Mụmụọ Ọnụ Ọchị—Ọ Baara Gị Uru!
Mụmụọ Ọnụ Ọchị—Ọ Baara Gị Uru!
Site N’aka Onye Nta Akụkọ Teta! Na Japan
MGBE o si n’obi, ọ na-ewepụ obi abụọ. Ọ na-eme ka a kwụsị ajọ mbunobi e nweworo eri ọtụtụ afọ. Ọ na-eme ka ndị na-adịghị atụkwasị mmadụ obi gbanwee. Ọ na-ewetara ọtụtụ mmadụ ahụ efe na ọṅụ. Ọ na-ekwupụta, sị, “Aghọtala m. Enyela onwe gị nsogbu.” Ọ na-ezipụ ozi bụ́ “Echere m na anyị pụrụ ịbụ enyi.” Gịnịkwa bụ ihe a na-akpa ike? Ọ bụ ịmụmụ ọnụ ọchị. Ọ pụrụ ịbụ ịmụmụ ọnụ ọchị GỊ.
Gịnị bụ ịmụmụ ọnụ ọchị? A na-akọwakarị ịmụmụ ọnụ ọchị n’akwụkwọ ọkọwa okwu dị ka ‘ọdịdị ihu nke na-eme ka akụkụ ọnụ gbalitetụ elu, na-egosi obi ụtọ, nkwenye, ma ọ bụ ọṅụ.’ Nke a bụ isi ihe na-akpata ịmụmụ ezi ọnụ ọchị. Ịmụmụ ọnụ ọchị bụ ụzọ isi gosipụta mmetụta mmadụ nwere ma ọ bụ mmadụ ime ka ndị ọzọ mara mmetụta uche ya n’ekwughị okwu. Otú ọ dị, ịmụmụ ọnụ ọchị pụkwara igosipụta ikwa emo, ma ka a hapụgodị nke ahụ.
Ịmụmụ ọnụ ọchị ọ̀ na-agbanwe ihe? Ì chetara mgbe ọnụ ọchị mmadụ mụmụrụ mere ka i nwee ahụ efe ma ọ bụ ahụ iru ala? Ma ọ bụ mgbe amụmụghị ọnụ ọchị mere ka ahụ ghara iru gị ala ma ọ bụ ọbụna mee ka i yie onye a jụrụ ajụ? Ee, ịmụmụ ọnụ ọchị na-agbanwe ihe. Ọ na-emetụta ma onye na-amụmụ ọnụ ọchị ma onye a mụmụụrụ ya. Otu onye a kpọtụrụ aha na Bible bụ́ Job kwuru banyere ndị iro ya, sị: “M mụmụọrọ ha ọnụ ọchị—ha adịghị ekwere—ha adịghị emekwa ka ìhè ihu m daa.” (Job 29:24, NW) “Ìhè” nke ihu Job pụworo igosi na o nwere obi ụtọ ma ọ bụ ihu ọchị.
A nọgidewo na-enweta mmetụta dị mma site n’ịmụmụ ọnụ ọchị ruo taa. Ịmụmụ ezi ọnụ ọchị pụrụ inye aka n’ịkwụsị oké ahụ erughị ala. Ọ pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ebe uzu ọkụ si apụ n’ite e siwere n’ọkụ. Mgbe anyị nwere ahụ erughị ala ma ọ bụ nkụda mmụọ, ịmụmụ ọnụ ọchị pụrụ inye aka kwụsị ahụ erughị ala ahụ ma mee ka anyị nagide nkụda mmụọ. Dị ka ihe atụ, Tomoko na-ahụkarị ka ndị ọzọ na-ele ya anya. O weere ya na ha na-ele ihe na-adịghị mma n’ahụ ya, n’ihi na ha na-ewepụ anya ha ngwa ngwa anya ya na ha kụkọtara. Tomoko nwere owu ọmụma ma bụrụ onye na-enweghị obi ụtọ. Otu ụbọchị otu enyi ya tụọrọ ya aro ka ọ na-amụmụrụ ndị mmadụ ọnụ ọchị mgbe anya ya na ha kụkọtara. Tomoko nwalere ya izu abụọ, o jukwara ya anya na mmadụ nile mụmụkwaara ya ọnụ ọchị! Ahụ erughị ala ya kwụsịrị. “Ndụ aghọwo
n’ezie ihe na-enye ọṅụ,” ka o kwuru. Ee, ịmụmụ ọnụ ọchị na-emekwu ka ahụ ruo anyị ala mgbe anyị na ndị ọzọ nọ ma na-enyere anyị aka inwekwu omume enyi.Mmetụta Dị Mma Ọ Na-enwe n’Ebe Gị na Ndị Ọzọ Nọ
Ịmụmụ ọnụ ọchị pụrụ imetụta uche mmadụ. Ọ na-enye aka eme ka mmadụ nwee ọnọdụ uche dị mma. Ọ dịkwa mma maka ahụ ike. A na-ekwu na “Ọchị bụ ezigbo ọgwụ.” N’ezie, ndị ọru ahụ ike na-ekwu na ọnọdụ uche mmadụ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ọnọdụ ahụ ike ya. Ọtụtụ nchọpụta e mere na-egosi na inwe nchekasị, enweghị obi ụtọ, na inwe ihe ndị yiri ha ruo ogologo oge na-eme ka usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ ghara ịdị irè. N’aka nke ọzọ, ịmụmụ ọnụ ọchị na-eme ka anyị nwee obi ụtọ, ịchị ọchị na-eme ọbụna ka usoro ahụ anyị ji alụso ọrịa ọgụ dịkwuo irè.
