Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Oké Ifufe Kwụsịrị—Ọrụ Enyemaka na France

Mgbe Oké Ifufe Kwụsịrị—Ọrụ Enyemaka na France

Mgbe Oké Ifufe Kwụsịrị—Ọrụ Enyemaka na France

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA FRANCE

FRANÇOISE meghere ọnụ ụzọ ịga weta nkụ maka ekwú ọkụ. “Ihe m hụrụ juru m anya,” ka ọ na-echeta. “Mmiri etoruwo n’ọnụ ọnụ ụzọ, nnukwu mmiri si n’ọnụ ụzọ ogige ahụ sọrọ na-abịa.” Di ya, bụ́ Thierry, si na mmiri ahụ ruru ya n’olu gaa bute ubube n’ebe ndọba ụgbọala. Ezinụlọ ahụ rịgooro n’okpukpu uko ụlọ ahụ, bụ́ ebe o bepuru oghere n’elu ụlọ ahụ. Ka mmiri desịrịla ha ahụ, egwu ana-atụkwa ha, di na nwunye ahụ na ụmụ ha atọ cheere ruo ogologo awa anọ ka e wee napụta ha. N’ikpeazụ, ndị uwe ojii France ji helikọpta hụrụ ha ma buru ha gaa ebe na-adịghị ize ndụ.

Ka oké mmiri ozuzo mesịrị ka osimiri dịgasị iche too, ha bịara jubiga ókè, mebie ihe mgbochi mmiri na àkwà mmiri. Nnukwu idei mmiri, nke na-akarị mita iri n’omimi mgbe ụfọdụ, bibiri ihe ọ bụla o zutere. Oké ifufe ahụ gburu ihe karịrị mmadụ 30—ndị tọrọ n’ụgbọala ha ma ọ bụkwanụ ndị mmiri riri ka ha nọ n’ụra. Otu onye a napụtara jiri abalị November ahụ dị egwu tụnyere “ọgwụgwụ oge.” A kpọrọ ógbè nile nke ebe ndịda ọdịda anyanwụ France—obodo na obodo nta 329—ógbè ndị e nwere ọdachi na ha.

Nke Ka Njọ Ka Ga-eme

Ebe ndịda ọdịda anyanwụ ka na-enweta onwe ya n’ọdachi ahụ mgbe ọdachi dakwasịrị ya ọzọ. Oké mbelata nke ikuku n’elu Oké Osimiri Atlantic kpatara oké ifufe. Oké ifufe nke mbụ bibiiri ihe gafere ebe ugwu France na December 26, 1999, nke abụọ bibikwara ebe ndịda n’abalị echi ya. Ihe ndekọ gosiri na ifufe ahụ na-efe ihe karịrị kilomita 200 n’otu awa. Dị ka akwụkwọ ndekọ gọọmenti gosiri, France enwebeghị oké ifufe dị otú ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ kemgbe narị afọ nke 17.

Hélène dị ime ọwa asatọ mgbe oké ifufe ahụ fere. “Atụrụ m egwu nke ukwuu,” ka ọ na-echeta. “Di m gbaara ọgba tum tum ya na-alọta, ahụkwara m alaka osisi ka ha na-efegharị n’ebe nile n’èzí. Echere m na ọ gaghị ahụ nwa ya. Di m alọbatachabeghị mgbe mmiri malitere ito n’ime ụlọ anyị. Anyị siri na windo mapụ.”

Na France, ọ dịkarịa ala mmadụ 90 nwụrụ. Mmiri riri ha ma ọ bụkwanụ ihe ndị e ji mee elu ụlọ, mpio anwụrụ ọkụ, ma ọ bụ osisi na-ada ada kụgburu ha. Ọtụtụ narị ndị ọzọ merụrụ ezigbo ahụ, gụnyere ọtụtụ ndị nkịtị na ndị agha na-anapụta ndị mmadụ. Oké ifufe ahụ metụtakwara mba ndị agbata obi ha, na-egbu ihe karịrị mmadụ 40 na Britain, Germany, Spain, na Switzerland.

