanasi malitere ịdị na Ganga. Ndị a weere Hindu dị ka okpukpe bụ́ isi. Taa, ọtụtụ nde ndị na-eme njem ala nsọ na-enuga n’ebe ndị ahụ iji mikpuo onwe ha ná mmiri Ganga, bụ́ nke e weere na ọ na-agwọ ọrịa ma na-eme ka a dị ọcha.

Ọ bụ ezie na okpukpe Hindu malitere na gburugburu Indus, okpukpe Buddha malitere ná nso Ganga. Ọ bụ na Sarnath, nke dịdewere Varanasi, ka Siddhārtha Gautama, onye a na-akpọ Buddha, ziri ozizi mbụ ya. E kwuru na o gwuuru mmiri gafee n’obosara buru ibu nke Ganga mgbe ọ dị afọ 79.

Gịnị Bụ Ọnọdụ Osimiri Taa?

Mmiri osimiri dị oké mkpa taa karịa ka ọ dị n’afọ 4,000 gara aga, bụ́ mgbe ndị mmadụ bịara n’ikperé mmiri nke Indus na Ganga maka inweta ihe e ji ebi ndụ. A ghaghị iji nlezianya chịkwaa osimiri ndị ahụ iji kwado ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị bi n’India, Pakistan, na Bangladesh. (Lee map dị na peji nke16-17.) Nkwekọrịta mba na mba adịwo mkpa, ebe ọ bụ na mmiri ahụ adịghị esi nanị n’otu mba asọfere. Gụnyere ihe ndị ọzọ, Pakistan arụwo Ọdọ Mmiri A Gbachibidoro Agbachibido nke Tarbela dị kilomita atọ n’ogologo na mita 143 n’ịdị elu maka ịgba mmiri. Otu n’ime ndị kasị ibu n’ụwa, na-ewere kubik mita 148,500,000 nke ala. Ọdọ Mmiri A Gbachibidoro Agbachibido nke Farakka, nke dị na Ganga, na-agbanye mmiri zuru ezu n’ime osimiri ahụ ka e wee mụbaa ngafe nke ụgbọ mmiri na nso Ọdụ Ụgbọ Mmiri Calcutta.

Dị nnọọ ka ọ dị n’ọtụtụ osimiri, mmetọ bụ nsogbu bụ́ isi Ganga nwere. N’ihi ya, na 1984, ọchịchị India hiwere Atụmatụ Ọrụ nke Ganga nke nwere oké nzube. E lebara anya n’ịtụgharị mmiri nsị ka ọ ghọọ fatịlaịza ma ọ bụ gas bara uru, na-echigharị mmiri nsị na-abanye n’osimiri ahụ ma chee ya ihu ebe ọzọ, ma na-arụ ebe a ga na-etinye ọgwụ ná mmiri nsị.

Otú ọ dị, nsogbu nke iweghachi osimiri ndị dị n’ụwa n’ọnọdụ ha nke dị mma ma dị ọcha ná mbụ na-akarị ike nke ụlọ ọrụ ndị mmadụ hiwere. Ma Chineke ga-agwọta nsogbu ahụ n’isi nso. N’okpuru ọchịchị nke Alaeze ya, ‘osimiri nile ga-akụ aka ha’ ka ụwa dum na-aghọ paradaịs.—Abụ Ọma 98:8.

[Igbe/Map dị na peeji nke 28, 29]

