Inyere Ndị Ntorobịa Aka Izere “Àgwà Agụghị Ọnwụ n’Oké Ihe”
Inyere Ndị Ntorobịa Aka Izere “Àgwà Agụghị Ọnwụ n’Oké Ihe”
Gịnị mere okwu banyere ọnwụ ji adọrọ mmasị ndị na-eto eto taa? Ome Iwu Henry Hyde, nke na-anọchite anya steeti Illinois, U.S.A., kwuru, sị: “Ndị a na-eto eto nwere agụụ ihe ime mmụọ bụ́ nke ha na-eji àgwà agụghị ọnwụ n’oké ihe na ime ihe ike emeju.”
OTU onye na-agụ magazin Time dere, sị: “Ọ bụ ndị nne na nna dị umengwụ, ntụrụndụ na-egosi ime ihe ike na akụzighị omume ọma na ihe ime mmụọ na-akpata àgwà agụghị ọnwụ n’oké ihe nke dị n’etiti ndị ntorobịa anyị taa.”
Owu ọmụma bụ nsogbu ọzọ so ná ndị kasị eti ndị nọ n’oge uto ihe otiti. Ụfọdụ nọ n’ezinụlọ nke nne na nna na-arụ ọrụ, ndị na-adịghịkwa anọ ya n’oge ka ukwuu n’ụbọchị; ndị ọzọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, ndị nọ n’oge uto na United States na-anọ nanị ha ruo ihe dị ka awa 3.5 kwa ụbọchị, oge ha na ndị mụrụ ha na-ejikwa anọkọ kwa izu ji awa 11 dị ala ma a tụnyere ya n’oge ndị na-eto eto na ndị mụrụ ha ji anọkọ n’afọ ndị 1960. N’ezie, ndị na-eto eto ụfọdụ adịtụghị eso ndị mụrụ ha anọkọ ma ọ bụ enweta nkwado mmetụta uche ha.
Ihe Ndị Mụrụ Ụmụ Pụrụ Ime
N’ihi “agụụ ihe ime mmụọ” na-agụ ndị na-eto eto, ruo ókè hà aṅaa ka ọrụ ndị mụrụ ụmụ dịruru ná mkpa? Ndị nne na nna maara
ihe na-aghọta na n’otu akụkụ, ntụrụndụ dị mma dị ụmụ ha mkpa nakwa na n’akụkụ nke ọzọ, nkwado a na-enye mgbe nile dị ha mkpa. N’ịbụ ndị ịhụnanya ha nwere kwaliri igosi mmasị, ndị mụrụ ụmụ pụrụ iso ụmụ ha kwurịta banyere egwú, ihe omume telivishọn, vidio, akwụkwọ ọgụgụ, egwuregwu vidio, na ihe nkiri sịnịma ndị na-amasị ha. Ọ bụ ezie na agụụ ịhụnanya na nduzi e nyere n’ihụnanya nke ndị mụrụ ha na-agụsi ọtụtụ ndị na-eto eto ike, o nwere ike ha agaghị ekwupụta ya. Azịza ndị doro anya dị ha mkpa n’ihi na ha bi n’ụwa jupụtara n’ihe mgbagwoju anya. Ndị okenye kwesịrị ịghọta na ụmụaka na-eche nnọọ ọtụtụ ihe ndị dị mgbagwoju anya ihu karịa ka ha onwe ha mere mgbe ha bụ ndị ntorobịa.Ndị nne na nna bụ́ ndị chọrọ ichebe ụmụ ha ga-eso ha na-ekwurịta okwu mgbe nile, na-ege ha ntị nke ọma ma na-adọ ha aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ndị dị n’àgwà nke oge a. Mgbe ndị mụrụ ụmụ tinyere iwu ndị a na-agaghị agbagha agbagha ma bụrụ ndị na-akwụ n’otu ihe, nweekwa ezi uche ma na-egosi ụmụ ha mmetụta ịhụnanya, ọ ga-arụpụtara ha ezi ihe.—Matiu 5:37.
Ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-agba mbọ iso ụmụ ha na-enwe nkwurịta okwu mgbe nile, na-eji Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible na vidio na-eme ihe. * Ha na-eji oge ndị dị otú ahụ eme ihe ọ bụghị iji baara ụmụ ha mba, kama iji tụlee ihe ndị na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ. Ná nnọkọ ndị a nke ezinụlọ, ha na-ege ntị ná nsogbu ma ọ bụ n’ihe ịma aka ndị na-emetụta nke ọ bụla n’ime ụmụ ha ka ụmụ ahụ wee nwee ike ịbụ ndị e lebaara anya n’otu n’otu.
