Ndụ Ọ̀ Na-abụwanye Ihe A Na-ejighi Akpọrọ Ihe?
Ndụ Ọ̀ Na-abụwanye Ihe A Na-ejighi Akpọrọ Ihe?
“Ọ bụ ụwa ebe a na-ejighị ndụ akpọrọ ihe. A pụrụ ịnara narị pound ole na ole [ego ndị Britain] iji kpata ọnwụ, a dịghịkwa achọ ndị dị njikere ime ya achọ.”—The Scotsman.
N’April 1999, e nwere otu ime ihe ike nke wụrụ ụwa dum akpata oyi, bụ́ mgbe mmadụ abụọ nọ n’oge uto ha wakporo Columbine High School, dị na Littleton, Colorado, U.S.A., ma gbuo mmadụ 15. Nnyocha e mere gosiri na otu n’ime mmadụ abụọ ahụ kpara arụ ahụ nwere ebe ọ na-edebe ihe ọmụma n’Internet bụ́ ebe o dere, sị: “NDỊ NWỤRỤ ANWỤ ADỊGHỊ ARỤ ỤKA!” Ndị ome ihe ike abụọ ahụ nwụrụ n’ọdachi ahụ.
IGBU ọchụ juru ebe nile, ọtụtụ mmadụ na-anwụkwa ọnwụ ike kwa ụbọchị. N’ụwa dụm, ọ bụ na South Africa ka a kasị nwee ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ e gburu egbu, e gburu mmadụ 75 n’ime 100,000 mmadụ ọ bụla bi na ya na 1995. E jighị ndụ kpọrọ ihe karịsịa n’otu mba dị n’Ebe Ndịda America, bụ́ ebe e gburu ihe karịrị mmadụ 6,000 na 1997 n’ihi ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Isite n’aka ndị e goro ego gbuo mmadụ bụ usoro a na-agbasokarị. Otu akụkọ banyere mba ahụ na-ekwu, sị: “N’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ, ọnụ ọgụgụ ụmụaka a na-egbu arịwokwa elu: Na 1996, e gburu ụmụaka 4,322, bụ́ ịrị elu dị pasent 40 nanị n’ime afọ abụọ.” Otú ọ dị, ụmụaka na-aghọzi ndị na-egbu ụmụaka ndị ọzọ na ndị mụrụ ha. Ọ dịghị ihe e ji ndụ kpọrọ n’ezie.
Gịnị Kpatara “Àgwà Agụghị Ọnwụ n’Oké Ihe” A?
Gịnị ka ihe ndị a mere eme na-egosi? Ịba ụba nke enweghị nkwanye ùgwù maka ndụ. Ndị inwe ikike na-agụ agụụ na ndị nwere akpịrị ego na-egbu ndị mmadụ n’enweghị obi amamikpe. Ndị isi azụmahịa ọgwụ ọjọọ na-enye iwu ka e gbuchapụ ndị nile nọ n’otu ezinụlọ. Ha na-eme ka ogbugbu ha na-egbu ndị mmadụ yie ihe na-adịghị njọ site n’iji okwu ndị dị ka “isujasị,” “imemila,” “idula,” ma ọ bụ “iwepụ ndụ” eme ihe banyere onye ha
gburu. Mgbukpọ na mkpocha agbụrụ emewo ka nke a dị njọ karị ma mee ka ndụ bụrụ ihe a na-ejighị akpọrọ ihe. N’ihi ya, igbu mmadụ aghọwo ihe a na-anụ kwa ụbọchị n’ihe omume TV n’ụwa dum.A gụnye ime ihe ike na ọgba aghara ndị a na-egosi na telivishọn na n’ihe nkiri sịnịma dị ka ihe na-adọrọ mmasị, o yikwara ka ọha mmadụ anyị emikpuwo onwe ha n’àgwà jọgburu onwe ya nke agụghị ọnwụ n’oké ihe. N’ihe banyere nke a, Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “N’ọkara ikpeazụ nke narị afọ nke 20, ọ dị ịtụnanya ikwu na ọnwụ abụrụla okwu a kpụ n’ọnụ. Tupu mgbe ahụ, ikekwe ọ dị ịtụnanya ikwu na ọ bụ okwu a na-adịtụghị ewebata mgbe a na-ekwu kpọmkwem ihe ndị metụtara sayensi, e kwukwara ihe dị nnọọ nta banyere ya na nkà ihe ọmụma.” Dị ka Josep Fericgla, onye Catalonia bụ́ prọfesọ na nkà mmụta banyere mmadụ, si kwuo, “ọnwụ bụzi ihe ikpeazụ a na-asọ nnọọ nsọ n’oge anyị, n’ihi ya kwa, ọ bụ otu n’ime ụzọ kasị dị irè isi jiri aghụghọ gbanwee echiche.”
Ikekwe njimara kasị pụta ìhè nke “àgwà agụghị ọnwụ n’oké ihe” a, bụ nkwenkwe ọtụtụ ndị nwere bụ́ na ike, nkarị, ego, na ihe ụtọ dị nnọọ mkpa karịa ndụ mmadụ na ụkpụrụ omume ọma.
Olee otú “àgwà agụghị ọnwụ n’oké ihe” a si agbasa? Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji gbochie ihe ọjọọ a gbara ha gbugburu na nke na-emetụta ụmụ ha? Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu ndị na-esonụ.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ndụ Dịruru ná Mkpa?
▪ “Ndị na-eto eto so n’òtù ndị omempụ [nọ na Mumbai, India] na-achọsi ọrụ ike, ha na-ekwe ka e goo ha igbu mmadụ maka nanị rupee 5,000 [$115].”—Far Eastern Economic Review.
▪ “O Gburu Otu Onye Na-agafe Agafe Jụrụ Inye Ya Siga.”—Isi akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ La Tercera, Santiago, Chile.
▪ “Ọtụtụ mgbe, a na-eji ihe dị ka $7000 egota onye ga-egbu mmadụ na Russia [na 1995] . . . Ọnụ ọgụgụ ndị a na-egbu site n’aka ndị e goro ego arịwo elu nke ukwuu n’ihi nsogbu akụ̀ na ụba e nwere na Russia kemgbe ọchịchị kọmunist dasịrị.”—Reuters, dabeere n’otu akụkọ dị na Moscow News.
▪ “E jidere otu onye na-agba mgbere ala na ụlọ bi na Brooklyn . . . ma bo ya ebubo na ọ kwụbinyere otu onye nọ n’afọ iri na ụma ego n’ime $1,500 ha kwekọrịtara maka igbu nwunye nwoke ahụ bụ́ onye dị ime nakwa nne nwunye ya.”—The New York Times.
▪ ‘Ọnụ ego a na-akwụ maka igbu mmadụ n’England adalatawala. Ọnụ ego a na-akwụ maka igbu mmadụ esiwo na pound 30,000 n’afọ ise gara aga dalataruo ọnụ ego dị mfe ọkwụkwụ nke bụ́ site na pound 5,000 ruo pound 10,000.’—The Guardian.
▪ ‘Òtù ndị omempụ obi tara mmiri nke ógbè Balkan akara òtù Mafia njọ. Nke a bụ ụdị onye omekome ọhụrụ, nke nwere ụkpụrụ nduzi ọhụrụ na ngwá ọgụ ọhụrụ. O nwere bọmbụ na égbè na-awụpụ mgbọ, ọ dịghịkwa egbu oge n’iji ha eme ihe.’—Guardian Weekly.