Mgbe Ọ Kwụsịrị

N’ime ógbè 96 ndị bụ́ isi nke France, gọọmenti kpọrọ 69 n’ime ha “ógbè ndị e nwere ọdachi na-emere onwe ya na ha.” E mere atụmatụ na ọnụ ahịa ihe ndị mebirinụ dị ihe dị ka ijeri francs 70 (ijeri dollar 11). Mbibi ahụ mere n’obodo, n’obodo nta, na n’ọdụ ụgbọ mmiri ụfọdụ, chetaara ndị hụrụ ha ebe a na-alụ agha. Osisi ma ọ bụ poolu eletrik dachiri okporo ụzọ na ụzọ ụgbọ okporo ígwè. Elu ụlọ dapụsịrị, ígwè crane dara, ụgbọ epepe dapụtasịrị n’elu ala. Ọtụtụ puku ndị ọrụ ha bụ ilekọta ubi enwekwaghị ihe ha ji ebi ndụ, n’ihi na ubi mkpụrụ osisi na ụlọ ebe ndị a na-azụ ihe ọkụkụ lara n’iyi.

N’ime nanị awa ole na ole, ifufe ahụ bibiri oké ọhịa na ogige ntụrụndụ France, na-ebibi oké ọhịa dị ọtụtụ narị puku hekta. Dị ka Ọfis Na-ahụ Maka Oké Ọhịa Mba France si kwuo, e bibiri ihe dị ka nde osisi 300. Nnukwu osisi ndị nọworo ọtụtụ narị afọ bụụrụ site n’úkwù ha ma ọ bụ gbajie dị ka mkpá ọkụ. Ifufe ahụ bibiri akụkụ buru ibu nke oké ọhịa Aquitaine na Lorraine.

“N’ụbọchị sochiri ụbọchị oké ifufe ahụ kwụsịrị, abanyere m n’ọhịa,” ka Bernard, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke na-arụ ọrụ dị ka onye na-elekọta osisi, kwuru. “O juru m anya. Ọ bụrụ na ị hụ ya, ọ ghaghị imetụ gị n’ahụ! Pasent 80 nke ndị ọgbakọ anyị n’ebe a dabeere n’oké ọhịa ahụ maka inweta ihe ha ji ebi ndụ. Ọ wụrụ ndị mmadụ akpata oyi nke ukwuu, karịsịa ndị agadi.” N’ogige Obí Eze Versailles, osisi 10,000 dara. “Narị afọ abụọ ga-agafe tupu ogige ahụ adịghachi otú ọ dịbu,” ka otu n’ime ndị isi na-elekọta ogige ahụ kwara n’arịrị.

Ka poolu eletrik ndị ahụ dara, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ isii nke ndị bi na France nọrọ n’ọchịchịrị. N’agbanyeghị mgbalị ndị siri ike nke ụlọ ọrụ ndị na-ejere ọha ozi mere, ọtụtụ iri puku ndị mmadụ ka nọgidere n’enweghị ọkụ eletrik ma ọ bụ telifon ruo izu abụọ mgbe oké ifufe ahụ kwụsịrị. Obodo nta ụfọdụ amakwaghị ihe na-eme ebe ọzọ. Ọ dị ezinụlọ ndị na-aghaghị isere mmiri n’olulu mmiri ma mụọ kandụl ka a ga-asị na ha nọ n’otu narị afọ gara aga kama ịbụ ná mmalite nke narị afọ nke 21.

Oké ifufe ahụ metụtara ụlọ ọha na eze, ụlọ ukwu, ma ọ bụ katidral. Ọtụtụ ụlọ okpukpe, gụnyere Ụlọ Nzukọ Alaeze 15 nke Ndịàmà Jehova, mebikwara. N’ebe ụfọdụ e ji kandụl ma ọ bụ oriọna mee ihe ná nzukọ.