Ndị na-eto eto bụ́ ndị na-adịghị enweta nduzi ime mmụọ site n’aka ndị mụrụ ha pụrụ inweta agbamume site n’Abụ Ọma 27:10, bụ́ nke na-ekwu, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” Olee otú Jehova, Nna nke obi ebere nile, si enyere ndị na-eto eto aka? Ọgbakọ Ndịàmà Jehova abụrụwo ebe mgbaba, ebe ọtụtụ mmadụ hụworo ịhụnanya nke ndị ọzọ n’ọrụ ma kwụsị inwe obi abụọ. Josías, bụ́ nwa okorobịa chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu, kwuru, sị: “Nzukọ Jehova na-arụ ọrụ dị mkpa. Echere m na ndụ enweghị isi. Ebiri m ndụ n’enweghị nzube, n’enweghị olileanya. Ịmara na ọ dị ndị mụ na ha so gbanwere ndụ m kpam kpam. Enwere m mmetụta na ụmụnna nọ n’ọgbakọ nọchiri anya ezinụlọ m na-enwekwaghị. Ndị okenye na ezinụlọ ndị nọ n’ọgbakọ yiri arịlịka n’ụzọ mmetụta uche.”
N’ezie, ọtụtụ ndị ntorobịa na ndị okenye emewo ka ahụ ike nke uche na nke ime mmụọ ha dịkwuo mma site n’ijechi nzukọ ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova anya. Ọkà mmụta mmalite mmadụ bụ́ Patricia Fortuny kwuru banyere mmetụta a dị mma n’edemede ya bụ́ Los Testigos de Jehová: una alternativa religiosa para enfrentar el fin del milenio (Ndịàmà Jehova: Okpukpe A Pụrụ Ịhọrọ Maka Ọgwụgwụ nke Narị Afọ Iri Ahụ), sị: “Ndịàmà Jehova nwere usoro ndokwa doro anya maka ibi ndụ kwa ụbọchị, ụkpụrụ na-arụ ọrụ kpọmkwem dị ka ihe nduzi maka iche echiche na ime omume.” “Usoro ndokwa” na “ụkpụrụ” e zoro aka na ha ebe a dabeere na Bible. N’ihi ya, ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova na-enwe otu nsogbu na nrụgide ndị ahụ ndị agbata obi ha na-enwe, amamihe pụrụ iche nke akwụkwọ ochie ahụ na-ewusi ha ike. Ee, Ndịàmà na-ewere ozizi na ụkpụrụ ndị doro anya dị na Bible dị ka ebe mgbaba.
Mgbe ‘Ọnwụ Na-agaghị Adịkwa Ọzọ’
Ihe a na-ezi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova na-emesi ike ugboro ugboro nkwa Chineke kwere maka ụwa ọhụrụ nke ga-amalite n’oge na-adịghị anya, bụ́ ebe ‘ezi omume ga-ebi n’ime ya’ nakwa ebe ‘ọ na-adịghị onye ga-eme ka ha maa jijiji.’ (2 Pita 3:13; Maịka 4:4) Ọzọkwa, Aịsaịa onye amụma dere na mgbe ahụ Chineke “[ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” Ọnwụ dakwasịrị agbụrụ mmadụ dị ka ihe si ná mmehie mmadụ mbụ, bụ́ Adam, pụta, ma nkwa Chineke bụ na n’oge na-adịghị anya “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Aịsaịa 25:8; Mkpughe 21:3, 4; Ndị Rom 5:12.
Ọ bụrụ na ị bụ onye ntorobịa chọrọ enyemaka, anyị na-akpọ gị òkù ka i nweta olileanya na nzube ná ndụ, site na Bible. Site n’enyemaka nke Ndịàmà Jehova, ị pụrụ inwe olileanya na oge kasị mma ka ga-abịa n’ọdịnihu n’ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc. mepụtara Vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Ọ ka dịgodị n’asụsụ Bekee ugbu a, na-emekwa ka ndị na-eto eto nweta enyemaka dị irè.
[Foto dị na peeji nke 9]
Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iwepụta oge iji gee ụmụ ha ntị n’ezie ma ghọta nsogbu ha
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
“Ndịàmà Jehova nwere usoro ndokwa doro anya maka ibi ndụ kwa ụbọchị”