“Otú o si akọwa ihe na-amasị m”
“Otú o si akọwa ihe na-amasị m”
Nke ahụ bụ ihe otu nwa okorobịa bụ́ osote onyeisi ngalaba achụmnta ego nke si Yucatán, Mexico, kwuru banyere otú magazin Teta! si akọwa ihe. Ọ kọwara n’otu akwụkwọ ozi na ọ bụ otu Onyeàmà ya na ya na-arụkọ ọrụ n’ụlọ ọrụ ịnshọransị mere ka ya malite ịgụ Teta!
O kwuru banyere Teta!, sị: “Ọ bụ nnọọ ezigbo ebe e si enweta ihe ọmụma na eziokwu. Otú o si akọwa ihe na-amasị m, ebe ọ na-adịghị ekwulara òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla, ọ dịghịkwa agụ ụfọdụ mmadụ dị ka ndị bara uru karịa ndị ọzọ. Enwetawo m ngwọta nye nsogbu dị iche iche site n’ịgụ magazin a. Nke a bụ akwụkwọ na-adọrọ mmasị, nke ziri ezi, nke kwesịịrị oge a, na nke nwere ihe ọmụma. Ana m ekele unu site n’obi m nile!”
Afọ ụfọdụ gara aga, Teta! tụlere ihe ịma aka ndị na-abịa site n’ịnagide ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. E mesịrị chịkọta ihe ọmụma ahụ ma bipụta ya na broshuọ a kpọrọ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Eleghị anya, gị ma ọ bụ onye ọzọ ị maara pụrụ inweta nkasi obi site n’ịgụ broshuọ a nwere peji 32. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, bikọ dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 nke magazin a.
□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.