Oké ifufe ahụ bibiri ihe onwunwe nke ihe dị ka ezinụlọ 2,000 nke Ndịàmà Jehova, ndị gụnyere site n’osisi ndị dara ada ma ọ bụ ihe ndị e ji mee elu ụlọ bụ́ ndị dapụrụ adapụ ruo n’ụlọ ndị e bibiri kpam kpam mgbe osimiri jubigara ókè. Ọtụtụ Ndịàmà merụrụ ahụ. Ọ dị mwute na n’ógbè Charente, mmiri riri otu Onyeàmà dị afọ 77 ka nwunye ya na-apụghị ime ihe ọ bụla na-ele ya. Ndị ọzọ jiri anya ha hụ ọnwụ. Gilbert, dị afọ 70, na-echeta, sị: “Ọ tụrụ m n’anya na anwụghị m. Ibo ọnụ ụzọ meghere, mmiri sọbatakwara nnọọ n’ike. Achọtara m onwe m ozugbo n’ime mmiri dị otu mita na ọkara n’omimi. Alanarịrị m site n’ijide aka n’ebe nkowe ákwà m.”

Inye Nkwado Dị Mkpa

Oké ifufe ahụ kpalitere nkwado dị ukwuu na France nakwa na Europe dum. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Midi libre na-ekwu, sị: “E nwere mgbe ọrụ ebere na-afọdụ nke nta ka ọ bụrụ ibu ọrụ, ma a rụrụ ya site n’afọ ofufo, n’ihi ọbụbụenyi, ma ọ bụ n’ihi akọ na uche.”

Ozugbo oké ifufe ahụ kwụsịrị, e hiwere kọmitii nnapụta nke Ndịàmà Jehova iji nyere ndị nọ n’ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ nakwa ndị ọzọ ọdachi ahụ metụtara aka. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè, bụ́ nke e hiwere maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, haziri ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo. Mgbe oké ifufe ahụ nke fere na November n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ kwụsịrị, Ndịàmà 3,000 keere òkè n’ọrụ nnapụta nakwa nzacha na mkpocha ahụ, na-enyere ndị mmadụ aka ikupụ apịtị na mmiri juru n’ime ụlọ ha. Ndịàmà so ná ndị ọrụ afọ ofufo mbụ rutere n’obodo nta ụfọdụ. Ndịàmà ahụ zachara ma kpochaa ụlọ ọha na eze dị iche iche, dị ka ụlọ akwụkwọ, post ọfịs, ụlọ ezumezu obodo, ebe obibi ndị agadi, na ọbụna ebe ili ozu. N’ọtụtụ ebe, ha sooro òtù enyemaka dị iche iche rụkọọ ọrụ.

E nyeere mmadụ nile aka, n’agbanyeghị nkwenkwe okpukpe ha. “Anyị nyeere ụkọchukwu obodo nta ahụ aka. Anyị zachara ma kpochaa okpukpu ime ala nke ụlọ ya,” ka otu Onyeàmà kwuru. N’ihe banyere ndị ọzọ Ndịàmà nyeere aka, o kwukwara, sị: “Ndị mmadụ lere anyị anya dị ka a ga-asị na anyị si n’eluigwe bịa iji nyere ha aka.” Otu onye ọrụ gọọmenti kwuru, sị: “Ị pụrụ ile nke a anya dị ka ụzọ ha si eme ihe Oziọma ahụ kwuru nakwa inyere ndị agbata obi ha aka. Echere m na ndị ahụ bịaranụ na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Oziọma ahụ na n’okpukpe ha.” Otu Onyeàmà na-arụ ọrụ afọ ofufo, kwuru, sị: “Obi gị na-akwali gị ịbịa nye aka n’ụzọ dị otú a. Ọ bụ n’ezie ihe obi ụtọ inwe ike imere ndị agbata obi anyị ihe.”