Ịmụmụ ọnụ ọchị na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ ndị ọzọ. Cheedị banyere ebe a na-enye gị ndụmọdụ. Olee otú ọ ga-amasị gị ka ihu onye ahụ na-enye gị ndụmọdụ dịrị? Ihu gbarụrụ agbarụ pụrụ igosi iwe, enweghị mmasị, ma ọ bụ ọbụna ibu iro. N’aka nke ọzọ, ọ̀ bụ na ihu ọchị nke onye ahụ na-enye ndụmọdụ apụghị ime ka i nwekwuo ahụ iru ala wee si otú a mee ka ị ṅaa ntị na ndụmọdụ ahụ karị? N’ezie, ịmụmụ ọnụ ọchị na-enye aka ebelata nghọtahie mgbe ihe siri ike nghọta mere.
Echiche Ziri Ezi Na-eme Ka Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Dịkwuo Mfe
N’ezie, ọtụtụ n’ime anyị adịghị ka ndị ime ihe na-atọ ọchị bụ aka ọrụ ha, ndị pụrụ ịmụmụ ọnụ ọchị na mberede n’oge ọ bụla; anyị achọghịkwa ịdị otú ahụ. Anyị chọrọ ka ịmụmụ ọnụ ọchị anyị bụrụ nke ezigbo ya. Onye na-akụzi ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’ụlọ akwụkwọ kwuru, sị: ‘Ọ dị mkpa ime ka ahụ ruo gị ala ma jiri obi gị nile mụmụọ ọnụ ọchị, ma ọ bụghị ya, ịmụmụ ọnụ ọchị gị pụrụ ịdị ka o sighị gị n’obi.’ Olee otú anyị pụrụ isi jiri obi anyị nile mụmụọ ọnụ ọchị? Bible pụrụ inyere anyị aka na nke a. Banyere okwu ọnụ anyị ọ na-agwa anyị na Matiu 12:34, 35, sị: “Ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu. Ezi mmadụ na-esi n’ezi akụ̀ ya atụpụta ezi ihe: ajọ mmadụ na-esikwa n’ajọ akụ̀ ya atụpụta ajọ ihe.”