Osimiri Indus Dị Egwu

Ebe e nwere ọtụtụ iyi na-asọkọta ọnụ ma ghọọ Osimiri Indus, e nwewo arụmụka banyere ebe bụ kpọmkwem isi iyi nke osimiri ahụ. Ma, nke bụ eziokwu bụ na oké osimiri a malitere n’elu ugwu Himalaya. Ebe ọ bụ na ọ na-asọga n’ebe ugwu nke ọdịda anyanwụ ma na-asọbanye n’osimiri ndị ọzọ ka ọ na-aga, osimiri ahụ na-asọ kilomita 320 gabiga ugwu dị larịị nke Tibet, “uko ụwa.” Ka osimiri ahụ na-erute n’ókèala India n’ógbè Ladakh, ọ na-asọrọ gabiga ugwu ndị ahụ, na-eruda ná mkpọda ugwu iji mee ka e nwee ọwara n’agbata usoro ugwu Himalaya na Karakoram. N’ókèala India ugbu a, ọ na-eruda ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mita 3,700, na-eru ihe dị ka kilomita 560. N’oge a ọ na-eruda, ọ na-asọga n’ebe ugwu ma tụgharịa n’ike n’ọnụ ọnụ ebe ọdịda anyanwụ nke Himalaya, bụ́ ebe osimiri Gilgit banyere na ya, bụ́ nnukwu osimiri si na Hindu Kush na-asọpụta. Mmiri ahụ na-asọrọzi gaa ndịda gafere Pakistan. N’iji ike agabiga n’etiti ugwu dị iche iche, na-agbagọ ma na-atụgharị n’ike, Osimiri Indus na-emesịa rute n’ọzara ahụ ma sọrọ si na Punjab gafere. Aha a pụtara “Osimiri Ise,” ka nnukwu mmiri ise na-asọnyere mmiri ọzọ​—⁠Beas, Sutlej, Ravi, Jhelum, na Chenab⁠—​na-asọ ka nnukwu mkpịsị aka ise a gbasara agbasa iji banye n’Osimiri Indus ma soro ya ruo ná ngwụsị nke njem ya dị egwu nke ihe karịrị kilomita 2,900.

Ganga A Na-asọpụrụ

N’ebe dị ihe dị ka 100 kilomita site n’ebe ndịda isi mmiri Indus dị na Himalaya ka Ganga malitere njem ya karịrị kilomita 2,500 ruo n’Ọnụ Mmiri Bengal. Mmiri ahụ na-esi n’ime ice yiri ọnụ ehi, nke a na-akpọ Gaumukh n’asụsụ Hindi bụ́ nke dị n’ebe karịrị mita 3,870 n’ogo na-asọpụta, wee ghọọ mmiri iyi a na-akpọ Bhagirathi. Mmiri iyi ọzọ bụ́ Alaknanda na-asọnyere ya na Devaprayag n’ebe dị ihe dị ka kilomita 214 site n’ebe ọ malitere. Mmiri iyi abụọ a, tinyere Mandakini, Dhauliganga, na Pindar ghọrọ Ganga.

Ebe ọ na ọ na-asọga n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ ma gafere ógbè ahụ buru ibu, nnukwu osimiri ndị ọzọ dị ka Yamuna dị na Allahabad n’India nakwa nnukwu Brahmaputra dị na Bangladesh na-asọnyere Ganga. N’ịgbasa dị ka akụpe, Ganga na osimiri ndị ọzọ na-asọnyere ya weere ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ala India dum bụ́ ọzara na-emepụta ihe nke Ganga. Osimiri ahụ weere square kilomita 1,035,000 ma na-akwado ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’India, ndị karịrị otu ijeri ugbu a, n’otu n’ime ebe ndị mmadụ kasị bijupụta n’ụwa. Na Bangladesh, ọ sara mbara nke ukwuu dị ka ọdọ mmiri nwere ụdị ọwa mmiri nile. Ganga kewaziri nwee ọtụtụ nnukwu iyi na ọtụtụ ntakịrị iyi bụ́ otu n’ime ebe ndị mmiri kasị waa ngalaba n’ụwa.

[[Map]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Tibet

PAKISTAN

Indus

Jhelum

Chenab

Sutlej

Harappa

Mohenjo-Daro

INDIA

Ganga

Yamuna

Brahmaputra

Allahabad

Varanasi

Patna

Calcutta

BANGLADESH

NEPAL

BHUTAN

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto]

Ndị Hindu na-asa ahụ na Ganga

[Ebe E Si Nweta Foto]

Sean Sprague/⁠Panos Pictures ji ike mbipụtaghachi nile