Mgbe oké ifufe ahụ nke fere ugboro abụọ na December kwụsịrị, ọtụtụ ezinụlọ bụ́ Ndịàmà esokwaghị ụmụnna ha ndị Kraịst na-akpakọrịta ruo ọtụtụ ụbọchị. Site ná nduzi nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị okenye ọgbakọ, a haziri ihe enyemaka. Okporo ụzọ ndị ihe dachiri na fon ndị kwụsịworo ịrụ ọrụ mere ka ọ ghara ikwe omume irute ndị enyi bi nanị kilomita ole na ole site n’ebe ahụ. Iji nyere ndị òtù ọgbakọ ha bi n’ebe dịpụrụ adịpụ aka, Ndịàmà ụfọdụ jiri ụkwụ ma ọ bụ ịnyịnya ígwè gafee oké ọhịa ndị e bibiri ebibi n’agbanyeghị ihe ize ndụ nke osisi ndị pụrụ ịda. Ndị ọrụ afọ ofufo rụsikwara ọrụ ike ọzọ n’ịzacha na ikpocha ụlọ akwụkwọ, ọ́bá akwụkwọ, ebe ndị a na-eme ntụrụndụ n’èzí nakwa ụlọ ndị agbata obi ha, bupụkwa ihe ndị dachiri ụzọ ọhịa.

Ịtụ “Ndò nke Ịhụnanya”

Ọdachi ahụ kpataara ndị ọ dakwasịrị, karịsịa obere ụmụaka na ndị agadi, mkpasasị uche. Ndị ụlọ ha mebiri ma ọ bụ ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ga-achọ ọtụtụ oge na nkwado siri ike nke ezinụlọ na ndị enyi ha iji maliteghachi ndụ. Mgbe idei mmiri ahụ kwụsịrị n’ógbè Aude, Dr. Gabriel Cottin, so na kọmitii na-ahụ maka mkpasasị uche chọrọ ime ihe ngwa ngwa, kwuru, sị: “Nkwado ọ bụla nke ndị ha na onye ọdachi metụtara nọ n’otu okpukpe nyere na-enyekwa aka nke ukwuu.”

Ndịàmà Jehova na-ele inye nkwado dị otú ahụ anya dị ka ibu ọrụ kwesịrị ekwesị nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro. “Ka nkewa . . . ghara ịdị n’ahụ [òtù ezi ndị Kraịst],” ka Pọl onyeozi kwuru. “Ka ihe dị n’ahụ wee na-echegbu onwe ha nye ibe ha n’otu ụzọ ahụ. Ọ bụrụkwa na otu ihe nke dị n’ahụ na-ahụ ahụhụ, ihe nile dị n’ahụ ahụ soro ya na-ahụkọ ahụhụ.”—1 Ndị Kọrint 12:25, 26.

“Ọtụtụ awa mgbe oké ifufe ahụ kwụsịrị, ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị Kraịst bịara n’ụlọ anyị iji nye aka debe ihe nile ọcha,” ka Hélène, a kpọtụrụ aha ná mmalite, bụ́ onye mụworo nwa nwanyị ji ahụ, na-ekwu. “Ọbụna Ndịàmà oké ifufe ahụ metụtara bịara nyere anyị aka. Enyemaka ahụ magburu nnọọ onwe ya—ọ bụ n’afọ ofufo, sitekwa n’obi!”