Cheta, ịmụmụ ọnụ ọchị bụ ụzọ anyị na-esi eme ka ndị ọzọ mara echiche anyị n’ekwughị okwu. N’iburu n’uche na anyị na-ekwu okwu “site n’ihe nke obi nwebigara ókè” nakwa na “ezi ihe” na-esi “n’ezi akụ̀” apụta, o doro anya na isi ihe na-akpata ịmụmụ ezi ọnụ ọchị dabeere n’echiche na mmetụta uche anyị. Ee, obi abụọ adịghị ya na otu ụbọchị anyị ga-egosipụta ihe dị anyị n’obi, ọ bụghị nanị site n’okwu na n’omume anyị kamakwa site n’ọdịdị ihu anyị. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịnọgide
na-eme ihe iji na-eche ihe ziri ezi. Ihe ndị anyị na-eche banyere ndị ọzọ na-emetụta ọdịdị ihu anyị n’ụzọ dị ukwuu. Ya mere ka anyị na-elekwasị anya n’àgwà ọma nke ndị òtù ezinụlọ anyị, ndị agbata obi, na ezi ndị enyi anyị. Ọ ga-adịrị anyị mfe karị ịmụmụrụ ha ọnụ ọchị. Ọ ga-abụ ezigbo ịmụmụ ọnụ ọchị, n’ihi na nke ahụ ga-esite n’obi jupụtara n’ịdị mma, ebere, na obiọma. Anya anyị ga-egosi na obi dị anyị ụtọ, ndị ọzọ ga-amakwa na o si anyị n’obi.Otú ọ dị, a ghaghị ịmara na n’ihi otú e si zụlite ụfọdụ ndị ma ọ bụ n’ihi gburugburu ebe obibi ha, ọ na-esiri ndị ụfọdụ ike ịmụmụ ọnụ ọchị karịa ndị ọzọ. Ọ bụrụgodị na ha hụrụ nnọọ ndị agbata obi ha n’anya, ọ maghị ha ahụ ịmụmụrụ ha ọnụ ọchị. Dị ka ihe atụ, a na-atụkarị anya ka ndị ikom Japan na-enwe ntụsara ahụ ma na-agba nkịtị mgbe nile. N’ihi ya, ọ maghị ọtụtụ n’ime ha ahụ ịmụmụrụ ndị ha weere dị ka ndị ha na-amabughị ọnụ ọchị. Ọ pụkwara ịdị otú ahụ n’ebe ndị si mba ndị ọzọ nọ. Ma ọ bụ ndị ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị na-eme ihere site n’ọmụmụ, o nwekwara ike ọ gaghị adịrị ha mfe ịmụmụrụ ndị ọzọ ọnụ ọchị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịma ndị ọzọ ikpe n’ihi otú ha si amụmụ ọnụ ọchị ma ọ bụ ugboro ole ha na-amụmụ ọnụ ọchị. Ndị mmadụ abụghị otu, otú ahụ kwa ka ọ dị àgwà ha na ụzọ ha si eso ndị ọzọ ekwurịta okwu.
Ka o sina dị, ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịmụmụrụ ndị ọzọ ọnụ ọchị, gịnị ma i mee ihe banyere ya? Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma . . . Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.” (Ndị Galetia 6:9, 10) Otu n’ime ụzọ isi rụọ “ezi ihe” n’ebe ndị ọzọ nọ bụ ịmụmụrụ ha ọnụ ọchị—ị ga-emelikwa nke a! Ya mere bute ụzọ n’ikele ndị ọzọ na iji ihu ọchị na-agwa ha okwu agbamume. A ga-enwe obi ekele dị ukwuu maka ya. Ọzọkwa, ị ga-achọpụta na ịmụmụ ọnụ ọchị na-adịkwu mfe ka ị na-azụlite ya ịbụ àgwà gị.
[Igbe dị na peeji nke 12]
Okwu Ịdọ Aka ná Ntị
Ọ bụ eziokwu dị mwute na ọ bụghị ịmụmụ ọnụ ọchị nile anyị na-ahụ bụ nke ezigbo ya. Ndị wayo, ndị nghọrị, ndị na-ere ahịa dị arụrụala, na ndị ọzọ pụrụ ịmụmụ ọnụ ọchị na-adọrọ mmasị. Ha maara na ịmụmụ ọnụ ọchị pụrụ ime ka ike gwụ ndị mmadụ ma mee ka e nweta ha na mberede. Ndị omume ha na-edoghị anya ma ọ bụ ndị nwere nzube ọjọọ pụkwara ịmụmụ ọnụ ọchị na-adọrọ mmasị. Ma, ịmụmụ ọnụ ọchị ha abụghị nke ezigbo ya; ha bụ nke aghụghọ. (Eklisiastis 7:6) Ya mere ọ bụ ezie na anyị agaghị enyokarị ndị ọzọ enyo, ọ dị anyị mkpa ịghọta na ebe ọ bụ na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ,” bụ́ nke dị oké egwu, ọ dị anyị mkpa ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru,” dị ka Jisọs n’onwe ya tụrụ aro ya.—2 Timoti 3:1; Matiu 10:16.
[Foto dị na peeji nke 13]
Na-ebute ụzọ n’iji ịmụmụ ọnụ ọchị ekele ndị ọzọ