Odette, bụ́ onye idei mmiri ahụ mebiri ụlọ ya, kwuru banyere Ndịàmà ibe ya, sị: “Ha gbara m ume nke ukwuu. Amaghị m otú m ga-esi kwupụta otú obi dị m. Ihe nile e meere m metụrụ m nnọọ n’ahụ.” Onye ọzọ chịkọtara mmetụta nke ọtụtụ ndị nwere site n’ikwupụta obi ekele ya, sị: “N’ezie anyị nọ n’okpuru ndò nke ịhụnanya!”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20, 21]

“MMIRI OJII”

N’etiti ọnwa December, ntakịrị oge tupu e nwee oké ifufe ahụ, nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ bụ́ Erika mikpuru ná nnukwu osimiri n’ebe dị ihe dị ka kilomita 50 site n’ụsọ oké osimiri ọdịda anyanwụ France, na-akwanye mmanụ dị tọn 10,000 n’ime mmiri ahụ. E metọrọ ikperé mmiri dị ihe dị ka kilomita 400 site na Brittany ruo Vendée. Oké ifufe ahụ mekwuru ka mbibi e bibiri njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha ka njọ site n’ifesasị mmanụ ahụ kpụkọtara akpụkọta, na-eme ka mmetọ ahụ gbasaa, meekwa ọbụna ka o sikwuo ike ikupụ ya. Ọtụtụ puku ndị ọrụ afọ ofufo, ma nwata ma okenye, si n’akụkụ nile nke France bịa iji nye aka kupụ mmanụ a na-anya anya n’elu nkume na ájá.

Ọdachi ahụ akpatawo ajọ mmetọ nke ihe ndị dị n’oké osimiri. O metụtara ụlọ ọrụ ndị na-egbu oyster na oporo nke ukwuu. Dị ka ndị ọkà mmụta banyere nnụnụ si kwuo, ọ dịkarịa ala nnụnụ mmiri 400,000—nnụnụ puffin, nnụnụ grebe, nnụnụ gannet, na karịsịa nnụnụ guillemot—anwụwo. Nke ahụ ji okpukpu iri karịa ọnụ ọgụgụ nnụnụ nwụrụ mgbe okpuru nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ bụ́ Amoco Cadiz chiri n’ala n’ebe dịdewere Brittany na March 1978. Ọtụtụ n’ime nnụnụ ndị ahụ nọ na-achọ nri n’oge oyi n’ikperé mmiri France mgbe ha sisị England, Ireland, na Scotland fefeta. Onyeisi Òtù Na-echebe Nnụnụ na Rochefort, kwuru, sị: “Ọ bụ nkwafu mmanụ kpatara oké ọdachi. Ọ bụ nke kasị nnọọ njọ anyị hụtụworo. . . . Anyị na-atụ egwu na ìgwè nnụnụ ndị a na-adịghị ahụkebe dị n’ebe a ga-ebelata ma ọ bụ ọbụna gharakwa ịdị adị n’ikperé mmiri France.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

© La Marine Nationale, France

[Foto dị na peeji nke 17]

E ji helikọpta napụta ọtụtụ narị mmadụ, dị ka e mere na Cuxac d’Aude ebe a

[Ebe E Si Nweta Foto]

B.I.M.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ụzọ ụgbọ okporo ígwè nke a na-ejighịzi eme ihe gafere n’ime ubi vine e bibiri ebibi

[Ebe E Si Nweta Foto]

B.I.M.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọtụtụ narị obere ụgbọala kpọkasịrị akpọkasị tọgbọgasị n’ebe nile

[Foto dị na peeji nke 18]

Na Villedaigne, nwoke a tọrọ atọ ruo awa asaa

J.-M Colombier

[Foto dị na peeji nke 18, 19]

Osisi “pine” ndị gbajiri ka mkpá ọkụ n’ógbè Creuse

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Chareyton/La Montagne/MAXPPP

[Foto dị na peeji nke 18, 19]

N’ogige Obí Eze Versailles nanị, osisi 10,000 dara

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Charles Platiau/Reuters/MAXPPP

[Foto dị na peeji nke 19]

N’ụtụtụ echi ya, na Saint-Pierre-sur-Dives, Normandy

[Ebe E Si Nweta Foto]

© M. Daniau/AFP

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ìgwè Ndịàmà Jehova na-azacha ma na-ekpocha ebe obibi ndị agadi na La Redorte (n’elu) na ụlọ ezumezu obodo nke Raissac d’Aude (n’aka nri)